Jenesis 13:1-8; 14:13-16

Lesson 6 - Elementary

Memory Verse
“Debe onwe-unu n’ihu-n’anya Chineke” (Jud 21)
Notes

Chineke chọrọ nwoke onye gaeme ihe ahụ Ọ chọrọ nnọọ ka eme. Chineke rọpụtara otù nwoke aha ya bụ Abraham n’ihi na Chineke matara na ọ hụrụ Ya n’anya ma náerubere Ya isi. Abraham biri n’obodo dị anya nke iruanyanwụ anakpọ Mesopotamia. Ndị bi n’obodo ahụ naekpere arụsị, ma Abraham hụrụ ezi Chineke n’anya ma náefè kwa Ya òfùfè.

Abraham hụrụ ndị ya na obodo nke aka ya n’anya nke ukwuu. Ma mgbe Chineke gwara ya ka ọ rapụ ebe ahụ jee ebe ọzọ, Abraham asịghị “chere, m’ga eje ma emesịa.” Ngwangwa o rubeere Chineke isi, ma were ihe ụfọdụ gaabara ya urù na njèm ya. O duuru Sera, nwunye ya na Lot nwanwanne ya wee jee.

Mgbe Abraham bịara ebe ọhụụ, ihe mbụ o mere bụ iwu ebe ịchụàjà ebe o nwere ike ifè Chineke. Abraham échèfughị ịhụ Chineke n’anya, ikele Ya, na ịrịọ Chineke ka o nọnyere ya. Abraham nwere ọtụtụ ịnyịnyaibu, ewu, atụrụ na ọtụtụ anụụlọ dị icheiche. Lot nwekwara ndị nke ya. Ndị ọzụzụ anụụlọ ha wee malite iseokwu banyere nri anụụlọ ha n’erị.

Abraham wee sị na ọ dịghị mma iseokwu. Ọ gwara Lọt na ya Lọt gaaga n’ebe dị icheiche ka ha nwee ebe abụọ sara mbara. Abraham enweghị agụụ ọchịchọ nke onweonye. Ọ bụ ezie na ọ bụ okenye n’ebe Lọt nọ, ọ gwara Lọt ka ọ rọrọ ala nke ọ chọrọ. Lọt chọrọ ichebe ihe bụ nke ya karịa inyere nwanne ya nwoke aka.

Lọt rọọrọ ala nke nwere mmiri nkeọma maka anụụlọ ya, ma nrọrọ ya abụghị nke dị mma. Ndị bị n’ebe ahụ ahụghị Chineke n’anya, ha adịghị kwa efè Ya òfùfè. Ha dị njọ nke ukwuu, ma ọ bụ ihe jọgburu onweya ịnọ n’etiti ndị ọjọọ. Otù ụbọchị, ndị eze anọ jọrọnjọ na ndị agha ha bịara, wee buru Lọt na èzínaụlọ ya na anụụlọ ya niile.

Mgbe Abraham nụrụ ihe mere Lọt, o duru ndịkom ya ọnụọgụgụ ha dị 318 tinyere onweya wee chụso ndị ori ahụ. Ejidere ndị ori ahụ wee mekpaa ha arụ, ma dughachị Lọt na èzínaụlọ ya.

Onye eze nke Abraham nyereaka chọrọ ịkwụ ya ụgwọ, ma Abraham agaghị anara ụgwọọlụ maka ime ezi ihe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Chineke ji rọpụta Abraham?
  2. Gịnị ka Abraham mere mgbe Chineke sịrị ya pụta? Jenesis 13:1
  3. Gịnị bụ ihe mbụ Abraham mere mgbe ọ bịara ebe ọhụụ? Jenesis 13:4
  4. Gịnị ka Abraham mere mgbe ndị ọzụzụ anụụlọ ahụ malitere iseokwu? Jenesis 13:8, 9
  5. Gịnị ka Lọt rọọrọ? Gịnị dị njọ na ya?
  6. Gịnị ka Abraham mere mgbe ọ nụrụ na Lọt dabara ná nsogbu? Jenesis 14: 15,16