Jọn 1:1-14

Lesson 208 - Junior

Memory Verse
“Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, Ọ we biri n’etiti ayi” (Jọn 1:14).
Notes

Nwa nke Mmadụ

Iheọmụmụ Ekeresimesi anyị bụ banyere Jisọs, onye amụrụ na Betlehem. Anyị amụworị ihe banyere Jisọs dịka Ọkpara nsọ nke Chineke. Iheọmụmụ a na agwa kwa anyị na Jisọs bụ kwa Nwa nke mmadụ. O yikwasịrị anụarụ nke nwere arụ na ọbara dịka i nwere. “Ewe me Ya n’oyiyi nke madu” (Ndi Filipai 2:7). Isiokwu nke iheọmụmụ anyị pụtara na Jisọs yikwasịrị anụarụ dịka mmadụ.

Chineke nwere óké àtụmààtụ banyere nzọpụta nke mmadụ. Otù akụkụ nime àtụmààtụ a bụ ọmụmụ amụrụ Kraist na Betlehem ọtụtụ arọ garaaga. Ndụ Ya bụ ihenlere anya nye anyị isoro. Enyere anyị òzízí Ya isoro.

Okwu nke Chineke

Ọ bụ site ná ndụ, ihenlere anya na òzízí niile nke Kraist ka Chineke gwaworo anyị okwu. “Chineke, mgbe Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n’oge ochie nime ndi-amuma n’iberibe akwukwọ di iche iche, na uzọ di iche iche, Ọ gwara ayi okwu n’ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara” (Ndi Hibru 1:1, 2). Chineke na akọwapụta Onwe ya site n’Ọkpara Ya dịka “Okwu” ahụ. Chineke dọrọ anyị aka ná ntị ịnụ olu Jisọs bụ Ọkpara Ya na Okwu Ya (Matiu 17:5) “Akpọwo kwa aha-Ya Okwu Chineke” (Nkpughe 19:13). Jọn Onyeọwụmmiri sịrị, “Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n’ọhia” (Jọn 1:23). Jọn Onyeọwụmmiri bụ olu ahụ. Ozi ya bụ Jisọs, Okwu nke Chineke.

Atọ-nime-Otù

Siterị ná mmalite nke oge, ọbụná tupu ekèè ụwa (Jọn 17:5), Kraist nọri dịka mmụọ. Kraist na Chineke bụ Nna nọ (I Jọn 1:2). Kraist bụ otù akụkụ nime òzùzù niile nke ihe Chineke bụ, maọbụ Atọ-nime-otù dị Nsọ -- Nna, Ọkpara na Mmụọ Nsọ. Ejikọtara ha atọ nime otù. “Ọ bụ kwa Mọ Nsọ bu Onye nāgba àmà, n’ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu” (ma-ọbụ “Ha di atọ nāgba àmà n’elu-igwe, Nna, Okwu ahu, na Mọ Nsọ: ha atọ ndia bu kwa otù”) (I Jọn 5:7).

N’ihi na Jisọs bụ otù nime atọ ahụ, ejikọtara n’òzùzù niile nke ihe Chineke bụ, Baịbụl na agwa anyị n’iheọmụmụ anyị na “Okwu ahu buru kwa Chineke.” Jisọs bụ Okwu Chineke. Aisaia Onye amụma sịrị na a ga akpọ Jisọs “Chineke Nke bu Dike” (Aisaia 9:6).

Ná Mmalite

N’oge nke òkìkè, ná mmalite (Jenesis 1:1), Jisọs na Chineke nọ. Onye dere Abù Ọma sịrị, “Okwu JEHOVA ka ejiri me elu-igwe” (Abù Ọma 33:6). Anyị na agụ ná Ndi Hibru 1:2 banyere Ọkpara Chineke, “Onye O site-kwa-ra n’aka-Ya me uwa nile.” O mere maọbụ wepụta Eluigwe niile na ụwa niile ka ha dịrị -- e, na ihe niile dị kwa ha nime. “Esitewo n’aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile” (Ndi Kọlọsi 1:16). Chineke kèrè ihe nile site n’Okwu Ya -- Chineke kère ihe niile site na Jisọs (Ndi Efesọs 3:9).

Ndụ na Ìhè

Ọ bụ náánị nime Jisọs ka ndụ dị. O nyere mmadụ niile na ihe niile ndụ ná mmalite, n’oge òkìkè. “N’ihi na n’ebe I nọ ka isi-iyi ndu di” (Abù Ọma 36:9). “Ya onwe-ya nēnye madu nile ndu, na ume, na ihe nile” (Ọlu Ndi-ozi 17:25).

