Jenesis 4:1-13

Lesson 3 - Elementary

Memory Verse
“Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n’ọchichiri ahu” (I Jọn 2:11)
Notes

Oge Adam na Iv nupụsịịrị Chineke isi ewee chụpụ ha na ogige Iden ahụ maramma, ha wee mụta nwa nwoke. A kpọrọ aha ya Ken. Emesịa ha mụta nwa nwoke ọzọ, kpọọ aha ya Ebel. Ụmụntakịrị abụọ ndịa mara ihe banyere Chineke.

Ebel hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu, ma ná agbalị ime ihe ọ bụla Chineke sịrị ya mee. Ken ejighị obi ya niile hụ Chineke n’anya; ma ọ chọrọ ka Chineke gọzie ya, n’ihi nke a o wetaara Chineke onyinye ịnatairuọma. Chineke chọrọ ka ihe ọ bụla anyị naemere Ya bụrụ n’ihi na anyị hụrụ Ya n’anya. Ma Ken ahụghị Chineke n’anya.

Ebel wetakwaara Chineke onyinye ịnatairuọma. Ọ matara na ya wetara ụdị ihe Chineke naachọ. O wetara nwa atụrụ nke kachasị mma nime igwe ewu na atụrụ ya, ọ hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu nke mere na o nyere Ya ihe ahụ kachasị mma n’ihe o nwere. Onyinye ịnatairuọma Ebel dị Chineke ezimma.

Mgbe Ken hụrụ na onyinye ịnatairuọma ya adịghị Chineke mma, ma afọjuru ya na nke Ebel, Ken wee weeiwe n’ebe ọ dị ukwuu. Asị na Ken chègharịrị n’ihi onyinye ya nke náadịghị Chineke mma, ma kpeekpere ka Chineke nyere ya aka iweta nke dị mma, Chineke gaara enyere ya aka. Ken wereiwe dịka nwa emebiriemebi nke náenweghị ike inweta ihe ọ chọrọ. Ken wee nwee anyaukwu n’ebe nwanne ya nwoke Ebel nọ. Ọ kpọrọ ya asị rue na o gburu ya.

Mgbe Chineke jụrụ Ken ebe Ebel nọ, Ken wee kwueokwu asị ma sị na ọ maghị. Otù mmehie, ọ bụrụ na echègharịghị na ya o duba onye ahụ n’ọzọ. Nke mbụ Ken wereiwe, o kwoekworo, mesịa gbue nwanne ya nwoke ma kwue kwa okwu ụgha.

Ekworo naeduba ụmụmmadụ n’ime ihe ọjọọ dị icheiche. Chineke naagwa anyị na anyị kwesịrị ịñụrịọñụ mgbe nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị nwetara ihe dị mma karịa anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee aha Adam na Iv nyere ụmụntakịrị ha abụọ?
  2. Ònye hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu, Ken kaọbụ Ebel?
  3. Gịnị mere onyinye ịnatairuọma Ken adịghị Chineke ezimma?
  4. Gịnị mere onyinye ịnatairuọma Ebel ji dị Chineke ezimma?
  5. Gịnị mere Ken ji weeiwe mgbe Chineke naara onyinye ịnatairuọma nke Ebel?
  6. Gịnị ka ekworo dubara Ken ime Ebel?
  7. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị nwetara ihe dị mma karịa anyị?