I Samuel 1:9-28; 2 Ndi-Eze 4:8-37; Luk 1:26-33

Lesson 19 - Elementary

Memory Verse
“Umu, nāñanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi” (Ndị Efesọs 6:1)
Notes

Ọtụtụ arọ garaaga, ọ dị otù nwanyị n’Israel anaakpọ Hana. Di ya hụrụ ya n’anya, ma naagbanyeghị nke ahụ o nweghị obiụtọ. O nweghị obiụtọ n’ihi na o nweghị nwa nwoke o nwere ike ịhụn’anya ma lekọta.

Nime oge a niile, obi ya naachọsiike inwe nwa nke aka ya, ma o nweghị ma otù.

Na mbụ, chọọchị adịghị n’obodo ọ bụla dịka ọ dị taa, n’ihi nka Hana na di ya naesi n’obodo ha pụọ jee Shailo ife òfùfè n’Ụlọukwuu.

Otù arọ, Hana kpebiri ikpere Chineke ka O nye ya nwa. Ọ maara na Chineke chọrọ ka ọ rịọ. Otù ụbọchị, mgbe ọ nọ n’Ụlọukwu ọ malitere ikpeekpere. O kpesiri ekpere ike. Adịghị anụ olu ya. Ma o kpereekpere site n’obi ya, náánị egbugbere ọnụ ya n’emegharị. Chineke naaza ekpere ọbụná mgbe ekpere ya n’ịnọ duu.

Ọ kpere ka Chineke nye ya nwa. O kwere mkwa na ọ bụrụ na Chineke nye ya nwa na ya ga ahụ ya n’anya ma lekọtakwa ya. O kwere mkwa ịnye Chineke nwa ahụ ka ọ lụọrọ Ya ọlụ.

Ugbu a Hana enweghị kwa obi mgbarụ, o kpewo ekpere ma kwere na Chineke gaaza ekpere ya. Chineke nụrụ. Chineke nyere ya nwa nwoke maramma.

Obi tọrọ Hana ụtọ, ọ kpọrọ aha ya Samuel, nke pụtara arịọtaram ya n’aka Onyenweanyị.

Hana hụrụ Samuel n’anya, ma náelekọta ya ụbọchị niile, otù ahụ nne nke gị ji elekọta gi. O chetara mkwa o kwere Chineke. Mgbe ọ hụrụ na Samuel abụrụwo nwaokoro nta, o duru ya jee n’ụlọ Chineke na Shailo. N’ebe ahụ ezi onye nchụàjà ahụ gaakụziri ya Okwu Chineke.

Hana hụrụ Samuel n’anya, Ọ bụ ihe siiri ya ike ịsị nwa ya nọdụ nkeọme mgbe ọ naachọ ịlaghachi n’ụlọ ya, ma obi dị ya ụtọ n’ihi na o mezuru mkwa o kwere Onyenweanyị. Obi dị Hana ụtọ na o nwetara Samuel. Obi ọ dị mama gị ụtọ na o nwetara gị?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere obi ji jọọ Hana njọ? 1 Samuel 1:6, 7
  2. Ugbo ole ka Hana na di ya naaga n’Ụlọukwuu ife òfùfè nime otù arọ? 1 Samuel 1:3
  3. Gịnị ka Hana rịọrọ n’aka Chineke? 1Samuel 1:11
  4. Àzara ekpere ya? N’ụzọ dị añaa? 1 Samuel 1:20
  5. Gịnị bụ mkwa o kwere Chineke? 1 Samuel 1:11
  6. Gịnị ka eji zụkiere Samuel ihe n’Ụlọukwu?