Jenesis 28:1-22

Lesson 9 - Elementary

Memory Verse
“Ọ gēduba unu n’ezi-okwu nile” (Jọn 16:13).
Notes

Chineke nyere Abraham otù nwa nwoke akpọrọ aha ya Aisak . Aisak toro bụrụ okenye. Ọ lụrụ nwaagbọghọ aha ya bụ Rebeka na nwunye. Aisak na Rebeka nweghị otù nwa kama ha nwere ụmụejima! Chee échìchè maka nke a! ụmụ abụọ n’otù oge. Akpọrọ aha ha Ịsọ na Jekob.

Jekob chọrọ ngọzi nke Chineke, ma Ịsọ chere na o nwere ike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ọ chọghị ịrịọ Chineke maka enyemaka. Otù ụbọchị, Jekob mejọrọ nwanne ya nwoke, nne ya wee gwa ya na ọ ka mma na ọ rapụrụ ụlọ ha rue oge iwe Ịsọ gaadajụ. Náenweghị obiabụọ, nne ya siri nri nye ya, o wee bulie njèm ịga n’obodo nwannenne ya dị ebe dị anya.

Jekob rarụrụ ụra ebe ọ bụla o rutere o nwere ike ịbụ na agbata nkume ukwu, maọbụ n’okpuru osisi dị na mbara maọbụ n’ebe dị osimiri nso. Otù abalị, ọ chịkọtara nkume wee doo ha n’okpuru isi ya iji mee pillow. O wee daa n’oké ụra, wee rọọ nrọ dị ebube. Ọ hụrụ ubube nke sitere n’ala rue Eluigwe. Ndị mụọozi naarịgo naarịda n’ubube ahụ.

Ònye ka ichere na ọ hụrụ n’elu ubube ahụ? Ọ hụrụ Onyenweanyị n’ebe ahụ, Onyenweanyị Chineke wee kwueere ya okwu.

Ọ gwara ya na Ya bụ Chineke nke nna ya na nke nnanna ya na Ya gabụkwara Jekob Chineke. Chineke kwere mkwa na Ya gaanọnyere Jekob na njèm ya ma dughachi kwa ya azụ n’udo.

Mgbe Jekob tetara, nrọ ọma ahụ ọ rọrọ juru ya anya.

Ọ hụrụ Chineke anya ma Chineke kwuuru ya okwu. Jekob sịrị, “N’ezie JEHOVA nọ n’ebe a,…. Nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nánị ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe”. Jekob lezirianya nkeọma n’ihi na ọ nọ n’iru Chineke. Anyị kwesi kwara ilezianya nke ọma mgbe ọ bụla anyị bịara n’ụlọ Onyenweanyị ebe Onyenweanyị n’ebi.

Jekob nwere obi ekele nye Chineke Ọ nọnyeere ya. O kwere mkwa ifè Chineke ma nye kwa otù ụzọ n’ụzọ iri site n’ihe o nwere. Nke a bụ ịkwụ otù ụzọ n’ụzọ iri nke NdịKraist naeme n’ụbọchị taa. Ọ bụghị náánị otù ụzọ n’ụzọ iri nke ihe anyị nwere maọbụ ihe anyị nwere ike inweta ka Chineke chọrọ ka anyị nye Ya, Ọ chọkwara ndụ anyị. Mgbe ahụ Ọ gọzie anyị karịa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ nwunye Aisak? Jenesis 25:20
  2. Òlee aha ndị enyere ụmụejima Aisak na Rebeka mụrụ? Jenesis 25:25, 26
  3. Gịnị mere Jekob n’otù abalị nime njèm ya ịga n’ụlọ nwannenne ya? Jenesis 28:11
  4. Gịnị bụ ihe ahụ Jekob hụrụ na nrọ ya? Jenesis 28:12
  5. Gịnị ka Chineke gwara Jekob? Jenesis 28:13
  6. Gịnị ka Jekob kwere Chineke mkwa na ọ gaeme? Jenesis 28:22