Jenesis 1:1-31; 2:1-25; 3:1-24

Lesson 31 - Elementary

Memory Verse
“Ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya” (Jọn 1:3)
Notes

Tupu ụwa adị, tupu ihe ọ bụla adị nime ya, Chineke dịrịị. O nwere ike ime ihe niile, ihe ọ bụla O kwuru naeme. Ndị mmadụ ụfọdụ ekweghị na Chineke kèrè ụwa ma ndị kwere na Chineke na Baịbụl matara na Chineke kèrè ụwa, na kwa Jisọs na Mmụọ Nsọ nọnyeere Ya mgbe Ọ naeké ụwa.

Chineke sịrị “Ka ìhè di” ìhè wee dị. Ọ kpọrọ ìhè ahụ “Ehihie”, ma ọchịchịrị ahụ ka Ọ kpọrọ “Abalị”. N’ụbọchị nke abụọ Chineke mere mbaraigwe na igweoji nke náebu mmiri náeme ka ihe ọkụkụ puo. Chineke chịkọtara mmiri ahụ otù ebe o wee ghọọ oké osimiri, O wee doo ala akọrọ n’ọnọdụ ya. O mere ka akwụkwọ ndụ puo n’elu ala. Chineke mere ụlọ maramma nye Adam ma mmehie wetaara ya ọbụbụọnụ.

Chineke mere anwụ ka ọ naacha n’ehihie ma ọnwa na kpakpando ka ha naenye ìhè n’abalị. Mgbe Chineke mesịrị ebe mmadụ gaebi, O tinyere azụ dị icheiche n’osimiri, na nnụnụ na mbaraigwe. Mgbe ahụ Chineke kèrè mmadụ maramma wee tinye ya n’ụwa ọma ahụ O kèrè. O ji ụrọ nke ala kpụọ mmadụ ahụ wee kunye ya ume ndụ n’oghere imi ya abụọ. Ihe niile Chineke kèrè dị mma. Náánị mmadụ pụrụ ịhụ Chineke n’anya nime ihe niile O kèrè. Chineke zuruike n’ụbọchị nke asaa.

Chineke kụrụ ubi maramma n’ogige ahụ nye Adam na ndị gaeso ya nọrọ. Ha pụrụ ịnaeri mkpụrụ osisi ọ bụla n’osisi ndị ahụ ewezuga mkpụrụ osisi nke otù osisi pụrụ icheiche nke ha náagaghị emetụ aka. Chineke achọghị ka Adam nọrọ náánị ya, ya mere mgbe Adam nọ n’ụra Chineke were otù n’ime ọgịrịga ya wee mee nwanyị onye bụ nwunye nke Adam.

Ọ dị ọtụtụ anụmanụ dị icheiche n’ogige ahụ. Ọ bụ Adam nyere ha niile aha. Ọ bụghị agwọ niile nwere nsi ma ọ dị otù agwọ ọjọọ dị n’ogige ahụ. Otù ụbọchị o jekuuru Iv wee gwa ya ka o rie mkpụrụ osisi ahụ nke Chineke gwara ha ka ha ghara iri. Iv were ya ma nye kwa di ya. Iv mere ndahie jọgburu onweya mgbe o gere agwọ ahụ ntị kama ige Chineke ntị. Tupu ihe a eme Chineke naabịa nọnyere ha n’oge anyasị, ma soro Adam na Iv jekọije.

Ma mgbe ha risịrị mkpụrụ osisi ahụ, egwu malitere ịtụ ha, ha wee naezo onweha. Chineke jụrụ ha ma ha eriela mkpụrụ osisi ahụ, ha wee malite inye ihe ngọpụ dị icheiche. Mgbe ndị ụfọdụ mehiere, ha naagbalị ibunye ndịọzọ ihe ịtaụta ha. Chineke chụpụrụ ha site n’ogige ahụ n’ihi nnupụisi ha. O wee tinye ndị mmụọozi ka ha naeche ogige ahụ nche. Ọ bụ ihe jọgburu onweya na Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi; ọ bụ ihe a wetara mmehie, nrịanrịa na ọnwụ nime ụwa. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọjọọ, anyị naegosi iheatụ ọjọọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Chineke Ọ dị na mbụ tupu eké ụwa? Jenesis 1:1
  2. Gịnị bụ ihe mbụ Chineke mere? Jenesis 1:1
  3. Gịnị ka Chineke mere ka o nye ìhè? Jenesis 1:16
  4. N’ụbọchị òle ka Chineke mere ihe niile? Jenesis 2:8
  5. Ebee ka Chineke tinyere mmadụ mgbe O kesịrị ya? Jenesis 2:8