Ọpupu 19:1-25

Lesson 33 - Elementary

Memory Verse
“Onye-nwe-ayi bu onye nēnyerem aka” (Ndi Hibru 13:6)
Notes

Moses na ndị ya ejééla ijè n’ọzara ihe dị ka ọnwa atọ. Chineke na-elekọta ha n’ụzọ niile. Ọ ná-edu ha n’ehihie ma n’abalị. O mere mmiri dị ilu ka ọ dị ụtọ, O mere ka mmiri si n’óké nkume pụta. O si n’Eluigwe zidata mana, agụụ agụghị kwa ha, uwe ha adọwaghị kwa. O nyere ha ezi arụike. Ọ bụ náánị Chineke pụrụ ịnyezu anyị ihe niile n’akpá anyị.

Chineke chọrọ ka ndị Ya mara ụzọ ziriezi esi éfè Ya. Chineke gwara Moses, Moses wee gwa ndị ahụ. Moses hụrụ Chineke n’anya ma ná-erubere Ya isi, Chineke naagwa ya okwu. Ha rutara ebe dị mma ọnụnọ, Chineke rọpụtara ugwu ebe ahụ ebe O nwereike ịrịdata wee kwuere ndị ahụ okwu. Chineke kpọrọ Moses òkù n’ugwu a. Ọ gwara ya na ọ bụrụ na ndị ahụ erubere Ya isi na Ọ gaenye ha ọtụtụ ezi ihe maramma. Ọ gaeme ka obi tọọ ha ụtọ. Moses gwara ndị ahụ ha wee zaghachi sị “Ihe nile JEHOVA kwuru, ayi gēme ya.” Mmadụ ụfọdụ na-echefu mkwà niile ha kwere Chineke, ma Chineke adịghị echezọ.

Chineke chọrọ ka mmadụ niile nwee obi dị ọcha. O wee nye ndị ahụ iwu ka ha dobe onweha ọcha abalị atọ n’ihi na Ọ na-aga ịgwá ha okwu site n’ọnụ Moses. Chineke sịrị na Ya na-aga ịrịdata n’elu ugwu ahụ ma onye ọ bụla abịala n’ugwu ahụ ile Ya anya. Ugwu ahụ aghọwo ugwu dị ebube n’ihi na Chineke nọ n’ebe ahụ. Onye ọ bụla nke metụrụ ya aka ga-anwụ.

N’ụbọchị ahụ Chineke rọpụtara ịrịdata, enwere ọtụtụ égbè eluigwe, àmụmà, na alaọmajijiji. Chineke rịdatara n’elu ugwu ahụ.

Ọ kpọrọ Moses ka ọ bịakute Ya. Moses achọghị ịga rue mgbe Chineke kpọrọ ya. Chineke gwara Moses na Eron ihe Ọ chọrọ ka ha kuziere ndị mmadụ ahụ. Ihe ha mụtara bụ ihe na-enyere anyị aka n’ụbọchị taa. Ọ kụziiri ha ka ha hụ Ya n’anya ma kwere kwa na Ya. Ha gaabụ ndị nwere obiụtọ ma ọbụrụ na ha emee ihe Chineke gwara ha ka ha mee. Ọ bụrụ na anyị onwe anyị kwa emee ihe Chineke na-agwa anyị ka anyị mee, anyị ga-enwe obiụtọ, o wee doo anyị anya na anyị gaga Eluigwe ibinyere Ya ebighịebi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Moses mere iji mee ka ndị ahụ ghara ịbịa n’ugwu ahụ? Ọpupu 19:12.
  2. Gịnị ga-eme ma ọbụrụ na onye ọ bụla emetụ ugwu ahụ aka? Ọpupu 19: 13
  3. N’ụzọ dị añaa ka ndị ahụ ji jikere n’ihi oge ahụ mgbe Chineke ga-agwa ha okwu? Ọpupu 19:14, 15
  4. Gịnị mere n’ugwu ahụ mgbe Chineke rịdatara? Ọpupu 19:18