Ka anyị tụgharịa uche ná ndụ anụarụ nke Jisọs na enye. Chineke enyewo ụmụmmadụ ohere ime ihe ukwuu dị icheiche, ma ọ dịbeghị mmadụ ọ bụla nwereike ikè ndụ. Mmadụ aghaghị ibu ụzọ nwee mkpụrụ ahụ -- mkpụrụ dị ike nke ndụ, nke Chineke na enye -- tutu o nwee ike ime ka ndụ ahụ malite itóetó. Eleghịanya ị kụwo mkpụrụ nke tolitere mịa kwa mkpụrụ. Ọ bụghị gị kère ha; i nwere mkpụrụ dị ndụ nke i ji malite. Ọbụná mgbe ịkụsịrị mkpụrụ ahụ, Chineke zitere miriòzùzò na anyanwụ, okpomọkụ na ìhè nke nyeere mkpụrụ ahụ aka ipute na itolite.

Ị mụtawo n’ụlọ akwụkwọ na ihe niile chọrọ ìhè na okpomọkụ ka o wee tolite nke ọma na-adịgide kwa ndụ. Ụfọdụ mgbe ana-eji ìhè na okpomọkụ nke mmadụ mere na akụ ihe -- ìhè na okpomọkụ nke eletrik maọbụ stove -- otú ọ dị ọ bụ Chineke kère ihe niile eji mee ha O wee nye kwa mmadụ amamihe iji mepụta ihe niile ahụ.

Nime Onyenwe anyị, anyị nwere ndụ na ìhè nke anụarụ, nke ma ewezuga ya anyị ga anwụ. Nime Ya, anyị nwekwara ndụ na ìhè nke imemmụọ, nke ewezuga ya anyị ga abụ ndị nwụrụanwụ nime mmụọ. Jisọs sịrị, “Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè” (Jọn 10:10). Ihe Jisọs na ekwu okwu ya bụ ndụ nke imemmụọ, nke ná eweta itóetó na ọganiru nke ndụ anụarụ. Jisọs sịrị “Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agagh-ejeghari n’ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu” (Jọn 8:12). Jisọs sịrị, “Mu onwem abiawo n’uwa ibu ìhè, ka onye ọ bula nke kwere na Mu we ghara inọgide n’ọchichiri” (Jọn 12:46).

Ewezuga Jisọs, ọ dịghị onye pụrụ ịchọta ndụ nke imemmụọ. Mmadụ, nime onwe ya na ebi n’ọchịchịrị ná enweghị kwa ike ọ bụla ịchọta ụzọ nke eziokwu na ịdị nsọ. Jisọs na ekpughere mmadụ niile ọ bụla Onwe ya. Jisọs bụ “Ezi Ìhè ahu, nke nēnye madu ọ bụla nābia nime uwa ihè” (Jọn 1:9). Okwu Chineke -- Jisọs -- ghọrọ anụarụ biri kwa n’etiti anyị ka anyị nwee ike inweta ìhè nke imemmụọ site ná ndụ Ya na òzízí Ya niile. “Okwu-Gi bu oriọna diri ukwun, ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm” (Abù Ọma 119:105). Òzízí niile nke Jisọs na ihe atụ niile nke ndụ Ya bụ mmụwa nke ìhè nye ndụ nke imemmụọ anyị. Ndị niile bụ nke ụwa aghọtaghị, ha amaghị kwa ike dị n’ìhè nke ndụ imemmụọ. Jisọs bịara biri n’ụwa nke a igosi anyị ụzọ nke ndụ ebighịebi na site na Ya aga enwe ike zọpụta anyị.

Otù Onyeozi

Onyenwe anyị ekweworị mkwà izite otù onyeozi nke ga edozi ụzọ nye Kraist (Malakai 3:1). Oge bịakwara mgbe Chineke zitere nwoke ahụ. Ọ dịghị anya amụsịrị ya tutu amụọ Kraist. Onye ozi ahụ bụ Jọn Onyeọwụmmiri, onye kwusara ọbịbịa nke Jisọs. Jọn Onyeọwụmmiri sịrị: “Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso … Dozienu uzọ Onye-nwe-ayị, menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie” (Matiu 3:2). Jọn gbara àmà nye ụwa nọ n’ọchichịrị ka ụmụmmadụ wee nwee ike ikwere na Kraist, wee nwee ìhè.

“Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n’Onye ahu Nke gaje ibia n’azu ya, nke ahu bu, na Jisus” (Ọlu Ndi-ozi 19:4). Jọn abụghị ìhè ahụ, ọ dịghị kwa mgbe o kwuru na ya bụ Ya. Jọn abụghị kwa ìhè ụgha, kama ọ bụ ìhè ntà ná amụwapụta site n’ezi Ìhè ahụ, nke ná atụ kwa Jisọs aka. Ọlụ Jọn bụ idozirị Jisọs ụzọ, Jọn lụkwara ọlụ ahụ n’ịkwesị ntụkwasịobi. Jọn alụghị ọlụ-ebube ọ bụla; ọ gbara àmà banyere ọbịbịa nke Jisọs. Jọn dọrọ ndị ahụ aka ná ntị ka ha ghara ime ndahie wee kpọọ ya Ìhè ahụ. “Mgbe Jọn nāgbazu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abugh Ya. Kama, le, otù onye nābia n’azum, Onye m’nēkwesigh itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya” (Ọlu Ndi-ozi 13:25).

Ezi Ìhè ahụ

Amụrụ Jisọs dịka Nwa ọhụụ nke Betlehem. Ọ bịara biri nime ụwa nke O keworo. N’oge ya ekpughere Jisọs dịka ezi Ìhè ahụ, “Ìhè nke Mba nile … nzọputam rue nsọtu uwa” (Aisaia 49:6). Jisọs na ekpughe Onwe ya ná eme kwa ka ụmụmmadụ mara Ya site n’ụzọ dị icheiche. Onyenwe anyị na agwa ụmụmmadụ okwu site n’ịmamma nke òkìkè Ya. “Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke; ọ bu kwa ọlu aka-ya ka mbara elu-igwe nēgosi” (Abù Ọma 19:1).

Onyenwe anyị na agwa ụmụmmadụ okwu site n’ìhè nke nchèpụta. Ọ na emeghe anya nke nghọta ha, ka ha wee nwee ike mata “ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ihe-nketa-ya n’etiti ndi nsọ Ya” (Ndi Efesọs 1:18).

Mgbasa Oziọma nke Jisọs na enye mmadụ niile ohere ịnabata ezi Ìhè ahụ. “Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n’elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa” (Matiu 24:14).

Mgbe emere ka Pọl Onyeozi mata ihe banyere ụzọ nke ndụ ebighịebi, otù ìhè na amụke chawara site n’Eluigwe (Olu Ndi-ozi 9:3). Mgbe Pọl zara òkù ahụ Jisọs kpọrọ ya, agwara ya ka ọ bụrụ onyeozi na onyeàmà nye ụmụmmadụ. Jisọs sịrị na Ya na ezigara Pọl Ndị Mbaọzọ. “isaghe anya-ha, ka ha we si n’ọchịchịri chighari ba n’ìhè, si kwa n’ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara ngbaghara nmehie nile na-ihe-nketa n’etiti ndi edoworo nsọ site n’ikwere na Mu” (Ọlu Ndi-ozi 26:16-18).

Inwuru Jisọs

Jisọs sịrị, “Mgbe ọ bula M’nọ n’uwa, abum Ìhè nke uwa” (Jọn 9:5). Oge bịara mgbe Jisọs ebighị kwa n’ụwa, ma Ọ rapụụrụ ndị ná esoụzọ Ya ndụmọdụ. Jisọs sịrị: “Unu onwe-unu bu ìhè nke ụwa … Menu ka ìhè-unu nēnwu n’iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n’elu-igwe” (Matiu 5:14-16). Ka ndị ná esoụzọ Kraist na agbasa Oziọma ná eme kwa ka ìhè ha ná enwu, Onyenwe anyị na egosi ndị bi n’ụwa na Jisọs bụ ụzọ ịbà ná ndụ ebighịebi.

Onyenwe anyị na agwa kwa ụmụmmadụ okwu site na Mmụọ Ya. “Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāgba àmà, n’ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu” (I Jọn 5:7). “Ka ha ra, bú ndi Mọ Chineke nēdu, ndi ahu bu umu-ndikom Chineke” (Ndi Rom 8:14). N’ụzọ niile dị otú a ka Onyenwe anyị na amụkwasị onye ọ bụla nọ nime ụwa ìhè. Ma ọ bụghị mmadụ niile na ejéijè nime Ìhè enyere ha.

Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ụmụmmadụ amataghị Ya dịka Onye kère ha na dịka Ụzọ ịbà ná ndụ ebighịebi. Ndị nke Jisọs, ndị Juu dịka otù mbà, amataghị maọbụ nábata Ya dịka Mesaia ha. Ndị Juu jụrụ Jisọs, sị kwa, “Ayi achọgh ka nwoke a buru eze-ayi” (Luk 19:14).

