Luke 2:40-52; Mak 6:1-6

Lesson 15 - Elementary

Memory Verse
“Aghaghm idi n’ihe nke Nnam” (Luk 2:49)
Notes

Oge eze ọjọọ ahụ chọrọ igbu Jisọs, Chineke gwara nnenanna Ya ka ha kuru Ya jee Ijipt. Eze ahụ gburu ụmụnta ndị nwoke niile, ma Chineke chebere Jisọs. Mgbe eze ahụ nwụrụ, Chineke gwara nnenanna Ya ka ha dughachi Ya. Ha lọghachi na Nazaret. Ebe ahụ ka Jisọs toro. Ha enweghị mmiri naagba n’igwe dịka anyị nwere, ma ọ dị mmiri si n’okwuta agbapụta nke náadịghị atata dị na Nazaret. Ọ gaabụrị na Jisọs naenyere nne Ya aka naaga esetara ya mmiri, náenyekwara Josef aka n’ụlọọlụ ya ebe ọ naakwankà.

Jisọs ejebeghị Jerusalem mbụ ma mgbe Ọ gbara arọ irinaabụọ, O soro nnenanna Ya jee ná Ụlọukwuu dị na Jerusalem. Mgbe ụbọchị òlenaòle gasịrị ndị mụrụ Ya lọghachirị ịla n’ụlọ ha, ma ha amaghị na Jisọs esoghị na njèm ahụ. Mgbe ha matara na Ọ nọghị n’etiti igwemmadụ ahụ, ha laghachi Jerusalem.

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ Ya nime ụlọukwuu ebe Ọ naege ndị nkuzi ntị ma ná ajụ kwa ha ajụjụ dị icheiche. O jukwara ụmụmmadụ ahụ anya n’ajụjụ Ya niile. Mgbe ndị mụrụ Ya hụrụ Ya wee gwa Ya na ha naachọ Ya Ọ sị ha na Ya aghaghị ịdị n’ihe nke Nna Ya.

Anyị amaghị ọtụtụ ihe banyere mgbe Jisọs dị na nwata, ma anyị matara na O rubeere ndị mụrụ Ya isi. Ọ naachọ ị dị na ekpereekpere nye Nna Ya nke bi n’Eluigwe bụ Onye hụrụ Ya n’anya karịsịa ihe niile.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Jisọs naeme n’Ụlọukwuu? Luk 2:46
  2. Gịnị ka Jisọs gwara ndị mụrụ Ya mgbe ha hụrụ Ya? Luk 2:49
  3. Jisọs Ọ naerubere ndị mụrụ Ya isi? Luk 2:42
  4. Arọ òle ka Jisọs gbara n’oge a? Luk 2:42