Jọn 19:38-42; Matiu 27:62-66; Jọn 20:1-31

Lesson 14 - Elementary

Memory Verse
“Ewerewo ike nile di n’elu-igwe na n’elu uwa nyem” (Matiu 28:18).
Notes

Jisọs, enyi na Onyenzọpụta nke ụwa, ka akpọgidere n’obe ahụ. Otù nime ndị enyi Jisọs anaakpọ Josef rịọrọ Pailat ka o bunye ya arụ Jisọs. Enyi Ya ọzọ anaakpọ Nikọdimọs wetara mmanụ náesiisi ụtọ, ndị enyi abụọ a jikọrọ ọnụ were ezi ákwà ọcha kee arụ Jisọs mgbe ha tesịrị Ya mmanụ.

O nwere ubi dị nso ebe ahụ, n’ebe ahụ ka Josef tọgbọrọ Jisọs nime ílì o meere onwe ya. Ọ kpọre otù nkume ukwu kwachie ọnụụzọ ya. Ndị ajọmmadụ ahụ kpọgidere Jisọs n’obe chọrọ ime ka aghara izu arụ Jisọs n’ori, n’ihi nke a ha kara nkume ahụ akara wee gwa ndị agha ụfọdụ ka ha náeche ya nche.

N’isi ụtụtụ ụbọchị mbụ n’izu, Meri Magdalini, onye ahụ hụrụ Jisos n’anya nke ukwuu, bịara n’ílì ahụ. Ma ọ dịghị ihe dị ya. Ngwangwa Meri ji ọsọ gbapụ jee gwa ndị naesoụzọ Ya na ebupụla arụ Jisọs.

Mgbe Pita na Jọn nụrụ nke a, ha mere ngwa jee lee ebe ahụ. Ha hụrụ ákwà ahụ eji lie Jisọs, ma ha ahụghị Jisọs n’ebe ahụ. Ọ bụ gịnị mere?

Mgbe Pita na Jọn pụrụ ebe ahụ, Meri Magdalini guzoro n’azụ ílì ahụ náánị, náebe ákwà. Ebee ka ha gbugara arụ Jisọs Kraist ọ hụrụ n’anya? Meri lere anya gburugburu, wee hụ onye guzo n’azụ ya. O chere na ọ bụ onye n’elekọta ubi wee sị, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ị bupuru Ya n’ebe a, gwam ebe ị tọgbọrọ Ya.”

Mgbe ahụ Ọ kpọọ ya sị “Meri” Aa! Ọ bụ olu ụtọ nke Jisọs! n’ezie Ọ dị ndụ! Onye mgbapụta ya na enyi ya.

Anyị kwere na Jisọs dịndụ rue ụbọchị taa, Ọ nọ n’eluigwe, naekpere Chineke ka O nyere anyị aka ma debe anyị ụbọchị niile.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ndị n’etiti ndị enyi Jisọs kéré arụ Ya ákwà? Jọn 19:38-40
  2. Ebe ka Josef tọgbọrọ arụ Jisọs, gịnị ka o doro n’ọnụụzọ ílì ahụ? Jọn 19:41
  3. Onye bịara n’isi ụtụtụ ahụ wee hụ na ílì ahụ tọgbọrọ n’efu? Jọn 20:1
  4. Onye kwuuru Meri okwu n’ebe o guzo na ákwáakwá? Jọn 20:11-12
  5. Jisọs Ọ dịndụ taa?
  6. Ebe ka Ọ nọ, gịnị ka Ọ naeme?