Ọpụpụ 12:1-16

Lesson 37 - Elementary

Memory Verse
“Menu ihe nile nējigh ntamù na iru-uka ọ bula” (Ndi Filipai 2:14)
Notes

Anyị enweghị ike ichefu akụkọ banyere Moses, nwatakịrị nwoke ahụ onye dina nime nkata dị na mmiri. Nwanne ya nwanyị onye guzoro n’ebe dị anya na-eche ya nche bụ Miriam. Moses nwere nwanne nwoke aha ya bụ Eron. Chineke arọpụtawo Moses ka ọ bụrụ onyendú nke ụmụ Israel. Eron na Miriam enyerela ya aka ọtụtụ ugbò. Chineke hụrụ Eron n’anya. Chineke kpọrọ ya n’ugwu ahụ mgbe Ọ kpọrọ Moses. Ma ọtụtụ oge Eron na Miraim na-eme ihe ụfọdụ nke ná-adịghị amasị Chineke, nke a ewee ná-eme ka obi jọọ Moses njọ.

Owutara Moses mgbe Eron meere ndị ahụ arụsị nwaehi mgbe Moses na Chineke nọ n’ugwu ahụ. Ọ bụrụ kwarị na Moses anọọdụ, ha kwesịrị ịma na ọ bụ Chineke ka ha kwesịrị ifè òfùfè, ma ha matara na Chineke na-enyere ha aka n’ọzịzá ekpere nke Moses. Ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne ndị nwanyị nwereike inyere onweha aka n’ebe ọ dị ukwuu ma ọ bụrụ na ha ahụ onweha n’anya ma hụ kwa Jisọs n’anya. Ọ bụrụ na ha enweghị Jisọs n’obi ha wee ná-eseokwu, ọ ga-ewetara ha nsogbu na nhụjuanya. Chineke agwawo ndị ahụ na ọ bụrụ na ha atụmuo na ọ bụghị Moses ka ha na-atamù megide kama Chineke. Eron na Miriam chere na ọ bụ Moses nwanne ha nwoke ka ha na-atamù megide. Chineke wee nụ ntamù ha. Ọ bụrụ na nwatakịrị atamuo megide onye nke Chineke maọbụ onye nkụzi ụbọchịụkọ, n’ezie ọ naatamu megide Chineke. Anyị aghaghị irubere ndị náakụziri anyị ụzọ nke Chineke isi. Nwantakịrị ná-atamù megide ndị mụrụ ya na-atamu kwa megide Chineke. N’ihi na Chineke sịrị “Menu ihe nile nējigh ntamu na iru-uka ọ bula,” n’ihi nke a nwatakịrị kwesịrị irubere ndị mụrụ ya isi.

Chineke rịdatra n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, O wee nye Eron na Miriam ntaramaahụhụ n’ihi mmehie ha, Miriam wee ghọọ onye ekpenta. Ekpenta bụ ọrịa jọgburu onweya ma mmehie n’ime obi dị njọ karịa ọrịa ekpenta. Ọbara nke Jisọs pụrụ ịgwọ ọrịa ekpenta, ọ bụ kwa náánị Ọbara Jisọs pụrụ iwepụ mmehie. Moses kpeere Miriam ekpere Chineke wee gwọọ ya, ma edotara ya n’azụ obodo rue ụbọchị asaa. Nke a bụ ihe mmụta nye Miriam na ụmụmmadụ ndị biri n’oge ahụ, na anyị onweanyị ndị náadị ndụ taa. Anyị agaghị echéfu na Chineke achọghị ka anyị tamuontamù.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ọ dị mma ka Eron na Miriam tamuo megide Moses?
  2. Gịnị bụ ntaramahụhụ Miriam nwetara n’ihi ntamù? Ọnu-ọgugu 12:10
  3. Ònye kpeere ya ekpere ka agwọọ ya? Ọnu-ọgugu 12:13
  4. Ụbọchị òle ka ọ nọrọ n’azụ obodo? Ọnu-ọgugu 12:15
  5. Jisọs Ọ chọrọ ka anyị náatamuntamù? Ndị Filipai 2:14
  6. Ònye ka anyị naatamù megide mgbe ọ bụla anyị naatamù?