Ọnu-ọgugu 22:1-41; 23:1-30

Lesson 39 - Elementary

Memory Verse
“Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya” (Ọlu Ndi-ozi 12:11)
Notes

Obodo ndị ahụ náadịghị efe Chineke òfùfè nụrụ otú Chineke si nyere ndị Israel aka merie ọtụtụ obodo. Ndịeze ụfọdụ nwere obiọma wee kwenye ka Ụmụ Israel site n’ala ha gafee, ma ndịọzọ nwere obi ọjọọ wee lụso ha agha iji wee mekpaa ha arụ. Chineke gọziri ndị ahụ nwere obiọma n’ebe ndị Ya nọ, ma nye ndị náenweghị obiọma n’ebe ha nọ ntaramaahụhụ.

Egwù tụrụ otù eze anaakpọ Belak na Ụmụ Israel gaanara ya ala ya. O wee rịọ Belam onye dị ka ọ naefè Chineke ka o kpeere Chineke ka Ọ ghara inyere Ụmụ Israel aka ọzọ. O kwee Belam mkwà inye ya ego ririnne. Belam chọrọ ime ihe gaamasị eze a n’ihi ego. Chineke dọrọ ya akanántị ka ọ ghara ịbụ ndị nke Ya ọnụ. Belak wee malite inye Belam nsogbu. Belam chọrọ ime ihe Belak chọrọ ma Chineke maara obi ya, Chineke wee kwenye ka o jee.

Chineke naachọ mgbe ọ bụla idebe anyị ka anyị ghara ime ihe ọjọọ, ma oge ụfọdụ anyị adịghị erubeisi. O wee zipụ mmụọozi Ya ka ọ mịpụta mmaagha ya guzo n’ụzọ ebe Belam gaesi agafe. Nne ịnyịnyaibu ahụ hụrụ mmụọozi ahụ ma Belam ahụghị ya. Ịnyịnyaibu ahụ wee jee nso mgbidi ahụ wee nuba kwa ụkwụ Belam ná mgbidi ahụ Belam wee tie ya ihe. Ịnyịnya ahụ wee daa n’ala o tie ya ihe ọzọ. Oge ahụ ka Chineke nyere Ịnyịnya ahụ ike ikwuokwu, o wee jụọ Belam ihe mere o ji eti ya ihe. Belam wee zaghachi na ya gaara egbu ya ma ọ bụrụ na ya ji mmaagha. Ọ naeweiwe ma Chineke mepere anya Belam o wee hụ mmụọozi ahụ ka ọ naatụrụ ya mmaagha ya.

Chineke sịrị na ọ bụ ịnyịnya ahụ gbochiri mmụọozi ahụ igbu ya. Belam matara na ọ bụ Chineke ji ịnyịnya ahụ adọ ya akanántị ka ọ ghara ime ihe ọjọọ. Chineke mere ka Belam gọzie ndị ahụ kama ịkọcha ha. Belam matara na Chineke naenyere ndị Israel aka, ma obi ya adịghị mma n’ebe Chineke nọ, n’ihi na ọ hụrụ ego n’anya karịa Chineke. Ná ngwụsị Belam nwụrụ n’agha.

Mgbe ụfọdụ ụmụntakịrị ganaarịọ ka arapụ ha ka ha mee ihe nnenanna ha sịrị ha “É-è.” Chineke maara ihe dị mma, ọ bụrụ na Ọ sị anyị “é-è” n’ihe ọ bụla, ọ bụ n’ihi na ọ maara na ọ dịghị mma na anyị gaeme ya. Belam ekwesịghịrị ime ihe ahụ Chineke sịrị ya “é-è.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Obi ọ dị Chineke mma na Belam chọrọ ịga na nke eze ndị Moab? Ọnu-ọgugu 22:22
  2. Òlee ihe mere Belam ji chọọ ijé? Ọnu-ọgugu 22:17
  3. Gịnị ka Belam mere ịnyịnya ahụ mgbe o chipụrụ pụọ n’ụzọ? Ọnu-ọgugu 22:23
  4. Gịnị ka Belam mere mgbe ọ hụrụ mmụọozi ahụ? Ọnu-ọgugu 22:31