Matiu 9:18-31; Luk 7:12-15; Mak 2: 1-11

Lesson 20 - Elementary

Memory Verse
“Mu onwem gābia me ka aru di ya ike” (Matiu 8:7)
Notes

Ọ dị otù nwoke arụ naadịghịike onye nọ nso obodo ahụ ebe Jisọs naebi. O nweghị ike ijéijè. Ọ dị ka agaasị na ọ pụghị kwa ijéijè ọzọ na ndụ ya niile.

Jisọs na agagharị n’ebe niile site n’otù ebe jee n’ebe ọzọ ikwusa okwu Chineke na ịgwọ ndị ọrịa. Otù ụbọchị Jisọs gara n’obodo ahụ ebe nwoke a nọ.

Ụfọdụ nime ndị enyi nwoke a arụ naadịghị ike nụrụ banyere Jisọs. Ha sịrịtara onweha, ka anyị buru enyi anyị jekuru Jisọs. Jisos nwere ike ịgwọ ya. Ha ji àkwà ebe ndina ya wee buru ya

Mgbe ezi ndị enyi a bịara n’ụlọ ebe Jisọs nọ, ụlọ ahụ jupụtara na mmadụ nke na o nweghị oghere ịba n’ime. Ha chee n’obi ha. “Gịnị ka anyị gaeme?” Obi siri ha ike. Ha chọrọ ụzọ ha gaesi nweta Jisọs n’ihi na nwoke ahụ arụ naadịghị ike chọrọ enyemaka. Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ inyere ya aka ma ewezuga Jisọs.

Échìchè wee bata nime ha. Ebuuru nwoke ahụ jee n’elu ụlọ. Ekpupụrụ eluụlọ ahụ. E ji ụdọ kee n’àkwà ahụ onye ahụ arụ naadịghị ike dina, wee buda ya n’ebe Jisọs nọ. Jisọs maara na ndị enyi anọ a nwere okwukwe naaga agwọ enyi ha. Ọ bụ ihe ọñụ nye Jisọs inyere nwoke ahụ arụ naadịghị ike aka.

Ihe kachasị mkpà nye anyị n’ụwa a bụ ka agbaghara anyị mmehie anyị niile. N’ihi nka Jisọs gwara ya, agbagharala gị mmehie gị niile. Jisọs tụgharịa ọzọ n’ebe nwoke ahụ arụ naadịghị ike nọ wee sị. “Bilie, chiri ute-gi, jegharia kwa.”

Ngwangwa nwoke ahụ guzoro n’ụkwụ ya, chịkọta ute ya, wee malite ijéijè. Arụ sịrị ya ike o wee náañụrịọñọ.

Ndị enyi ya nwere iruọma na obiike mgbe ha naenweghị ike ijeru Jisọs na mbụ. Ụzọ ahụ esi ejekuru Jisọs naeghereoghe mgbe ọ bụla. Ọ nọ ebe a mgbe ọ bụla ma dị kwa njikere inyere anyị aka.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ụdị ọrịa naarịa nwoke ahụ? Mak 2:3
  2. Ònye bịara n’obodo ahụ ebe nwoke ahụ arụ náadịghị ike bi? Mak 2:5
  3. Ọ dị mfe ibute nwoke ahụ arụ naadịghịike n’ebe Jisọs nọ mgbe ahụ? Gịnị mere? Mak 2:4
  4. Gịnị ka ha mere? Mak 2:4
  5. Gịnị bụ ihe mbụ Jisọs meere Nwoke ahụ arụ naadịghịike? Mak 2:11
  6. Gịnị bụ ihe nke abụọ Jisọs meere ya? Mak 2:11
  7. Gịnị ka nwoke ahụ mere mgbe Jisọs kwusịrị okwu? Mak 2:12