Ọpupu 2:1-10

Lesson 22 - Elementary

Memory Verse
“Ọ bu Mu onwem rọputara unu” (Jọn 15:16)
Notes

Josef na nna ya nọrọ arọ iri na asaa tupu akpọọ nna ya ịjekuru Chineke. Mgbe Jekob nwụsịrị, Josef agbanweghị omume ya n’ebe ụmụnne ya nọ. Ọ ka naahụkwa ha n’anya. Ọ bụ ezie na ha mesoro ya omume ọjọọ, ma ọ gbagharala ha kpamkpam.

Mgbe ọtụtụ arọ gasịrị, ezi eze ahụ nke maara Josef nwụrụ, eze ọzọ wee náachị. Josef n’onweya kwa agala n’ebe Chineke nọ. Eze ọhụụ ahụ enweghị ịhụn’anya Chineke nime obi ya, ọ maghị kwanụ otù esi enwe obi ekele.

Ọ gwara ndị ọlụ ya ka ha mee ka ndị Israel naalụsiọlụ ike na nke a gaeme ka ike gwụsịa ha, ha ewe naarịa ọrịa ọtụtụ n’ime ha ewe nwụọ. Ọ gwakwara ha ka ha gbusịa ụmụntakịrị ha ndị nwoke. Ọ bụ n’oge dị ugbu a ka amụrụ Moses. Nne ya wee zobe ya ọnwa atọ.

Eze a mere ka ụmụ Israel taa ahụhụ nke ukwuu. Ma Chineke hụrụ ha n’anya. O wee hụ ihe isiike ha. Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke n’anya, Ọ gaenyere anyị aka imeri ihe isiike anyị niile. Nne Moses tinyere ya na nkata, wee dota ya n’akụkụ mmiri; Nwanne ya nwanyị guzoro n’ebe dị anya. Ma Chineke chebere nwantà ahụ.

Mgbe nwa nwanyị Fero bịara na mmiri, ọ hụrụ nwa ahụ wee kuru ya. Nwanne Moses nke nwanyị jere kpọọ nne ya ka o nyere nwa nwanyị Fero aka ilekọta nwa ahụ. Otú a ka Chineke si chebe Moses. Mgbe arọ olenaole gasịrị akpọtara Moses n’obí eze, ma o doro anyị anya na nne Moses kụziri ya Okwu Chineke mgbe ya na Moses nọ. Moses achọghị ife arụsị dịka ndị Ijipt. O nwere ịhụn’anya Chineke nime obi ya.

Chineke nwere ọlụ dị ukwuu Moses gaalụ mgbe o mere okenye. Chineke chọrọ ka nwatakịrị ọ bụla lụọrọ Ya ọlụ. Ọ naadị mma ịmalte na nwanta lụọrọ Chineke ọlụ, ma nwee ọtụtụ arọ iji lụọrọ Ya ọlụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ihe dịka arọ ole ka nne Moses zobere ya tupu ekuru ya jee n’akụkụ osimiri? Ọpụpụ 2:2
  2. Ònye guzoro n’ebe dị anya náelegide ya anya? Ọpụpụ 2:4
  3. Onye ka akpọrọ ka o lekọta Moses? Ọpụpu 2:8
  4. Chineke Ọ hụrụ nwa ahụ nime nkata?
  5. Chineke Ọ chọrọ ka ụmụntakịrị site na nwata jeere Ya ozi?