Ọnu-ọgugu 13:1-33; 14:1-45

Lesson 38 - Elementary

Memory Verse
“Anamaga idoziri unu ebe” (Jọn 14:2)
Notes

Mgbe ndị ahụ ruru ala ahụ ebe ha naejé, Chineke gwara Moses ka o zipụ ụmụ nwoke irinaabụọ ka ha jee hụ otú ala ahụ na ndị bi n’ime ya dị. N’ụzọ dị otú a, ha gaama otú ha gaesi ewere ala ahụ n’ihi na Chineke ekwewo mkwà inye ha ya. Mgbe ụbọchị irianọ gasịrị, ha lọghachi, wee bute ụyọkọ mkpụrụ vine sitere n’ebe ahụ. Ha sịrị na ụmụmmadụ ndị nọ n’ebe ahụ dị ike karịa ha n’ihi nke a ha agaghị enweike were ala ahụ. Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha wee taa Moses ụta na ọ kpọpụtara ha ka ha lụọọ agha tupu ha enweeike ịbụ ndị nwe ala ahu. Ma mmadụ abụọ nime ndị ahụ jere iledo ala ahụ nwere okwukwe n’ebe ike Chineke dị. Keleb na Joshua matara na Chineke kwere mkwà inye ha ala ahụ, na Ọ ga enyere ha aka inweta ya, n’ihi na ọ dịghị ihe siiri Chineke ike ime.

Obi adịghị Chineke mma n’ebe ndịa nọ n’ihi na ha ekwereghị Chineke na ọ gaeme dịka O kwuru, O wee nye ha ntaramahụhụ n’ihi nnupụisi ahụ. Kama ha gaeje biri n’ala ọma a, ha nọ náejégharị n’ọzara ebe ha tara ahụhụ ma nwee ọtụtụ nsogbu na ihe isiike dị icheiche. Ndị niile náerubeghị iriarọabụọ mgbe ha rapụrụ Ijipt bara n’ala ọma ahụ.

Chineke nyere mmadụ iri ndị ahụ wetara akụkọ ọjọọ ahụhụ. Ha malitere ịrịaọrịa wee nwụọ. Ma enyeghị Keleb na Joshua ahụhụ ọ bụla. Ọ bụ ihe jọgburu onweya inupụrụ Chineke isi, wee ghara ịtụkwasị Ya obi. Mgbe ọ bụla Chineke nyere anyị iwu ka anyị mee ihe, Ọ naenyere anyị aka ime ya ma ọ bụrụ na anyị erubeisi, náagbanyeghị otú o si dị ike ime.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ụdị mkpụrụ osisi ndị nledo ala ahụ wetara? Ọnu-ọgugu 13:23
  2. Gịnị ka Joshua na Keleb kwuru banyere ala ahụ? Ọnu-ọgugu 13:30; 14:7-9.
  3. Gịnị ka mmadụ iri ndịọzọ kwuru? Ọnu-ọgugu 13:31-33
  4. Gịnị mere ndị ahụ kwuru ihe ọjọọ banyere ala ahụ? Ọnu-ọgugu 14:36, 37
  5. Ènyere Joshua na Keleb ahụhụ? Ọnu-ọgugu 14:38