Jọn 2:1-16; 4:46-54

Lesson 28 - Elementary

Memory Verse
“Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya” (Jọn 2:5).
Notes

Jisọs jekuuru Jọn ka awụọ Ya mmiri. Jọn wụrụ Ya mmiri. Jisọs chọrọ irubere Okwu Chineke niile isi. Ihe Ya tọrọ Chineke ụtọ nke ukwuu; n’otù aka ahụ ihe onye bụla nke hụrụ Chineke n’anya ma náerubere Ya isi na atọ Ya ụtọ. Jisọs naeme ihe niile Chineke nyere n’iwu oge ọ bụla.

Jisọs naachọ inyere anyị aka na ịnọnyere anyị mgbe ọ bụla maọbụ n’oge arụọkụ, oge ọñụ maọbụ na nsogbu. Ọ bịara n’ụwa inye anyị ọñụ mgbe niile ebighịebi. Ndị hụrụ Jisọs n’anya ma naerubere Ya isi naenwe ọñụ mgbe ọ bụla. Chineke nyere anyị mbara igwe maramma, osisi náamị mkpụrụ, akwụkwọ ndụ, okoko náesiisì ụtọ na nnụnụ dị icheiche náabụ abụ ụtọ dị icheiche. O nyere anyị ihe ndịa iji mee ka obi dị anyị mma.

Tinyere ndị nnenanna anyị ndị hụrụ anyị n’anya na ụmụnne anyị, Chineke nyere anyị ezi ndị enyi. Anyị niile n’otù n’otù chọrọ inwe enyi nwereike iguzonyere anyị n’oge ọñụ na n’oge nsogbu. Baịbụl naagwa anyị na Jisọs nwekwara ndị enyi ndị bụụrụ Ya ihe oké ọnụahịa. O nweghị ụlọ nke aka Ya, ma akwụkwọnsọ naagwa anyị na Ọ naeje n’ụlọ ndị enyi Ya, Meri, Mata na Lazarọs izuike. Ndịọzọ nnakpọ Ya ka Ọ bịa soro ha rie ihe n’ụlọ ha. Ọ naeje ka O wee nwee ike ikwuru ha Okwu Chineke.

Otù oge akpọrọ Ya n’ọlụlụnwunye na Kena nke Galili. Kena adịghị anya site n’obodo Ya. Ụmụnne Jisọs na ndị naesoụzọ Ya nọkwa n’ebe ahụ. Tupu ememe ahụ naabịa na njedebe mmanyavine ha gwụrụ. Nne Jisọs bịara gwa Ya ka O nye ndị ahụ mmanyavine ka ha ñụọ. Anyị niile hụrụ mmanya kokakola dị ka mmanyavine n’anya. Chineke enyewo anyị ezi iheọñụñụ, ma ndị mmadụ naemebi ya mgbe ha naatụgharị ya ka ọ ghọọ mmanya naaba n’anya.

Meri gwara ndịozi ahụ ka ha mee ihe ọ bụla Jisọs gwara ha mee. Meri maara na Jisọs nwere ike ime ihe niile. Anyị ga naeme ihe ọ bụla Jisọs nyere anyị iwu, ka anyị mee ya ngwangwa Ọ naagwa anyị ka anyị mee ya. Ha gbajuru ite ndị ahụ na mmiri. Jisọs gbanwere ya ka ọ ghọọ mmanyavine dị ụtọ. Ihe ọ bụla Jisọs mere naadị mma nke ukwuu. Nke a bụ ọlụ ebube mbụ nke Jisọs mere nke O ji gosi ndị naesoụzọ Ya na ndị enyi Ya na O nwere ike ukwuu karịsịa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Meri gwara ndị orù ahụ? Jọn 2:5
  2. Ndị oru ahụ ọ matara onye tụgharịrị mmiri ahụ ka ọghọọ mmanyavine?
  3. Mmanyavine ahụ Jisọs mere ọ dị mma? Jọn 2:9
  4. Gịnị ka Jisos mere ndị ahụ náere ihe nime Ụlọukwu? Jọn 2:15
  5. Gịnị ka Jisọs mere ndị ahụ náere nduru nime Ụlọukwu? Jọn 2:16