Jọn 4:1-42

Lesson 30 - Elementary

Memory Verse
“Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia” (Nkpughe 22:17)
Notes

Ọ bụghị anyị niile hụtụrụworo òlùlùmmiri tupụ emepụta igwe náagbapụta mmiri (pump). Anyị bụ ndị nwere mmiri iji mee ihe n’ebe o ririnne amaghị uru ọ baara, dịka ndị bi n’ebe ọ naadịghị mfe inweta mmiri. Anyị naagụ na Baịbụl na mgbe ọ bụla Abraham bịaruru otù ebe ọ naewu ebe ịchụàjà ma gwue òlùlùmmiri. Ha abụọ dị mkpa. N’obodo ụfọdụ dị icheiche ndị mmadụ naegwu òlùlùmmiri ihe ruru nzọụkwụ iriabụọ maọbụ iriatọ n’ịdị omimi. Mgbe ahụ ha náeke ụdọ na pel iji dọlite mmiri site n’òlùlùmmiri ahụ.

Otù ụbọchị ike gwụrụ Jisọs mgbe O kwusasịrị okwu Chineke ma jee ije ogologo ụzọ dị anya. O wee cheré n’akụkụ òlùlùmmiri nke Jekob gwuru ọtụtụ arọ garaaga. Òlùlùmmiri a dị ihe dịka otù narị nzọụkwụ n’omimi ya, ọ ka dị kwa n’ebe ahụ rue taa. Ka Jisọs nọọdụ n’ebe ahụ naezuike otù nwanyị ji ite mmiri ya na pel o kere ụdọ iji dọrọ mmiri bịara. Jisọs rịọrọ ya ka o nye ya mmiri ka Ya ñụọ. Jisọs gwara ya na Ya chọrọ inye ya mmiri nke gaeme na akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ọzọ ma ọ bụrụ na Ya enye ya mmiri ahụ. Nwanyị ahụ amataghị ihe ụdị mmiri ahụ bụ. Ọ gwara Jisọs na òlùlùmmiri ahụ dị omimi na Jisọs enweghị ụdọ na pel Ọ gaeji séré mmiri site n’òlùlùmmiri ahụ. Nwanyị ahụ chọrọ ịmara otù Jisọs gaesi nye ya mmiri ka ọ ñụọ. Jisọs gwara ya na ọ bụ mgbaghara nke mmehie na ike ibi ezi ndụ ka Ọ kpọrọ “mmiri ndụ”

Ọ bụrụ na ọ ñụọ ya akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ọzọ. Mgbe ahụ ọ matara na ọ bụ Jisọs naagwa ya okwu. Nwanyị a gbara ọsọ ngwangwa baa n’obodo ịgwa ha ihe ọ hụrụ. Ndị mmadụ ahụ wee gbata izute Jisọs. Jisọs kuziiri ha ihe ndị ahụ ha kwesịrị ịma.

N’eziokwu Jisọs matararị na nwanyị ahụ gaabịa iséré mmiri n’oge ahụ, ọ bụ ya mere O ji bịa izute ya ka Ọ kụzieere ya otú ọ gaesi nweta nzọpụta. Jisọs naadị na njikere mgbe ọ bụla inyere anyị aka. Anyị ganaekele Ya ma were obi anyị niile hụ Ya n’anya. Anyị matara na nwanyị ahụ hụrụ Jisọs n’anya n’ihi ihe O meere ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Jisọs ji nọdụ ala n’òlùlùmmiri ahụ?
  2. Gịnị ka Jisọs gwara nwanyị ahụ? Jọn 4:7
  3. Nwanyị ahụ ọ matara na mbụ na ọ bụ Jisọs? Jọn 4:9
  4. Òlee ụdị “mmiri” Jisọs naekwu okwu ya? Jọn 4:10
  5. Gịnị ka nwanyị ahụ mere mgbe ọ matara Jisọs? Jọn 4:28, 29