Ọpupu 17:1-16

Lesson 26 - Elementary

Memory Verse
“Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ñua miri” (Jọn 7:37)
Notes

Dịka Chineke lekọtara ndị Israel anya nkeọma mgbe ha nọ n’ụzọ ijè ịjéru ala mkwa ahụ ọ dị ka ha naechefu ịdịmma nke Chineke mgbe ha nwere nsogbu.

Chineke jiri ogidi igweoji náedu ha n’oge ehihie na ogidi ọkụ n’abalị. Mgbe ha nwetara mmiri dị ilu ha gaañụ, Chineke mere ya ka ọ dị ụtọ; na mgbe agụụ gụrụ ha Chinke nyere ha nri dị ụtọ ka ha rie.

Lee otú ọ gaadịrị ha rị mma, ma ọ bụrụ na ha gụkọrọ ngọzi ha niile dị icheiche, wee nwee obi ekele nye Chineke oge niile!

Ugbu a akpịrị na akpọ ha na anụụlọ ha nkụ. Ọ dịghị mmiri ha gaañụ. Ha echefuwo na ọ dị mgbe Chineke nyere ha mmiri ka ha ñụọ. Ha malite ịtamuntamu. Onyenweanyị ahụ nke náedu ha jee ala mkwà ahụ bụrịị Onye ha naatamu megide, ọ bụghị Moses. Chineke matara nsogbu niile dị n’ụzọ ahụ, ma nwee kwa ike ime ka ha merie ha niile ma ọ bụrụ na ha gaenwe ike tụkwasị Ya obi.

Chineke kwesịrị inye ha ahụhụ, ma O nwere obi ebere n’ebe ha nọ. O nyere Moses iwu ka o tie oké nkume ahụ mkpan’aka ya, ndị ahụ wee nwee mmiri ọñụñụ n’ebe ọ dị ukwu. Chineke naenye anyị ihe niile kachasị mma mgbe ọ bụla.

Ọ bụ náánị Chineke nwere ike ime ka mmiri si n’oké nkume pụta, ọ dịghị ihe Chineke naapụghị ime. Ha kwesịrịrịị ịtụkwasị Chineke obi wee ghara ịtamu. Mgbe ha naatamu ha naatamu megide Chineke ahụ Onye meere ha ọtụtụ ọlụebube ukwu dị icheiche. Ha kwesịrị ịna ekele Chineke onye naechebe ha n’oge mkpa na n’oge ihe isiike dị icheiche.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere ndị Israel ji tamuo? Ọpupu 17:3
  2. Ntamu ha ọ dị Onyenweanyị mma? Abù Ọma 78: 18-21
  3. Gịnị ka Chineke nyere Moses iwu ka o mee? Ọpupu 17:5, 6
  4. Ònye wepụtara mmiri site n’oké nkume ahụ? Ọpupu 17:5, 6
  5. Ònye mere ka aka Moses guzoro? Ọpupu 17:12