Jọn 3:1-21

Lesson 29 - Elementary

Memory Verse
“Aghaghi imu unu ọzọ” (Jọn 3:7)
Notes

Eluigwe bụ ebe maramma nke ukwu. Ọ dịghị ebe maramma dịka ya n’ụwa a. Jisọs sịrị na Ya naeje idoziri ndị hụrụ Ya n’anya ebe, ma anyị maara na ebe ọ bụla Jisos doziri gaabụ ebe kachasị mma. Ọ naadị anyị mma ma anyị na ndị bụ ezi mmadụ nọrọ, ma anyị maara na ihe kachasị mma gaabụ ka anyị na Chineke na Jisọs, ezi ndị enyi anyị n’ụwa nọkọọ n’Eluigwe. Mgbe anyị gaeru Eluigwe, anyị gaebi n’ebe ahụ ebighịebi n’ọñụ nke naenweghị ọgwụgwụ.

Jisọs bịara n’ụwa ịnwụọnwụ wee buru ahụhụ kwesịrị anyị n’Onweya, ka anyị wee dị mma ịba n’Eluigwe. Eluigwe bụ ebe dị nsọ. Ajọ ihe na omume adịghị ọcha niile enweghị ike ịba n’ebe ahụ. Ọbara Jisọs aghaghị ịsachapụ mmehie anyị dị icheiche na iheọjọọ niile site n’obi anyị tupu anyị enwe ike ịba n’Eluigwe. Eluigwe bụ ebe maramma. Eluigwe agaghị abụ ebe maramma ma ọ bụrụ na ekwe ka ndị ọjọọ baa na ya. Aghaghị ịsachapụ mmehie site n’obi ndị mmadụ tupu ha enweike iso Chineke biri n’Eluigwe.

Otù onye nkuzi kwesịrị ịma ihe ọ gaeme ka o wee dị njikere ịga Eluigwe bịakutere Jisọs. Ọ sịrị na ya matara na Jisọs bụ onye Nkuzi Chineke zitere, na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ime oké ihe ndị ahụ Jisọs naeme.

Jisọs gwara Nikọdimọs na aghaghị ịmụ mmadụ ọzọ tupu o nwe ike ịba alaeze Eluigwe. Ọ ghọtaghị ihe Jisọs kwuru, ma anyị kwere na Jisọs gwara ya na mmadụ aghaghị inwe mwuta n’ihi iheọjọọ niile ọ naeme, ihe ndị dịka izuori, ikwu ọkwuasị, ịñụiyi, ịnaeweiwe, ịkpọ ndị mmadụ asị, na iheọjọọ niile dị icheiche, ma kwe mkwa n’ọgaghị eme ha ọzọ. Ọ gaarịọ Chineke ka Ọ gbaghara ya, mgbe ahụ Chineke ga agbaghara ya wee sacha obi ya ma mee ya ka ọ dị ọcha ma náenwuenwu.

Jisọs pụrụ inye anyị obi gaahụ Ya n’anya ma kpọ kwa iheọjọọ asị. Mgbe Chineke sachapụrụ mmehie site n’obi anyị mgbe ahụ anyị a bụrụ ndị “amụrụ ọzọ.” Chineke chọrọ ka amụọ mmadụ niile ọzọ, ka azọpụta onye ọ bụla.

Jisọs bịara nime ụwa ịkụziri ụmụmmadụ otù agaesi zọpụta ha, O mere ihe niile O nwereike ime iji kụziere ụmụmmadụ otù ha gaesi nweta mgbaghara nke mmehie wee dị njikere ịjé Eluigwe soro Jisọs nọrọ n’ụlọ ahụ Ọ gara idoziri ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka anyị naaghaghị ime ka anyị wee dị njikere maka Eluigwe? Jọn 3:3
  2. Nikọdimọs ọ matara otú agaesi azọpụta ya tupu Jisọs agwa ya?
  3. Jisọs ọ chụpụtụla onye ọ bụla agụụ eziokwu naagụ obi ya?
  4. Gịnị ka Jisọs mere iji zọpụta anyị? Matiu 28:28
  5. Chineke Ọ hụrụ mmadụ niile n’anya? Jọn 3:16