Jenesis 19:1-29

Lesson 7 - Elementary

Memory Verse
“Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa, n’anya” (I Jọn 2:15).
Notes

Lọt, nwanwanne Abraham, rọọrọ ala ebe dị mma maka anụụlọ ya. Ndị ajọ mmadụ nọ n’ebe ahụ. Chineke hụrụ ajọomume ndị ahụ, ma Chineke kpọrọ mmehie asị. Mgbe ụmụmmadụ mehiere ha naenupụrụ Chineke isi ma merụọ onweha arụ. Chineke aghaghị ịta ha ahụhụ iji nyere ha aka ma dọọ kwa ndịọzọ akanántị. Ndị bi na obodo Sọdọm na Gọmọra ekpebiela ịdị njọ. Ha achọghị ichègharị ma chigharịkwuta Chineke.

Chineke wee kpebie ibibi obodo ọjọọ ndị ahụ na ndị niile bi n’ime ha. Abraham kpereekpere, wee jụọ Chineke ma Ọ gaje ibibi kwa ndị eziomume, mgbe Ọ naebibi ndị ọjọọ. Ọ jụọ Chineke ma Ọ ga azọpụta obodo Sọdọm ahụ ma ọ bụrụ na ahụta mmadụ iriise ndị azọpụtara nime ya, Onyenweanyị wee za na Ya gaazọpụta ha. Abraham wee jụọ kwa ọzọ ma Ọ gaazọpụta ha maka mmadụ irianọ maọbụ iriatọ, emesịa o wedata ya na iriabụọ emesịa iri. Onyenweanyị sịrị na Ya gaagbaghara ha n’ihi mmadụ iri. Ma ọ dịghị ọbụná mmadụ iri ndị azọpụtara n’ebe ahụ.

Otù uhuruchi, Lọt naanọdụ ala n’ọnụụzọ ámá nke Sọdọm. Ọ hụrụ ndị mmụọozi abụọ náabịa n’iru ya. Ndị mmụọozi ahụ gwara Lọt ka o dupụ èzínaụlọ ya niile pụọ na obodo ahụ. Obodo ahụ jọrọnjọ nke ukwuu na Chineke zitere ha ibibi ya. Ha gwara Lọt na èzínaụlọ ya ka ha mee ngwa gbaga n’ugwu ndị ahụ; ha elekwala anya n’azụ ha.

Lọt duru nwunye ya na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ, ha wee gbapụ site n’obodo ahụ. Mgbe nke a gasịrị, ọkụ dakwasịrị obodo ahụ, ma gbarie ya. Ma nwunye Lọt lere anya n’azụ. Ọ ga abụ na o nwere ihe ọ hụrụ n’anya ọ rapụrụ, maọbụ ọ chọrọ ịma ma ihe ndị mmụọozi nke Onyenweanyị kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ na ọbụghị. O wee ghọ ogidi nnú. Azọpụtara Lọt na ụmụ ya ndịnyom abụọ ndị kwere okwu nke ndị mmụọozi ahụ wee gbapụ site n’obodo ahụ n’eleghịanya n’azụ.

Chineke mara ihe kachasị mma nye anyị. Ọ gaghị agwa anyị mee ihe ọ bụla náabụghị maka ọdị mma anyị. Adam na Iv nupụrụisi n’ogige Iden, Nnupụisi ha nye Chineke wetaara ụwa niile mmehie na iruuju. Jisọs naerubere Chineke isi mgbe ọ bụla, Chineke wee sị na ihe Ya (Jisọs) naatọ Ya ụtọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Lọt ji rọrọ ibi n’ala Sọdọm?
  2. Òlee ụdị ndị bi na Sọdọm bụ, ndị ọma kaọbụ ndị ọjọọ?
  3. Gịnị ka Chineke zubere ime ha n’ihi omume ọjọọ ha?
  4. Gịnị bụ ekpere Abraham nye Chineke?
  5. Gịnị ka Chineke zigara ndị mmụọozi ahụ ịgwa Lọt?
  6. Gịnị ka nwunye Lọt mere?
  7. Gịnị mere ya mgbe ọ nupụrụisi?
  8. Ọ naatọ Chineke ụtọ mgbe anyị naenupụisi?