Matiu 5:1-48; 6:9-13

Lesson 18 - Elementary

Memory Verse
“Unu onwe-unu bu ìhè nka uwa” (Matiu 5:14).
Notes

Ọtụtụ ụmụmmadụ anụwo ihe banyere Jisọs na O nwere ike ịgwọ ndị ọrịa. Ọtụtụ ndị ụfọdụ anụwo na Ọ naeme ọtụtụ ihe ịtụn’anya dị icheiche. Nke a mere ọtụtụ mmadụ naeso Ya ụbọchị niile naachọ ịnụ okwu Ya. O nwere ike Jisọs rigoro n’elu ugwu ime ka ọtụtụ mmadụ nụ olu Ya. Ọ chọrọ ikụziri ndị naesoụzọ Ya ihe dị icheiche ha kwesịrị ịma, ka ha nwe ike kụziere ụmụmmadụ ndịọzọ. Ọ nọdụrụ ala wee malite ikwuru ha okwu.

Nime ọtụtụ ihe dị icheiche Jisọs kụziiri ndị ahụ bụ, Chineke gaagọzi ndị naachọ Ya maka enyemaka, náekwenye na Chineke pụrụ ime ihe ọ bụla nkeọma karịa mmadụ ọ bụla. Chineke ga egosi ha otú ha ga esi jee Eluigwe.

Ọ sị na Chineke ga agọzi ndị naagbalịsiike ime ihe Chineke chọrọ ka ha mee, ndị nwere ntachiobi na obiọma, ma naenyere ndị chọrọ enyemaka aka. Ọ gwara ha ọzọ na Chineke ga agọzi ndị obi ha dị ọcha náenweghị mmehie. O kwuru na Chineke ga agọzi ndị náejighị ire ha kwuookwu ọjọọ, ndị náadịghị ekwuokwu ụgha na ndị naadịghị achọ ihe nke onweha náánị.

Ndị naesoụzọ ahụ gwara Jisọs ka Ọ zụkiere ha otù esi ekpeekpere, O wee nye ha ekpere kachasị mma – Ekpere nwere ihe niile nime ya nke ụmụmmadụ naachọ - Ekpere nke Onyenweanyị. (Matiu 6:9-13).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú anyị gaesi abụ “ihe naenwuenwu” nye Jisọs? Matiu 5:16
  2. Onye ọ bụla nke naeweiwe megide nwanne nwoke ya ọ pụrụ inata ihe n’aka Chineke? Matiu 5:22
  3. Ọ dị mma iji iheọjọọ kwụghachị iheọjọọ?Matiu 5:44
  4. Òlee otú anyị sị gosi ndị naeme iheọjọọ na ọdịghị mma ime otú ahụ?
  5. Ànyị kwesịrị inyere ndị nọ na mkpa aka? Matiu 5:42.