Ọpupu 14:1-31

Lesson 24 - Elementary

Memory Verse
“Ka obi unu-ghara ilọ miri” (Jọn 14:1)
Notes

Mgbe Chineke gwara ụmụ Israel ka ahụ si n’Ijipt pụta, O sooro ha jee ka O wee lekọta ha. O ji ogidi igweoji due ha n’ehihie na ogidi ọkụ n’abalị.

Chineke nyere ha ya ka ọ naedu ha. Ọ bụrụ na anyị jee n’ụzọ Chineke naagwa anyị ka anyị jee, a gaghị eduhie anyị, anyị agaghị adaba nime nsogbu dị icheiche. Ọ dị mma iso Chineke jéijè.

Fero ahụghị Chineke n’anya. Ọ chọghị ka ụmụ Israel laa ọzọ. Ọ kpọọrọ ọtụtụ ndị agha ya ka ọ kpọghachi ụmụ Israel azụ.

Egwu tụrụ ha mgbe ha hụrụ ndị agha Ijipt. Ọ dị osimiri di ha n’iru, ma ndị iro ha nọ ha n’azụ, ha wee tikuo Onyenweanyị. Moses gwara ha ka ha ghara ịtụ egwu.

Chineke nyere Moses ike ime ọtụtụ ihe ukwu dị icheiche. O weliri mkpan’aka ya, mmiri ahụ wee guzo iche. Ndị Israel wee gabiga n’ala akọrọ. Ogidi igweoji ahụ bụ ìhè nye ụmụ Israel, ma bụrụ ọchịchịrị nye ndị iro ha.

Ndị agha nke Ijipt ahụ lara n’iyi n’ime osimiri Uhie n’ihi na ha ahụghị Chineke n’anya. Obi nke ndị Israel niile wee jupụta n’ekele nye Chineke.

Ha matara na Chineke nọnyeere Moses, ha wee rubere ya isi. Ha matara na ọ dị mma ime ihe ọ bụla Moses gwara ha, n’ihi na ọ bụ Chineke naedu ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ihe àmà Onyenweanyị nyere ndị ahụ iji zi ha ụzọ? Ọpupu 13:21, 22
  2. Gịnị ka Moses mere mmiri ahụ ji kewaa? Ọpupu 14:21
  3. Gịnị mere ndị Ijipt n’etiti osimiri ahụ? 14:25
  4. Gịnị ka Moses mere mgbe ahụ? 14:27
  5. Onye mere ụzọ ala akọrọ ahụ n’etiti osimiri ahụ? Ọpupu 14:30