Deuteronomi 23:21-23; Eklisiastis 5:1-7; Ndi-Ikpe 11:30-39

Lesson 209 - Junior

Memory Verse
“Asaghepuworom JEHOVA ọnum, apughkwam ilaghachi azu” (Ndi-ikpe 11:35).
Notes

Mkwà

Chineke agaghị arapụ anyị ịnọ ná amaghị ihe banyere ikwe mkwà. Ọtụtụ mmadụ na ekwe Chineke mkwà n’otù oge maọbụ n’oge ọzọ ná ndụ ha. Ikwe mkwà bụ ihe mmadụ na eme naá ekwupụta ọchịchọ ya inye onyinye, iwepụ aka kpamkpam site n’ụfọdụ ihe, maọbụ ime ihe ná nsọpurụ maọbụ n’ijéozi nke Chineke. Mkwà dị elu karịa ihe achọrọ. Ọ bụ ihe mmadụ na enye n’onwe ya n’afọ ofufo.

Ọ dị nnọọ ihe pụtara ìhè dị iche n’etiti mkwà na ijiobi chụọàjà. Mkwà bụ otù ihe dị mkpà nke mmadụ kwuworo iji kegide onwe ya n’ebe Chineke nọ nke ná adịghị nnọọ mkà na ọ ga adị n’ijiobichụọàjà ya. Chineke chọrọ ka anyị were ndụ anyị, onyinye (talent) anyị, na oge anyị chụara Ya àjà. Mgbe Chineke kpọrọ anyị n’ọlụ dị elu nke ka kwa mma anyị na eji obi anyị chụọ àjà ime uche Chineke. Ọ dị mkpà na anyị ga emezu ihe anyị kwuru mgbe anyị ji obi anyị ná achụàjà dịka ọ dị mkpà na anyị gaemezu mkwà anyị kwere.

Ikwe mkwà na abụkarị ihe ana eme mgbe mmadụ nọ ná nsogbu. A na ekwe mkwà na ọ bụrụ na Chineke ga ewepu nsogbu ahụ, onye ahụ ga eme otù ihe. Oge ụfọdụ n’ihi ọrịa, a na ekwe Chineke mkwà dị icheiche. Oge ọzọ dị kwa nnọọ, site n’ịhụnanya na obi ụtọ nye Chineke n’ihi ihe dị icheiche O meworo, mmadụ ekwe mkwà ọtụtụ nke oge ya maọbụ ụfọdụ ezi ihe dị ná ndụ ya.

Eleghịanya Chineke agaghị achọ ka i kwee mkwà, ma mgbe ọ bụla ekwere mkwà ahụ, Chineke na enye ya dịka iwu na aghaghị imezu mkwà ahụ. Baịbụl ekwughị ọtụtụ okwu banyere ikwe mkwà, ma Okwu Chineke doro anya banyere ịkwụghachị mkwà anyị niile. Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya ịrapụ ịkwụghachị mkwà ọ bụla ekwere Chineke. N’ezie, “ọ gābu kwa nmehie nime gi” (Deuteronomi 23:21). Ọ bụrụ na mmadụ ekwebeghị mkwà, ọ gaghị abụ mmehie. Mmehie na abịa mgbe a na akwughachịghị mkwà ahụ, ọ bụghị mgbe ana ekweghị mkwà.

Okwu Ná abụghị Eziokwu

Mgbe mmadụ na akwụghachịghị mkwà niile o kwere Chineke, onye ahụ ekwughị eziokwu. Ọ bụ onye aghụghọ. Gịnị ka Baịbụl na ekwu banyere okwu ụgha na aghụghọ? “Ihe-arù n’anya JEHOVA ka egbugbere-ọnu okwu-ugha bu: ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe ha nātọ Ya utọ” (Ilu 12:22). Devid Onye dere Abù Ọma rịọrọ ka Chineke nápụta ya site “n’egbugbere-ọnu okwu-ugha, na n’ire aghughọ” (Abù Ọma 120:2). Devid achọghị onye ọ bụla ná adịghị ekwu eziokwu ịnọ ya nso. Ọ sịrị “Onye nālu ọlu aghughọ agagh-ebi n’etiti ulom: onye nēkwu okwu-ugha agagh-eguzosi ike n’iru anyam” (Abù Ọma 101:7). Baịbụl na agwa anyị ihe ga abụ ahụhụ nye ndị ahụ ná adịghị ekwu eziokwu. “Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkwegh ekwe … na ndi-ugha nile, òkè-ha ga-abu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre” (Nkpughe 21:8). Ọ bụghị ihe iju anya na Onye dere Abù Ọma sịrị, “M’gākwughachi Gi nkwam nile m’kwere Gi, nke egbugbere-ọnum abua ji saghepu, nke ọnum kwu-kwa-ra, mgbe nkpa dirim” (Abù Ọma 66:13, 14).

Mkwụghachị

“Alala azu n’ikwughachi ya.” Alala àzụ site n’elezighị anya maọbụ nlefuru anya. Mmadụ pụkwara ịla àzụ site n’akwụghachịghị mkwà ya ngwangwa. Ọ dị ụfọdụ mmadụ ndị ná adịghị anọ ná njikere ịkwụghachị mgbe Chineke lụsịrị akụkụ nke Ya. Ha na ekwenye ime ihe ọ bụla mgbe ha nọ ná mkpà: ma mgbe Chineke nyewooro ha aka ihe adịghị kwa óké njọ, ha adịghị ejikere kwa ịkwụghachị ihe ha kwere ná mkwà. “JEHOVA, bú Chineke, aghagh iju ase ya n’aka gi” (Deuteronomi 23:21).

