Jenesis 37:1-36

Lesson 10 - Elementary

Memory Verse
“Nāhunu ndi-iro-unu n’anya” (Matiu 5:44)
Notes

Jekob nwere ụmụ ndikom irinaabụọ. Ọ hụrụ Josef n’anya n’ihi na ọ bụ nwa dị mma ma n’erubeisi. Ụmụnne ya kpọrọ ya asị n’ihi na ha chere na nna ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Nna Josef meere ya uwe nwuda nwere àkà maramma. Nke a mere ụmụnne ya ji kpọọ ya asị karịa.

Josef rọrọ otù nrọ dị ebube. Jekob kwere na ọ bụ Chineke gosiri Josef nrọ ahụ, na Chineke gaemezukwa ya, ma nka mere ka ụmụnne ya kpọọ ya asị karịa. Ụmụnne Josef nwere ọtụtụ anụụlọ ha naelekọta.

Otù ụbọchị, ụmụnne Josef hụrụ ya ka ọ naabịa site n’ebe dị anya, ha malite ịtụ atụmààtụ otú ha gaesi gbue ya. Ọ bụghị ihe ziriezi ụmụnne Josef ịkpọ ya asị n’ihi na Chineke nyere anyị iwu ka anyị hụ ndị agbataobi anyị n’anya. Anyị kwesịrị ịhụ ndị agbataobi anyị n’anya ma naenyerịtara ibe anyị aka.

Oge naadịghị anya, ha hụrụ ụmụmmadụ naabịa n’inyinya ibu.Ha naaga n’obodo dị anya ire ngwaahịa ha. Mgbe ahu Juda otù nime ụmụnne Josef sị “Ọ kaghị mma ka anyị resị ndịa Josef kama igbu ya?” Ụmụnne ya wee nara ntụpụta Juda na ọ ka mma, n’ihi nke a ha ree ya iri ọlaọcha abụọ. Mgbe ha yipụsịrị ya uwe nwụda nwere àkà maramma, ha wee dunye ya ndị zụrụ ya. Ha gbue ewu, ma were uwe nwụda nwere àkà ọma nke Josef deba nime ọbara ya ma wegaara ya nna ha. Ha sị ya, “anyị hụrụ uwe nwụda a, icheghị ọ gaabụ nke Josef?”

Jekob matara uwe nwụda ahụ n’egbughị oge. Ọ zara sị “ọ gabụ na anụọhịa adọgbuwo ya”. Ha agwaghị ya na ọ bụ ha rere ya. Owutara Jekob n’ihi na o zipụrụ náánị Josef.

Josef kweere Chineke ma kwere kwa na Chineke nwere ike idebe ya. Ka anyị mee dịka Josef. Anyị achọghị ịbụ ndị okwu ụgha dịka ụmụnne ya. Anyị kwesịrị ịnaagwa ndị nna anyị na ndị nne anyị eziokwu oge niile.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Jekob ji hụ Josef n’anya?
  2. Òlee ihe mere ụmụnne Josef ji kpọọ ya asị? Jenesis 37:4, 5, 8
  3. Gịnị ka ha kpebiri ime ya? Jenesis 37:19, 20
  4. Ego òle ka erere ya? Jenesis 37:28
  5. Ụmụnne ya ekwuru eziokwu?
  6. Josef o kwere na Chineke?