Jọn 14:1-14

Lesson 41 - Elementary

Memory Verse
“Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu”(Jọn 14:6)
Notes

Jisọs rapụrụ ụlọ Ya maramma n’Eluigwe wee bịa n’ụwa. O nweghị ụlọ n’ụwa. Ndị ajọọ mmadụ kpọrọ Ya asị n’ihi na Ọ gwara ha na ọdịghị mma ime ihe ọjọọ na ọ bụrụ na ha akwụsịghị ime ihe ọjọọ ha agaghị eje Eluigwe.

Okwu ndịa amasịghị ha, ha wee tụọ àtụmààtụ igbu Ya. Ọ bịara nime ụwa ịta ahụhụ n’ọnọdụ anyị. Akpọgidere Ya n’obe ka mmadụ niile wee chọta mgbaghara mmehie ha niile dị icheiche, wee nweeike ijé Eluigwe binyere Chineke na Jisọs. Ọ na ewuta Jisọs ịhụ ihe ọjọọ ndị mmadụ naeme.

O wutara ndịnáesoụzọ Jisọs mgbe Jisọs gwara ha na Ya chọrọ ịlaghachi n’Eluigwe soro Nna Ya nọrọ. Ọ gwara ha maka ebe ahụ Ọ gaedoziri ha, na kwa na Ya gaabịaghachi wee kpọrọ ndị ahụ náerubeisi wee náeme ihe ndị ahụ Ọ gwara ha mee jee n’ụlọ ahụ maramma.

Anyị maara na Eluigwe bụ ebe maramma n’ihi na ọ bụ Jisọs mere ya. O nwereike ime ihe niile. Ọ bụ Ya kèrè ihe niile. Chineke mere ezi ihe niile nye anyị. O doro anya na Eluigwe maramma karịa ihe niile ọ bụla nke dị n’ụwa a.

Enwere ọtụtụ abụ ụtọ dị n’Eluigwe nke ndị mmụọozi na ndị ahụ azọpụtara site na mmehie ha n’abụ gburugburu ocheeze ahụ. Ọ dịghị abụ dị n’ụwa a dị ụtọ. Baịbụl naagwa anyị maka ndị ahụ gaakpọ ụbọ akwara dị icheiche. Anyị kwere na ọ gaadị ọtụtụ ngwa abụ nke ndị ahụ gaeje Eluigwe gaeji náabụ abụ ụtọ dị icheiche. Chineke naagwa anyị na ntị anụbeghị ụdị abụ ọma dị icheiche dịka ọ dị n’Eluigwe. Ọ bụrụ na anyị achọ ịbụabụ otuto niile dị icheiche n’Eluigwe, anyị aghaghị imalite ya n’ụwa a. Anyị gụrụ na Baịbụl Nsọ na agaghị enwe ihe mwute maọbụ anyammiri n’ebe ahụ, n’Eluigwe, agaghị enwe nrịanrịa maọbụ ọnwụ. Lee otú ọ gaesi dị ụtọ ịnọ ebe ahụ, ọ bụghị ịnọ nwa oge kama site n’ebighịebi rue n’ebighịebi! Eluigwe bụ ebe dị nsọ.

Anyị aghaghị ibi ndụ dị ọcha maọbụrụ na anyị chọrọ iru ebe ahụ. Aghaghị ịsachapụ mmehie anyị niile ewee mee obi anyị ka ọ dị ezi ọcha. Jisọs tọgbọrọ ndụ Ya ka O mee ka anyị dị mma ijé Eluigwe. Obi anyị kwesịrị ijupụta n’ekele nye Jisọs n’ihi ihe O mere anyị na kwa ebe obibi ahụ maramma nke O jere idoziri anyị.

Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịdú ndịọzọ jee Eluigwe a maramma, ọ naachọ náánị nke onweya. Ọ bụ Jisọs gaakụziri anyị otú anyị gaesi nyere ndịọzọ aka, ka ha wee nọọ ná njikere mgbe Ọ gaabịa ọzọ ịkpọrọ ndị ahụ bụ ndị hụrụ Ya n’anya.

Anyị kwesịrị ịñụrịọñụ na o nwere onye gwara anyị banyere Jisọs, ma anyị onweanyị kwesịrị ịgwa ndịọzọ banyere ịhụn’anya Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ aha ọzọ anyị naakpọ Eluigwe? Jọn 14:2
  2. Òlee ndị bụ ndị gaeje ebe ahụ? Abu Ọma 15:2
  3. Òlee ihe mere Jisọs ji bịa n’ụwa? Jọn 3:17
  4. Ànyị maara oge Jisọs gaabịa ịkpọpụ anyị jee Eluigwe? Matiu 24:36
  5. Ndị ajọ mmadụ agaghị eje Eluigwe. Èbe ka ha gaeje? Abụ Ọma 9:17