Ihengọpụ

Ụfọdụ mmadụ ga achọ imere onwe ha ihengọpụ n’ihi akwụghachịghị ihe ha kwere Chineke ná mkwà. Ha nwere ike ikwu na ọ bụ ihe a na apụghị ime maọbụ ihe na abaghị urù imezu mkwà dị otú ahụ ha kweworo. Ma ha kwere Chineke mkwà ahụ. Ọ bụ site n’afọ ofufo nke onwe ha. Chineke ajụghị ya n’aka ha. “Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere” (Abù Ọma 50:14).

Ime Ngwangwa Na échèghị Uche

Chineke na adọ akanántị site n’okwu nke Solomon “ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n’iru Chineke” (Eklisiastis 5:2). Mkwà ekwere ọsọsọ bụ mkwà ekwuru nnọọ, ná elezighịanya, na ná échèghị uche. Ọ bụ mkwà ekwere ná elerughịanya na ná échezighị uche ihe ọ ga apụta. Mgbe ị gara n’iru Chineke, nime Ulo Chineke maọbụ n’ebe ọzọ, n’ekpere na n’ịtụgharị uche “ibiaru nso inu di nma” karịa ime ngwangwa ikwe mkwà -- okwu ọjọọ, ọbụná okwu ụgha na mmehie (Eklisiastis 5:1). Chineke na achọ mkwughachị nke mkwà, ma ọ bụ nke emere ngwangwa ma ọ bụghị. Mmadụ apụghị ịkagbu mkwà dị otú ahụ ná asị na “ọ bu n’amagh-ama” (Eklisiastis 5:5).

Jefta

Ọ dị ihe nlereanya dị na Baịbụl nke ná ewepụta ịdị mkpà nke mkwà ekwere Chineke. Otù nime ndị ikpé nke Israel bụ nwoke aha ya bụ Jefta. Dịka anyị pụrụ ịhụ ọ tụkwasịrị Chineke obi, o kwenyereghị kwa ụmụ Amon bụ ndị iro ha. Jefta duru Ụmụ Israel n’agha imegide ndị Amon ka ndị Israel wee jigide ala ahụ nke Chineke nyere ha dịka ihenketa n’Ala Kenean. N’ịnụ ọkụ n’obi na egwù, Jefta kwuru ihe apụrụ ịkpọ mkwà ekwere ọsọsọ. Jefta ejeghị ijè n’iwu Chineke mgbe o kwere mkwà ahụ; ọ bụ ntụpụta nke onwe ya. Ha pụrụrị ịtụkwasị Chineke obi, ọ bụ kwa ihe apụrụ ime na ha gara enwe mmeri ná ekweghị mkwà ahụ.

Otù Mkwà

Jefta gwara Jehova: “Ọ buru na I nye umu Amon n’akam n’ezie, ọ gēru kwa, na ihe ọ bula nke gēsi n’ọnu-uzọ ulom puta izutem, mgbe m’siri n’umu Amon lata n’udo, JEHOVA gēnwe ya, m’gēsure kwa ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku” (Ndi-Ikpe 11:30, 31).

Ihe ná enye mmadụ ọñụ n’ihe banyere Jefta na iheatụ nke dị ná ndụ ya, bụ eziokwu ahụ na o kwụghachịrị mkwà nke a ọbụná na ọ bụ ezie na o wetaara ya óké mwuta na iruuju. Ọ sịrị, “Asaghepuworom JEHOVA ọnum” (Ndi-Ikpe 11:35). Jefta rọọrọ ịhụ ahụhụ karịa ịbụ onye ná ekwesịghị ntụkwasịobi n’ebe Chineke nọ.

Mkwà a bụ ihe dị n’etiti Chineke na Jefta. Eleghịanya ọ dịghị onye ọzọ maara ihe ọ bụla banyere ya, ma Jefta apụghị imebi mkwà o kwere Chineke. Nwa nwanyị Jefta akọjọghị nna ya maọbụ tamue ntamù. Ọ bụ ezie na mkwụghachị mkwà ahụ wetara iruuju na ahụhụ, ma o nyeere nna ya aka. Ọ kwagidere ya site n’ikwu sị, “Mem dika ihe ahu si di nke siworo n’ọnu-gi puta.”

Enyeghị iheọmụmụ a ka ewee mee ka obi gị daa mba ikwe Chineke mkwà. Enyere ya ịdọ gị akanántị pụọ ná mkwà ná enweghị amamihe, na ịgbà gị ume ịkwụghachị mkwà niile i kweworo Chineke. Iheọmụmụ a na egosi na Chineke ji mkwà kpọrọ ihe; ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Ya, o kwesịkwara ịdị otú ahụ n’ebe anyị nọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ mkwà?
  2. Gịnị bụ mkwà ekwere ọsọsọ?
  3. Chineke, O na elefuru mkwà ọ bụla ekweworo anya?
  4. N’ụzọ dị añaa ka mmadụ na abụ onye ná ala àzụ n’ịkwụghachị mkwà?
  5. Òlee otú akwụghachịghị mkwà si dị ka ikwu okwuụgha?
  6. Karịa imebi mkwà ọ ka mma ime gịnị?