Matiu 4:1-25; Luk 4:1-13

Lesson 17 - Elementary

Memory Verse
“Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye” (Matiu 4:10)
Notes

Jisọs nọrị náánị Ya ụbọchị irianọ. Nime ụbọchị ndịa, O nweghị nri O riri, kama O ji oge ahụ niile náekpeekpere. Ekwensu maara na Ọ nọ na ọzara, ọ nọ naekiri Ya, otú a kwa ka ọ naekiri ndị bụ ndị hụrụ Jisọs n’anya taa. Ọ maara na Jisọs bịara n’ụwa ibibi ike ekwensu na ime ụmụmmadụ ka ha dị mma dị kwa nsọ. Ekwensu chọrọ ịnọchibido Jisọs. Ọ naachọ ụzọ niile ime ka Jisọs mee mmehie.

Ekwensu maara na ike gwụrụ Jisọs, na agụụ naagụ kwa Ya. Ọ gwara Jisọs ka O mee nkume ka ọ ghọ achịcha ka O rie. Ọ dịịrị Jisọs mfe ime ya, ma Ọ gaghị alụọlụ ebube iji mee ihe ekwensu naachọ. Jisọs sitere n’Akwụkwọnsọ zaghachi ekwensu, “Ọ bughi nánị achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n’ọnụ Chineke puta” Ọ naadị mma ịgụrụ ndị ahụ naachọ iduhie anyị ime ihe ọjọọ amaokwu n’Okwu Chineke.

Ọzọ onyeọjọọ ahụ kuuru Jisọs jee n’Ụlọukwuu dị elu na Jerusalem. Ekwensu gwara Jisọs ka Ọ tụda Onweya n’ala. Ọ gwa Ya na Chineke gaezite ndị Mmụọozi Ya ka ha lekọta Ya na Ọ gaghị emerụ arụ.

Jisọs maara na ọ dịghị mma mmadụ itinye onweya n’nsogbu náenweghị isi. Chineke gaelekọta anyị ma anyị nwee nsogbu, ma ọ chọrọ ka anyị lezieanya.

Ike adịghị agwụ ekwensu. Ọ bụrụ na ọ gaghị enweta mmadụ n’ụzọ a, ọ nwaa ụzọ ọzọ. Ugbu a ekwensu buuru Jisọs jee ugwu dị oké elu. Jisọs nwereike ịhụ ụwa niile. Ekwensu sịrị, “M’gaenye gị ala niile ndịa ya na ọtụtụ akụnaụba nke ọlaọcha na ọlaedo ọ bụrụ náánị na ị ga ada n’ala wee kpọ isiala nyem.”

Ọ bụghị ekwensu nwe ala ahụ niile na akụnaụba niile nke ụwa a, ọ bụ Chineke nwe ha. Ọzọ kwa Jisọs zara site na Akwụkwọ nsọ, “Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka ị gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nánị Ya ka ị gēkpere. Gam n’azụ Ekwensu.” Ihe ọ bụla ekwensu kwuru, Jisọs egeghị ya ntị.

Mgbe ụfọdụ ekwensu naabịakute anyị, naagbalị ime ka anyị kwenye ime iheọjọọ naekwe mkwa na, iheọjọọ ahụ gaamụtara anyị oké uru. Anyị enweghị ike iji anya anụarụ anyị hụ ya, ma anyị nwere ike ịmata mgbe ọ nọ gburugburu anyị. Ọ dị mkpa na anyị naekpeekpere kwa ụbọchị na agwa Jisọs ka O nyere anyị aka ịza “É-è” mgbe ọ bụla ekwensụ naanwa anyị ime iheọjọọ. Jisọs naege ntị, ma dị kwa njikere inyere anyị aka.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ogologo oge Jisọs nọrọ n’ọzara? Matiu 4:2.
  2. Gịnị ka O mere mgbe Ọ nọ n’ebe ahụ? Matiu 4:1
  3. Ònye nwara Jisọs ka O mee iheọjọọ? Matiu 4:1
  4. Gịnị ka Jisọs ji merie ya?
  5. Gịnị dị mkpà ka anyị mee mgbe ekwensu naachọ ịnwa anyị ka anyị mee iheọjọọ?