Jenesis 8:1-22

Lesson 5 - Elementary

Memory Verse
“Dozienu ụzọ Onye-nwe-ayi” (Luk 3:4).
Notes

Chineke chetara Noa na èzínaụlọ ya nime ụgbọ ukwu ahụ, wee mee ka mmiri ahụ kwụsị izodata n’eluụwa. Chineke gwara ifufé ka o feé n’elu ụwa mee ka mmiri ahụ tasịa. Noa meghere windo dị n’ụgbọ ahụ, wee zipụ ugoloọma, ma ugoloọma ahụ alọghachighị. Ọ pụrụ ịbụ na ọ hụrụ osisi kpọrọnkụ na ozu ndị mmadụ nime mmiri ebe ọ nwere ike izuike n’elu ha.

Emesịa ezipụ nduru. Ọ bụrụ n’ala atakọla mmiri ọ gaghị alọghachi, ma ọ lọghachiri baa n’ụgbọ ahụ.

Nwayọ nwayọ mmiri ahụ wee malite ịsọba n’óké osimiri niile na iyi ntà niile, ala wee malite ịkpọnkụ ọzọ.

E zipụrụ nduru ahụ ọzọ, ma ugbu a ọ kụbitara akwụkwọ osisi olive ọhụụ n’ọnụ ya wee bịaghachị. Noa wee chere ụbọchị asaa ọzọ wee zipụ nduru ọzọ.

Ma oge a, ọ lọghachighị azụ ọzọ. Noa wee mara na mmiri atakọchala n’eluụwa. Noa na èzínaụlọ ya na ụmụ anụmanụ niile ahụ anọọla nime ụgbọ ahụ ogologo oge. Ọ baghị nime ụgbọ ahụ rue oge Chineke gwara ya ka ọ baa, ma ọ rapụghịkwa ụgbọ ahụ rue oge Chineke gwara ka o mee otú ahụ. Ma otù ụbọchị, Chineke gwara ya ka o dupụta èzínaụlọ ya na ụmụ anụmanụ ndị ahụ site n’ụgbọ ahụ ma biri kwa ọzọ n’eluụwa.

Mmiri eriela ndị ajọomume niile ahụ. Ụwa ga bụrị ihe dị iche n’anya Noa n’ihi na óké mmiri ahụ sachara ụwa iru na azụ, ná arụghịụka o mejupụtara ebe niile dị ala, ma wulita ebe niile dị elu.

Taa, anyị na ahụ okpokoro eju mmiri, ọkpụkpụ anụ dị icheiche biri na mmiri, na ọtụtụ ihe ndị naagbagwoju anya n’elu ugwu niile na ná mgbawa nkume niile. Óké mmiri ahụ nke ijummiri sachapụrụ ha ga ebe ahụ.

Ihe mbụ Noa mere mgbe ọ bịaghachịri n’elu ala kpọrọnkụ bụ idozi ebe o nwere ike ifé Chineke. Noa gaenwerịrị obi ekele nye Chineke maka nchebe n’ogologo oge ahụ mgbe mmiri kpuchiri eluụwa niile, na mmiri riri ihe niile dịndụ. Ọ gaahụworị Chineke n’anya karịa otù ọdị na mbụ.

Chineke wee tinye ekenaogwurugwu maramma n’igwe ojii iji gwa ụwa niile na Ya agaghị eji kwa ijummiri bibie ụwa ọzọ. Mgbe niile Chineke na edebe mkwà Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye mere ka mmiri takọsịa n’ala? Jenesis 8:1
  2. Ònye ka Chineke chetara mgbe O mesịrị ka mmiri takọsịa n’ala? Jenesis 8:1
  3. Gịnị bụ ihe mbụ Noa zipụrụ iji hụ ma mmiri ọ takọla? Jenesis 8:7
  4. Gịnị ka Noa zipụrụ mgbe o zipụsịrị ugoloọma? Jenesis 8:8
  5. Òlee otú Noa si mata na mmiri esiwo n’eluala taba? Jenesis 8:11
  6. Òlee otú Noa si mata mgbe ọ gaarapụ ụgbọ ahụ? Jenesis 8:15, 16
  7. Gịnị bụ iheàmà nke Chineke nyere anyị iji gosi anyị na Ya agaghị eji mmiri bibie ụwa ọzọ? Jenesis 9:13, 15