Jọn 6:1-13

Lesson 21 - Elementary

Memory Verse
“O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ” (Luk 1:53)
Notes

Ọtụtụ ụmụmmadụ sooro Jisọs jee ebe ọ bụla Ọ naeje. Otù ụbọchị, Jisọs chọrọ ịnọ náánị Ya na ndị naesoụzọ Ya ka O wee gwa ha okwu.

Jisọs na ndị enyi Ya bara n’ụgbọ mmiri, wee gafee akụkụ osimiri nke ọzọ. Ebe ahụ ha chèrè na ha gaanọ náánị n’onweha.

Mmadụ olenaole matara ebe Jisọs gara, akụkọ ebe aga enweta Ya wee gbasaa ebe niile. Mgbe Jisọs si n’ụgbọ ridaa ọtụtụ mmadụ anọrọla náeche Ya, ma ọtụtụ ndịọzọ ka naabịa. Jisọs ezilagaghị ígwè mmadụ ahụ. O nwere ọmiko n’arụ ha n’ihi na Ọ matara na ha chọrọ ịnụ Okwu Chineke ma o nweghị onye ọzọ gaakụziri ha ma ewezuga Jisọs.

Jisọs kụziiri ha ihe n’ehihie ahụ niile. O ruela uhuruchi, ọchịchịrị naachọ ịgbachi. Ndị naesoụzọ Ya wee nọọ naamaghị ihe ha gaeme. Ha chéré na ozuwo, ka Jisọs zipụ ndị ahụ ka ha jee zụrụ nri n’obodo ukwu na nke nta nọ gburugburu ebe ahụ.

N’etiti igwèmmadụ ahụ ọ dị otù nwata nwere ogbe achịchị ise na azụ abụọ. Andru gwara Jisọs maka nwa okoronta ahụ, ma Andru naeche na nri nta enweghị ihe ọ pụtara.

Jisọs gwara ndị naesoụzọ Ya ka ha mee ka ndị ahụ nọdụ ala. Jisọs gwara ndị naesoụzọ Ya ka ha mee ka ndị ahụ nọdụ ala n’ọnụ ọgụgụ n’elu ahịhịa. Jisọs na nwa okoro nta ahụ ji ọñụ nyefee nri Ya guzoro, O nwereike ịbụ na agụ naagụ ya mgbe ahụ.

Jisọs kpereekpere, ma malite ịnyawa achịcha ahụ. Otù mgbe ahụ ka enwere ọtụtụ ogbeachịcha. Otú ahụ kwa ka o mere azụ abụọ ahụ. Ndị naesoụzọ Ya ji nkata kee nri ahụ n’etiti ndị ahụ ka ha rie.

Mgbe ha rijusịrị afọ, o wee fọdụ nkata irinaabụọ. Jisọs achọghị ka ihe ọ bụla laa n’iyi. Jisọs gwara ndị naesoụzọ Ya ka ha chịkọta ndị fọdụrụ.

Anyị amataghị aha nwaokoro ahụ maọbụ ebe ọ n’ebi, ma n’ihi na ọ rapụrụ ihe niile o nwere nye Jisọs naagbanyeghị na ọ dị ntakịrị, Jisọs ji onyinye ya wee lụọọlụ ebube n’ịzụ puku mmadụ ise (5,000) nri.

Aha anyị enweghị ihe ọ pụtara ọ bụ omume anyị ka anagụkọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ebee ka Jisọs na ndị enyi Ya gara ịnọdụrụ onweha? Jọn 6:1
  2. Site n’oge dị añaa ka Jisọs nọ náakụziri ha ihe?
  3. Gịnị ka nwaokoro nta ahụ nwere iri? Jọn 6:9
  4. Mmadụ ole ka Jisọs ji ya zụọ? Jọn 6:10
  5. Gịnị ka Jisọs mere tupu O nye ndị ahụ nri? Jọn 6:11
  6. Nkata ole fọdụrụ? Jọn 6:13