Matiu 8:24-27; 4:18-22; Luk 5:1-11

Lesson 27 - Elementary

Memory Verse
“Bianu som n’azu, M’gēme unu ndi-Ọkù nākuta madu” (Matiu 4:19)
Notes

Anyị agaghị echefu osimiri Galili n’ihi na Jisọs naeje ebe ahụ mgbe ọ bụla. Ọ na anọ naekiri ndị ọkụazụ dịka ha naeji ụgbụ ha náewude azụ pụta n’osimiri ahụ. Otù oge Jisọs gwara ndị naesoụzọ Ya ka ha tinye nkò ha nime ọsimiri. Ọ gwara ha na ha gaahụ ego n’ọnụ azụ nke gaebu ụzọ pụta. Ọ bụghị n’ọnụ azụ niile ka anyị nwere ike inweta ego. Ọ bụ náánị Jisọs pụrụ itinye ego ebe ahụ ma ọ bụrụ na Ọ chọrọ ime otú ahụ.

Ọ bụghị azụ niile dị mma oriri. A naatufu azụ nke naadịghị mma. N’ụwa anyị nwere ụmụmmadụ ndị dị mma na ndị ọjọọ Ndị mmadụ ahụ ndị dị mma ndị hụrụ Jisọs n’anya gaejé eluigwe ma ndị ọjọọ gaejé ebe ahụ ebe aga enye ha ahụhụ rue ebighịebi n’ihi ajọ omume ha.

Ọ bụ na osimiri Galili ka Jisọs kpọrọ Pita na Andru ka ha soo Ya. Ọ chọrọ ime ha ndị ọkụ naakụta mmadụ ka ha wee nweeike ije kwusaara ụmụmmadụ ka ha rapụ mmehie ha niile ka ha wee jee Eluigwe.

Ọ kpọkwara Jemes na Jọn. Ha niile ji obi ha niile soro Jisọs. Ọ na atọ Jisọs ụtọ ma anyị soo Ya mgbe Ọ kpọrọ anyị. Ọ bụ n’ebe a ka Jisọs nyere Pita iwu ka o nupụ ụgbọ ya baa nime osimiri ka o wee nwude azụ. O rubereisi wee nwude ọtụtụ azụ dị icheiche. O nwere ọtụtụ azụ dị icheiche ọ nwudere n’ihi na o rubeere Jisọs isi.

Osimiri nke Galili ahụ dị obosara na ezi ogologo, mgbe ụfọdụ o naenwe ebilimmiri. Otù ụbọchị mgbe Jisọs na ndị náesoụzọ Ya naagafe osimiri a, ebilimmiri biliri wee kpuchie ụgbọ ha. Jisọs naalụsiọlụ ike. Ọ na ekwusa oziọma, náakụzi, náagwọ kwa ọrịa. Ike naagwụ Jisọs dịka anyị. Ike gwụrụ Ya O wee rarụụra. Ndị náesoụzọ Ya bịakutere Ya náagwa Ya, “Onye-nwe-ayị zọputa ayi; ayi nāla n’iyi” Anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụrụ na Jisọs nọnyere anyị. Ngwangwa mgbe ndị naesoụzọ Ya bịakutere Ya, Ọ baara oké ifufe ahụ mba, oké ndajụ wee dị. Ibobo wee nwụọ ndị naesoụzọ Ya n’arụ.

Mgbe Ya na ha nọsịrị ha wee mata na O nwere ike ịkpọte onye nwụrụanwụ, gwọọ onye ọrịa, na O nwere ike ime ka ebilimmiri dajụọ. O nwere ike kachasị ihe niile. Ha matakwara na Ọ bụ Ọkpara Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Jisọs naeme mgbe ebilimmiri ahụ biliri? (Matiu 8:24)
  2. Ònye mere ka ebilimmiri ahụ dajụọ? (Matiu 8:24)
  3. Gịnị ka ndị ahụ gwara Jisọs? (Matiu 8:27)
  4. O nwere ihe ọ bụla nke Jisọs náapụghị ime? (Matiu 28:18)
  5. Pita o rubereisi mgbe Jisọs gwara ya ka o nupụ ụgbụ ya baa nime mmiri. (Luk 5:5).