Ọpupu 16:1-36

Lesson 25 - Elementary

Memory Verse
“Ọ buru na unu gāriọm ihe ọ bula n’aham, nke ahu ka M’gēme” (Jọn 14:14)
Notes

Moses na ndị ya agabigala osimiri Uhie naenweghị ihe ọghọm. Obi ha jupụtara n’ekele nye Chineke n’ihi na O chebere ha ma napụta ha site n’aka ndị Ijipt. Gịnị ka ichere na ha mere? Ha bụrụ abụ ekele na otuto nye Chineke.

Mgbe ha jere ije abalị atọ naenweghị mmiri ha gaañụ, akpịrị malitere ịkpọ ha nkụ. Ha wee tamuo. Ha bịaruo ebe ọzọ ebe enwere mmiri ma ọ dị ilu. Ha tamuo ọzọ wee nwe mwuta. Ọ dị mma ka anyị kpeere Chineke mgbe anyị nwere nsogbu kama ịna atamu. Chineke nwere obi ebere n’arụ ha wee mee ka mmiri ilu ahụ dị ụtọ.

Ọ bụ ihe dị mma ịna echeta ịdịmma nke Chineke oge ọ bụla. Ha chefuru ịdịmma nke Chineke ha nwetara. Ha malitere ịtamu ọzọ na ha enweghị ihe oriri ha gaeri. Chineke nụrụ ha ma kwe mkwa izodatara ha nri site n’eluigwe.

Chineke mezuru mkwa Ya. O si n’eluigwe zodatara ha nri anaakpọ manna kwa ụbọchị. Chineke chọrọ ka ha na atụkwasị Ya obi kwa ụbọchị. Otù a ka Chineke si náezitara ha nri iri ụbọchị anọ. Agụụ agụghị ha maọlị. Chineke nyere ha ume na ike iji jeéijè n’ụzọ ahụ O du ha náejé.

Chineke gwara ha ka ha dota ntakịrị n’ime nri ahụ, ka ụmụntakịrị ha wee mara ụdị nri Chineke ji zụọ ha ichetara ha maka ịdịmma na ebere na ike nke Chineke ilekọta ha ebe ọ bụla.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye ka ndị Israel tamuru megide? Ọpupu 16:8
  2. Chineke Ọ chọrọ ka anyị na atmuntamu? Phillipians 2:14
  3. Òlee ụdị nri eziteere ha? Ọpupu 16:13, 31
  4. Afọ òle ka ndị ahụ riri manna ahụ? Ọpupu 16:35