Ọpupu 32:1-35; 34:1-7, 33-35

Lesson 35 - Elementary

Memory Verse
“Ọ digh onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua” (Matiu 6:24)
Notes

N’ihi na Moses nọrọ ọdụ n’elu ugwu ahụ ebe ya na Chineke naakparịtaụkà, ndị ahụ wee chee na ọ gaghị abịaghachi ọzọ. Ha chọrọ chi ọzọ. Ha kwesịrị ịma na chị ọzọ agaghị edú ha otú Moses si edú ha, na ọ bụ ihe jọgburu onweya ifè arụsị n’ọnọdụ Chineke. Ha echéfusiwo ihe ọma niile ahụ nke Chineke meere harịị. Eron gwara ha ka ha weta ọlantị ha dị icheiche nke ndị nwoke na ndị nwanyị nke oge ahụ naeyi.

Chineke amarawo ihe ha mere. Ọ gwara Moses ka ọ ridaa n’ihi na ndị ahụ naeme ihe jọgburu onwe ya ná njọ. Chineke sịrị na Ọ ga enye ha ntaramahụhụ n’ebe ọ dị ukwuu. Mgbe Moses hụrụ ha ka ha naeteegwú gburugburu arụsị ahụ, ọ tụdaa mbadamba nkume ahụ n’ala o wee tiwasịa. O were arusị ahụ, tinye n’ọkụ, gbazee ya, wee gwerie ya dịka nzụ ma tinye ya nime mmiri ka ndị ahụ wee ñụọ. Ihe ha mere jọrọnjọ n’ebe ọdị ukwuu, o kwesịrị inye ha ahụhụ n’ihi na ha fere arụsị wee ghara ịsọpụrụ Chineke.

Chineke achọghị iso ha jee ọzọ n’ihi nnupụisi ha, ma Moses rịọrọ Chineke ka O mere ha ebere soro ha jee.

Chineke gbaghara ha. Chineke nwere obi ebere. Ọ naagbaghara onye ọ bụla bụ onye nwere mwuta maka mmehie ya niile dị icheiche wee kpeere Ya maka mgbaghara. Chineke gwara Moses ka o mee mbadamba nkume ọhụụ abụọ, na Ya gaede ihe dị na nkume mbụ ahụ na ya. Chineke gwara Moses na Ya ga agabiga n’akụkụ ya ma Ọ gaekpuchi ya iru, ka Moses wee hụ náánị azụ Ya.

Moses mere ihe Chineke nyere ya n’iwu. Chineke gabigara n’akụkụ Moses, náasị, Chineke dị obiebere, Ọ dị mma, O nwere obiọma. Anyị onweanyị ma kwara na Ọ gbanwebeghị. Anyị kwesịrị inwe obiekele na anyị nwere Chineke na Nna Onye jupụtara n’ịhụn’anya na obiọma na kwa Jisọs Enyi kachasị mma n’ụwa nke a!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Eron meere ndị ahụ ka ha féé?
  2. Chineke Ọ hụrụ ya?
  3. Gịnị ka Ọ gwara Moses?
  4. Gịnị ka Moses mere mgbe ọ hụrụ Ehi ahụ?
  5. Òlee ihe mere Moses ji were akwa kpuchie iru ya?