Ọpupu 11:1-10; 12:1-51

Lesson 23 - Elementary

Memory Verse
“Anya abua nke Onye-nwe-ayi di n’aru ndi ezi omume” (I Pita 3:12)
Notes

Ụmụnne Josef hụrụ ahụhụ n’ebe ọ dị ukwuu, ma Chineke hụrụ ahụhụ ha, ma nụ kwa isụ ude ha.

Eze ndị Ijipt ahụ ekweghị ka ha laa n’ihi na ha naakpụrụ ya brick. Na mbụ anaenye ha okporoọka anaetinye na brick ahụ, ma ugbu a anaghị enyekwa ha okporoọka, anaeti ha ihe mee ha ka ha kpụọ ọtụtụ brick dịka ha na akpụ na mbụ.

Nwanta ahụ nọ nime nkata n’akụkụ osimiri a bụrụwo nwoke toroetó, ma site kwa n’ụlọ eze pụọ. Ọ nọ ebe dị anya ma Chineke maara ebe ọ nọ, wee kpọọ ya ka ọ bịa n’Ijipt nyere ndị ya aka. Chineke nyere Moses na Eron ike ịlụọlụ ebube, ka ndị mmadụ wee mata ezi Chineke.

Mmiri ndị Ijipt tụgharịrị ghọọ ọbara, awọ, anwụnta na ọtụtụ ihe otiti ndịọzọ eziteere ha, ma náagbanyeghị nke a ekweghị ka ụmụ Israel laa.

Chineke gwara Moses ka ọ gwa ụmụ Israel ka ha weta nwaatụrụ maọbụ ewu dota ya abalị anọ, mgbe ahụ ha ga egbu ya ma rụọ ya n’ọkụ. Ha gaewere ụfọdụ nime ọbara ya tee n’awara ụzọ nke ụlọ ha na n’ọfiere elu ụzọ ha niile. Mgbe mmụọozi gaagafe n’ala ahụ igbu ụmụ nwoke mbụ ebuụzọ mụ n’ala Ijipt, ọ gaghị eme ka ụmụ mbụ ebuụzọ mụ n’Israel ndị tinyere ọbara n’elu awara ụzọ ha nwụọ. Nka naatụ aka mgbe n’iru maka Ọbara Jisọs nke Ọ naaga ịwụsị n’ihi anyị.

Ndị Ijipt etinyeghị ọbara ahụ n’awara ụzọ ha n’ihi na ha enweghị ịhụn’anya nke Chineke n’obi ha. Ụmụ nwoke ha niile ebu ụzọ mụ nwụrụ.

Ugbu a eze ahụ kwetara ka ha laa. Ọ matala na obi adịghị Chineke mma n’ihe ndị ahụ ọ naeme.

Moses duru ndị ahụ jee n’ala ahụ nke Chineke kwere na mkwa. Obi dị ha ụtọ na ha rubeere Chineke isi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Chineke kwuru na ọ gaeme n’etiti abalị? Ọpupu 11:4, 5.
  2. Òle ụdị nwaatụrụ ha kwesịrị igbu? Ọpupu 12:5
  3. Gịnị ka ha gaeji ọbara ya mee? Ọpupu 12:7
  4. Ụmụ Israel o rubereisi nye iwu Moses? Ọpupu 12:28
  5. Eze o kwetara ugbu a na ha ga ala? Ọpupu 12:31.