Jenesis 41:1-59

Lesson 11 - Elementary

Memory Verse
“Chọnu, unu gāchọta kwa” (Matiu 7:7).
Notes

Mgbe ụmụnne Josef resịrị ya eduru ya gaa Ijipt, emesịa ree ya ịbụ orù. Onye ozi obodo wee zụrụ Josef, ma hụ ya n’anya n’ebe ọ dị ukwu n’ihi na Josef dị mma naerubeisi.

Otù ụbọchị, ewetara akụkọ ụgha banyere Josef. Onye ozi a kweere akụkọ ụgha a, ewe tụba Josef n’ụlọmkpọrọ. Ọ gaabụrị ihe siriike Josef na ndị ajọ mmadụ ịnọ n’ụlọmkpọrọ ebe ọ matara na ọ dịghị ihe ọjọọ o mere.

Ma Josef hụrụ Chineke n’anya, o kwere na ihe niile gaadị mma. O nwere obiọma, nwekwa ọñụ, n’ụlọmkpọrọ, ọ naenyere ndịọzọ aka dịka ọ naeme na mbụ. Onye nlekọta nke ụlọmkpọrọ ahụ hụrụ na Josef adịghị ka ndịọzọ, o nwee mmasị n’ebe Josef nọ. Nime ụlọmkpọrọ ahụ, Josef kọwara ihe ọtụtụ nrọ dị icheiche nke ndị mmadụ nọ n’ụlọmkpọrọ ahụ rọrọ pụtara.

Arọ abụọ mgbe ihe ndịa gasịrị, eze ahụ wee rọọ otù ụdị nrọ ugbo abụọ. Ọ kpọọ ụfọdụ nime ndikom ya ịkọwara ya ihe ọ pụtara, ma ha enweghị ike. Mgbe ahụ o wee cheta Josef n’ụlọmkpọrọ. Ọ nụrụ na o nwere ike ịkọwa ihe nrọ pụtara, eze wee ziga kpọọ Josef.

Ọ gwara Josef na ya rọrọ nrọ ebe ọ naeguzo naakụkụ osimiri, ehi asaa maraabụba wee site na osimiri ahụ pụta ma naata ahịhịa. Mgbe ahụ ehi asaa ọzọ tara arụ wee pụta rie ndị nke ahụ maraabụba. Eze rọkwara nrọ hụ ebe oko ọka asaa nawapụta n’otù okporo. Emesịa oko ọka asaa nke fịkpọrọ afịkpọ pụta wee rie nke arụ dị mma buruibu.

Josef kpeere Chineke ka o mee ka ọ mata ihe nrọ ahụ pụtara, o wee mata ya. Ọ gwara eze na Onyenweanyị gosịrị ya ihe ọ gaeme n’ala ya. Ehi ahụ mara abụba na ọka ahụ soro mkpụrụ dị kwa mma pụtara na agaenwe afọ asaa ihe oriri gaadị n’ebe ọdị ukwuu. Emesịa agaenwe afọ asaa ihe oriri naagaghị adị maọbụghị ma ekpokọtara ọtụtụ ihe oriri n’ebe ọdị ukwuu n’oge arọ asaa dị mma gaedu ha rue arọ asaa ọjọọ ahụ.

Obi tọrọ eze ụtọ nke ukwuu maka nkọwa ahụ Josef kọwaara ya, o wee mee ya onye ọchịchị n’ala ahụ. Chineke kwụghachiri Josef ụgwọọlụ. Nwanta nwoke bụ orù, onye etinyere n’ụlọmkpọrọ náemeghị ihe ọjọọ, si n’ụlọmkpọrọ pụta, wee bụrụ onye ọchịchị n’ala Ijipt niile.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka ndị ahụ zụtara Josef naaka ụmụnne ya mere ya? Jenesis 37:36
  2. Ònye zụnaara Josef n’aka ha? Jenesis 39:1
  3. Gịnị bụ nrọ eze ahụ? Jenesis 41:2-7
  4. Josef ò mere mmehie tupu etinye ya n’ụlọmkpọrọ?
  5. Òlee otú Josef si mata ihe nrọ ahụ pụtara?
  6. Gịnị ka enyere Josef dịka ụgwọọlụ ya maka enyemaka o nyeere eze? Jenesis 41:41