Matiu 3:1-12; Mak 1:1-11; Jọn 1:19-28

Lesson 16 - Elementary

Memory Verse
“Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma” (Matiu 3:17).
Notes

Ọ dị otù onye nke Chineke anaakpọ Jọn Onyeọwụmmiri. O bighị n’ime obodo ebe ndịmmadụ bi, ọ naebi n’ọzara. Ma Jọn adịghị atụegwu. Ọ mara na Chineke nọnyere ya. Jọn naehiụra nime ọgba okwuta. Eji aji camel mee uwe oyiyi ya, nri ya bu kwa ụdị ụkpara nke anaakpọ igurube na manụañụ si na ogba okwuta na nke osisi.

Jọn chọrọ ịnọ naebe dị anya pụọ n’ebe ndị ya nọ ka o nwee ike nwee ohere iche banyere Chineke, n’ihi na oge náadịghị anya ọ gaamalite ikwusara ụmụmmadụ na ikuziri ha otù dị mma iji gee Jisọs ntị mgbe Ọ gaamalite mkwusa Ya otù ụbochị. Chineke gwara Jọn ka ọ gwa ụmụmmadụ na Jisọs naabịa na Ọ bụ kwa Ọkpara Chineke. Ọ gwara ha na ọ bụ ihe nadịghị mma ime mmehie. Ọ gwara ndị ahụ ka ha nwee mwuta n’ihi mmehie ha, rịọ Chineke ka Ọ gbaghara ha ma nwee kwa mkpebi na ha agaghị emehie ọzọ. Ọtụtụ chegharịrị ma rịọ kwa Chineke ka Ọ gbaghara ha mmehie ha. Mgbe nkr a gasịrị Jọn awụọ ha mmiri na osimiri Jọdan.

Oge náadịghị anya, ụmụmmadụ ndị nọ na Jerusalem na gburugburu Judia nụrụ banyere onye mkwusa a pụrụ iche nọ na ọzara. Ònye ka ọ bụ? Ò si ebe bịa? Ọ dịghị onye matara. Ndị mmadụ ụfọdụ jụrụ ya, “Ònye ka ịbụ? Ị bụ Jisọs ahụ anyị naele anya ya? Jọn zara ha sị “Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si, menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzosie ike.”Jisọs bịara n’osimiri ahụ ebe Jọn na awụ ndị mmadụ mmiri. Jisọs chọkwara ka awụọ Ya mmiri. Chineke chọrọ ine Jisọs iheatụ nye anyị n’ihi na Jisọs bụ onye ndu anyị, ma anyị kwesịrị iso Ya.

Awụrụ Jisọs mmiri ma dịka Ọ naesi n’osimiri ahụ naarịgopụta, Eluigwe mehere, Mmụọ Nsọ nke Chineke rịdatara dịka nduru, wee nọgide n’isi Ya. Otù olu sitere n’Eluigwe sị, “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.”

Ihe Jisọs dị Chineke ezimma n’ihi na Ọ naerubeisi mgbe ọ bụla. Mgbe anyị gaeguzo n’iru Chineke otù ụbọchị lee otù ọgaadị ụtọ ma ọbụrụ na Chineke gaasị anyị “Onye a bu ọkparam M’huru n’anya, onye ihe ya dim ezi nma.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ebe Jọn Onyeọwụmmiri naebi? Matiu 3:3
  2. Òlee ụdị uwe oyiyi Jọn n’eyi? Gịnị ka ọ naeri? Matiu 3:4
  3. Gịnị mere o ji biri n’ọzara?
  4. Onye bịara ka Jọn wụọ ya mmiri nke mmiri? Mak 1:9
  5. Gịnị mere Jisọs ji wụọ mmiri nke mmiri? Matiu 3:15
  6. Gịnị ka Chineke kwuru banyere Jisọs? Mak 1:11