Jenesis 45:1-28

Lesson 13 - Elementary

Memory Verse
“Chineke nke ihu-n’anya na udo gānọnye-kwa-ra unu” (2 Ndi Kọrint 13:11)
Notes

Ụmụnne Josef nwere nwuta n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere. Ha hụrụ nna ha n’anya ugbua, ha achọghị ịkpọpụ Benjamin n’ebe nna ha nọ, nke a gaeme nna ha obi ọjọọ. Josef gwara ụmụnne ya na ya bụ Josef. Egwù tụrụ ha na ọ gaata ha ahụhụ maka orure ha rere ya ma o meghị ihe dị otú a, ọ gwara ha na ọbụ Chineke bụ Onye kwere ka edupụ ya jee ebe ahụ iji nyere ha aka. Chineke mara banyere ihe ọ bụla nke náadakwasị anyị, ma ọ bụrụ na anyị hụrụ Ya n’anya, Ọ gaenyere anyị aka.

Josef zigara ka nna ya bịa ka o wee lekọta ya na ụmụnne y anime oge ụnwụ ahụ. O suturụ ụmụnne ya ọnụ, nye ha ọka na ọtụtụ onyinye dị icheiche. Mgbe ụmụnne ya laruru ụlọ wee kọọrọ nna ha na Josef dịndụ, na ọ bụ ya bụ nwoke ahụ onye ha zụrụ ọka naaka ya, o ju ya anya. Ha gwara ya na Josef chọrọ ka nna ya bịa hụ ya anya. Obi tọrọ Jekob ụtọ mgbe ọ nụrụ na nwa ya nwoke ka dịndụ. Chineke gwara ya ka ọ ghara ịtụ egwu ịga. Chineke gwara ya na Ọ gaelekọta ya. O wee bilie ngwangwa ma jee n’ụzọ ya ije nonyere Josef.

Obi tọrọ eze ahụ ụtọ mgbe ọ nụrụ na nna Josef bịara n’ihi na ọ maraoké obi ụtọ nke gaeme Josef. Eze ahụ chọrọ ka Josef nwee obiụtọ n’ihi na o nyeere ya aka. Ụmụnne ya ahụ mere ihe ọjọọ ire nwanne ha Josef ma ha ekpeerela Chineke ka Ọ gbaghara ha, ma Ọ gbagharala ha. Obi gaatọrị Josef ụtọ i nwe nnọnyere nke nna ya na ụmụnne ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere eji ree Josef gaa Ijipt? Jenesis 45:7
  2. Josef o ji obi ya niile gbaghara ụmụnne ya maka ihe ọjọọ ha mere ya? Jenesis 45:5-8, 14-15
  3. Gịnị ka Chineke gwara anyị maka mgbaghara? Mak 11:25; Luk 6:37
  4. Òlee otù o si metụta Jekob mgbe ọ nụrụ na Josef dịndụ? Jenesis 45: 26-28