Matiu 8:1-16

Lesson 32 - Elementary

Memory Verse
“Apuru ime ihe nile n’ebe Chineke nọ” (Mak 10:27).
Notes

Oge náadịghị anya ndị mmadụ matara na Jisọs nwere ike ịgwọ ha ọrịa. O meghere anya onye ìsì ma mee ka ndị ngwụrọ jeijè, Ọ kpọlitere onye nwụrụanwụ ka ọ dịndụ. Ndị mmadụ naedutere Ya ndị ha arụ náadịghị ike. Ha naeso Ya ebe ọ bụla Ọ na éjé. Ọ naenyere ndị niile bịakutere Ya aka. Anyị naekele Chineke na Ọ ka nwekwara ike ịgwọ ndị ọrịa n’ụbọchị taa.

Ndị mmadụ ụfọdụ naeche na Ọ pụghị ịgwọ ọrịa siriike ma Baịbụl naagwa anyị na Ọ naagwọ ụdị ọrịa niile ọ bụla. O kere arụ niile, ọ bụghị ihe siiri Ya ike ịgwọ ya. Otù ụbọchị onye ekpenta bịakutere Ya ka Ọ gwọọ ya. O nwere ike ọtụtụ ọnya dị naarụ ya, ma ndị mmadụ adịghị achọ ịbịa ya nso. Mgbe ọ kpọrọ isiala nye Jisọs, ọ sị na o kwere na Jisọs pụrụ ịgwọ ya, Jisọs wee setịpụ aka Ya metụ ya wee sị “Ka eme ka ị di ọcha” ewee gwọọ ya n’otù oge ahụ. Anyị maara n’ezie na ọ hụrụ Jisọs n’anya n’ihi na Ọ gwọrọ ya.

Ọzọ kwa otù ọchịagha onye arụ náadịghị orù ya ike bịakutere Jisọs. O kwere na ọ bụrụ na Jisọs ekwuo náánị okwu arụ orù ya ahụ gaadị ike.

Jisọs chọrọ ka ndị mmadụ náatụkwasị Ya obi. Mgbe Ọ naekwu okwu Ọ chọrọ ka anyị kwere. Obi tọrọ Jisọs ụtọ mgbe ọchịagha a kwere na Jisọs pụrụ ịgwọ orù ya arụ wee dị orù ahụ ike ngwangwa Jisọs kwuru okwu.

Mgbe Jisọs bịaruru ụlọ Pita, Ọ hụrụ na ịba naeme nne nwunye Pita. Jisọs metụrụ ya aka, n’otù oge ahụ o bilie wee malite ịlụọlụ ya. O sighịrị Jisọs ike ịgwọ ndị ọrịa. Anyị nwere ndị enyi nwere obiọma, ma Jisọs kachasị ndị enyi niile mma. Ọ bụghị náánị na Ọ naazọpụta, ma Ọ naenye anyị mmiri ozuzo, na anwụ nke naeme ka ihe akụrụ n’ubi too. Ọ naenye anyị ihe oriri na uwe oyiyi dị icheiche. Ọ na agwọ anyị ma ọ bụrụ na anyị hụrụ Ya n’anya, ma kpeere Ya, ma ọ bụrụ na anyị tụkwasị Ya obi ma náasọpụrụ Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Onye ekpenta ahụ ò kwere na Jisọs pụrụ ịgwọ ya? Matiu 8:2
  2. Onye ọchịagha ahụ ò chere na ya dị mma nke na Jisọs kwesịrị ịbata n’ụlọ ya? Matiu 8:8
  3. Gịnị mere ihe o kwuru ji ju Jisọs anya? Matiu 8:10
  4. Òlee otú esi gwọọ nne nwunye Pita? Matiu 8:15