Jọn 5:1-16

Lesson 40 - Elementary

Memory Verse
“Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:15).
Notes

Anyị na-añụrịọñụ n’ihi na Jisos chọrọ ịgwọ nrịanrịa anyị niile dị icheiche. Chineke mere arụ anyị niile. Ọ bụrụ na ihe ọ bụla adịghị mma na ya, O nwereike idozi ya ma mee kwa ya ka ọ dị mma otú ọ dị na mbụ. Okwu Chineke na-agwa anyị na ọ bụrụ na anyị kpee ekpere ma tụkwasị Chineke obi, Ọ ga-agwọ anyị. Anyị ga-akpọ kwa ndị ozi nke Chineke ka ha kpeere anyị ekpere mgbe arụ ná-adịghị anyị ike, n’ihi na Baịbụl gwara anyị ka anyị mee otú ahụ. Ihe kachasị mma bụ inwe Jisos dịka Enyi anyị.

Ọ dị otù ọdọmmiri ebe ndị mmadụ arụ ná-adaịghị ike na-anọ ọdụ n’ebe mpụta ya. Oge ụfọdụ mmụọozi na akpali mmiri ahụ, ndị mmadụ arụ ná-adịghị ike na-enwe mmasị ịrịda n’ọdọmmiri ahụ mgbe akpalisịrị ya.

Jisọs gafere ọdọmmiri ahụ otù ụbọchị, wee hụ otù nwoke arụ ná-adịghịike onye nọrọlarị n’ebe ahụ arọ iriatọnaasatọ (38). Jisọs wee meere ya ebere. Mgbe ọ bụla Jisọs na-enwe ọmiko n’arụ onye ọ bụla nke nọ ná nsogbu. Jisọs jụrụ ya ma ọ chọrọ ka agwọọ ya. Nwoke ahụ arụ náadịghị ike amaghị onye Jisọs bụ, na Jisọs pụrụ ime ihe niile. Ọ gwara Jisọs na ya enweghị onye ga-ebuba ya nime mmiri ahụ mgbe mmụọozi ahụ kpalisịrị ya. Nke a bụ ihe mere ndịọzọ ji aba nime mmiri ahụ tupu ya enweike eruta n’ebe ahụ.

Jisọs sịrị ya “ Bilie, chiri ute-gi, nējèghari.” Jisọs nyere ya ike, otù oge ahụ arụ dị ya ike o wee chịrị ute ya. ọ bụrụ na Jisọs agwa anyị ka anyị mee ihe, Ọ gaenye anyị ike ime ya ma ọ bụrụ na anyị erubeisi. Otú a ka Jisọs si gwọọ nwoke ahụ onye arụ ná-adịghịike kemgbe arọ iriatọnaasatọ. Tulee otú obi gaesi tọọ nwoke a ụtọ na Jisọs gwọrọ ya. Ụfọdụ ndị ajọ mmadụ nọ n’ebe ahụ ndị n’ahụghị Jisọs n’anya. Jisọs gbalịrị ikuziri ha ka ha dị mma ma ha achọghị ime ezi ihe. Ha gbalịrị itinye Jisọs ná nsogbu site n’ikwuokwu ụgha megide Ya, ma Jisọs adịghị eme ihe ọjọọ kama ezi ihe.

Ndị ajọ mmadụ a sịrị na ọ dịghị mma ka Jisos gwọọ ndị ọrịa n’Ụbọchị izuike ha. Ha sịrị na ọ dịghị mma ka nwoke ahụ agwọrọ chịlie ute ya n’Ụbọchị izuike ha. Ọ gwara ha na Jisọs gwara ya ka ọ chilie ute ya n’Ụbọchị izuike ha. Ọ dị mma irubere Chineke isi karịa mmadụ. Mgbe Jisọs hụrụ ya ọzọ, Ọ dọrọ ya akanántị ka ọ ghara imehie ọzọ ka ihe ọjọọ ka nke a ukwuu ghara ịbịakute ya.

Ngwangwa nwoke a matara na ọ bụ Jisọs bụ Onye gwọrọ ya, ọ malitere ná-agwa ndịọzọ. Ọ ñụrịrịọñụ nke ukwuu banyere ihe Jisọs meere ya nke na ọ chọrọ ịgwa onye ọ bụla banyere Otù Onye ahụ nke gwọrọ ya.

Obi dị anyị ụtọ na ọ dị onye gwara anyị maka ike Jisọs ịzọpụta anyị na ịgwọ anyị mgbe arụ náadịghị anyị ike. Anyị chọrọ ikwesị ntụkwasịobi ma chọọ ịgwa ndịọzọ banyere Jisọs. Ihe mwuta dị na nke a bụ na ọ bụghị ọtụtụ mmadụ maara banyere Jisọs na ịhụn’anya Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Jisọs gwara nwoke ahụ arụ ná-adịghịike nke nọ na ọdọmmiri Betesda? Jọn 5:8
  2. Nwoke ahụ arụ ná-adịghị ike o mere ihe agwara ya mee? Jọn 5:9
  3. Ọ maara onye Jisọs bụ? Jọn 5:13
  4. Gịnị ka Jisọs gwara nwoke ahụ ka ọ ghara ime ọzọ, Jọn 5:14
  5. Òlee nke kachasị anyị mkpà, ọgwụgwọ nke arụ anyị kaọbụ nzọpụta nke mkpụrụobi anyị pụọ ná mmehie? Mak 8:36, 37; Matiu 6:33