Ịmụ Ọzọ

“Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n’aha-Ya.” Anyị nwere ohere na mkwesị ịghọ ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom nke Chineke site n’ikwere n’aha nke Ọkpara ya na ihe niile jikọtara n’aha Ya, na site n’ịnata mnwapụta niile nke O nwere inye anyị. “Lenu aha ihu-n’anya nka bu nke Nna-ayi nyeworo ayi, ka ewe kpọ ayi umu Chineke” (I Jọn 3:1). Anyị pụrụ ịbụ ụmụ ndịkom nke Chineke, ọ bụghị náánị n’aha kama bie kwa ya ná ndụ anyị, ịdị ka Kraist. Jisọs aghọghị Nwa Chineke, n’ihi na Ọ bụwororị Nwa Chineke mgbe niile. Ekwuwo yarị na Nwa nke Chineke ghọrọ Nwa nke mmadụ ka ụmụ nke mmadụ wee ghọọ ụmụ nke Chineke

N’ụzọ nke anụarụ maọbụ dịka òkìkè si dị, amụrụ anyị n’anụarụ na ọbara. N’ihe nke imemmụọ, anyị aghaghị ịbụ ndị “amuworo ọzọ … site n’okwu Chineke” (I Pita 1:23).

Ike Ịghọ Nwa nke Chineke

Ọ bụ ihe dị n’ike anyị ịghọ nwa Chineke. Anyị nwere ike na nrọrọ nke ịbụ nwa Ya. Chineke emewo ụzọ site n’Ọkpara Ya, Jisọs Kraist, ọbụ kwa ihe dịịrị anyị isoro ụzọ ahụ, ijéijè nime ìhè ahụ nke enyeworo anyị.

Òlee ụzọ ị ga esi pụ ịghọ nwa Chineke? “Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke” (I Jọn 4:1). Ị ghaghị ikpé ekpere ka Chineke wepụ mmehie n’obi gi na ná ndụ gị, n’ihi na “onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adigh-eme nmehie” (I Jọn 3:9). Ị ghaghị ịhụ Chineke n’anya debe kwa ihe niile O nyere n’iwu (Jọn 5:2, 3).

Ọ bụrụ na ị bụ nwa Chineke, ọ bụrụ kwa na ị na erubere Ya isi, i kwesịrị ịga n’Eluigwe. Ọ bụrụ na ị bụghị, nwa Ya, ị pụghị kwa isoro ndị Ya biri n’Eluigwe. Jisọs sịrị, “Ọ buru na amugh madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pugh iba n’ala-eze Chineke” (Jọn 3:5).

Àjà nke Jisọs

“Okwu ahu we ghọ anu-arụ, bú madu, Ọ we biri n’etiti ayi.” Jisọs yikwasịrị Onwe ya anụarụ, ihe apụrụ imetu aka n’arụ mmadụ. Chineke zitere Ọkpara nke Ya n’oyiyi nke arụ mmehie (Ndi Rom 8:3) “ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya” (2 Ndi Kọrint 5:21).

Jisọs rapụrụ ebube niile nke Eluigwe ịbịa biri nime ụwa nke a n’etiti ndị mmehie, dịka ogbenye, n’ihi gị. Gịnị ka ị ga enye Jisọs n’oge Nchèta ọmụmụ Kraist nke a? Jisọs nyere ndụ Ya n’ihi gị. Ị na ebi ndụ gị nye Ya?

Ebube Ya

Jisọs nyere ụfọdụ ndị ná esoụzọ Ya ohere ịhụ ebube kwesịịrị Ya dịka Ọkpara nke Chineke. Ha hụrụ ebube na ịdị ukwuu nke iru Ya dịka Nwa Chineke n’oge mnwogha Ya (Matiu 17:2). Anyị aghaghị inye Jisọs ekele, otuto, na nsọpụrụ n’ebe a, ọ bụrụ na anyị, ga abụ ndị jikeere maka oge anya niile ga ahụ ebube Ya (Aisaia 40:5). Ka anyị nata amara na eziokwu nke Ọkpara Chineke, nke ga eme ka anyị kwesị iso n’òtù ndị ga abụ Haleluya n’Eluigwe (Nkpughe 19:1).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye ka ya na Chineke nọ n’oge òkìkè?
  2. Ònye na enye anyị ndụ?
  3. Òlee otú anyị pụrụ isi nwee ndụ nke imemmụọ?
  4. Gịnị bụ ọlụ Jọn Ọwụmmiri?
  5. Òlee otú Jisọs si enye onye ọ bụla batara nime ụwa ìhè?
  6. Gịnị ka enyere ndị nábatara Jisọs?
  7. Òlee otú anyị, pụrụ isi ghọọ ụmụ Chineke?
  8. Ònye bụ Okwu ahụ nke ghọrọ mmadụ nke bikwara n’etiti anyị?