Ọpupu 35:1-35; 40:33-38

Lesson 36 - Elementary

Memory Verse
“N’ulọ Nnam ọtutu ebe-obibi di” (Jọn 14:2)
Notes

N’ihi na Moses na Chineke nọrọ ogologo oge iru ya wee náenwupụta ìhè. O nwere ọtụtụ ihe nke Chineke sịrị ya ka ọ gwa ndị ahụ. Chineke agwawo ya otú ọ gaesi enyere ndị ahụ aka ka ha wee kwesị ntụkwasịobi n’ebe Ọ nọ ka O wee naaga n’iru náanọnyere ha ma náechebe kwa ha. Ha ga arapụ Sainai wee gaan’iru na njèm ha ijéru ala ahụ nke Chineke naedú ha jee. Chineke gwara Moses ka o nye ndị ahụ iwu ka ha maara Ya ụlọikwuu ebe ha ga náefè Ya òfùfè. Ọ gaghị adịrị ha arọ inaebu ya dịka ha naeje njèm ha.

Moses gwara ndị ahụ ka ha weta ihe ndị ahụ agaeji lụọ ụlọikwuu ahụ na ihe ndị nke gaadị n’ime ya. Ha wetara ọlaedo, ọlaọcha, osisi na mmanụ. Ha wetara ha n’afọ ofufo. Ọ bụ ụdị onyinye a ka Chineke naachọ. Ndị maara akpà ákwà kpará ákwà maka ụlọikwuu ahụ. Chineke rọpụtara ndị mmadụ ndị maara otú esi alụ ọtụtụ ọlụ dị icheiche. Ákwà mkwụba ododo, uhie na ezi ákwà ọcha niile ahụ mere ka ụlọikwuu ahụ maamma n’ebe ọdị ukwuu. Ndị mmadụ ndị Moses rọpụtara naebu ụlọikwuu ahụ dịka Chineke nyere ha n’iwu.

Enwere ocheeze amara ebe ndị mmadụ ahụ na edebe onyinye ha maka òfùfè nke Chineke. Chineke nwere obiọma n’ebe anyị nọ ma náachọ ka anyị nye Ya onyinye iji gosi obi ekele anyị maka ihe ndị ahụ anyị natara.

Karịsịa nke a, Chineke chọrọ ka anyị nye Ya ịhụn’anya anyị. Chineke gwara Moses ka ọ rọpụta ụmụmmadụ ndị ganaeme ọtụtụ ihe ndị ahụ aghaghị ime. Ụfọdụ ha nwere uwe pụrụ iche dị icheiche nke ha ganaeyi maka ọlụ ha. Chineke gwara Moses otú ekwesịrị isi ákwá ha. Moses wee mee dịka Chineke gwara ya. Obi tọrọ Chineke ụtọ na Moses rubereisi. Chineke sịrị na Ya gaekwu mgbe ha kwesịrị idozi ụlọikwuu ahụ maka òfùfè. Mgbe alụsịrị ụlọikwuu a (maọbụ chọọchị), Chineke ji igweoji nke Ọ nọ nime ya kpuchie ya. Moses enweghị ike ịbà n’ime ya n’ihi na Chineke nọ na ya. Dịka ha naaga n’iru na njèm ha, igweoji naanọ n’elu ụlọikwuu ahụ n’oge ehihie, ma n’abalị ìhè náegbukeegbuke naanọ n’elu ya ka onye ọ bụla wee hụ ìhè. Nke a naegosi na Chineke nọ n’etiti ha wee náedu ha. Chineke tụrụ àtụmààtụ niile. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọ bụla Chineke gwara anyị ọsọsọ, anyị gaenwe ọñụ, ihe anyị ewee tọọ Nna anyị nke bi n’Eluigwe ụtọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ụdị onyinye ahụ ụmụ Israel wetaara Onyenweanyị? Ọpupu 35:29
  2. Gịnị bụ ụdị onyinye anyị kwesịrị iwetara Onyenweanyị?
  3. Òlee otú anyị kwesịrị ime mgbe anyị bịara n’ụlọ Onyenweanyị?
  4. Gịnị mere mgbe Moses lụsịrị ọlụ ahụ? Ọpupu 40:34
  5. Òlee otù ụmụ Israel si amata mgbe dị nnọọ mma ka ha gaan’iru na njèm ha? Ọpupu 40:36