Matiu 6:14-34; 7:1-29

Lesson 42 - Elementary

Memory Verse
“Riọnu, agēnye kwa unu” (Matiu 7:7)
Notes

Otù nime iheọmụmụ nke Jisọs kụkiiri anyị bụ ka anyị ná a agbaghara. Mgbe ụfodụ ndị mmadụ na-eme ihe ná-adịghị anyị mma, maọbụ ha agwa anyị okwu ná-adịghị mma. Jisọs ná-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ịkpọ ha asị. Anyị agaghị eme ha ihe ọjọọ ha mere anyị.

Jisọs kụziri na ọ bụrụ na mmadụ etie anyị ihe na anyị agaghị etighachi ha. Ụmụmmadụ ụfọdụ na-eche na ihe a dị ike ime. Jisọs na-akụziri anyị ka anyị gbaghara ndịọzọ dịka Ya Onweya gbaghaara anyị. Mgbe ha kwuruokwu ụgha megide Ya ma náagwa Ya okwu ọjọọ, Ọ zaghachịghị ha. Mgbe ha kpọgidere Ya n’obe, O kpeere ha ekpere.

Tupu anyị enweike bụrụ ezi mmadụ ndị ha na Jisọs gaanọ n’Eluigwe, aga agbaghara anyị mmehie anyị niile. Náánị Chineke nwereike ịgbaghara anyị mmehie anyị niile. Jisọs kụziri na anyị aghaghị ịgbaghara ndị mere anyị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gbaghara anyị. Anyị ga agbaghara ndị mejọrọ anyị, ma ghara inwe ihe ọjọọ n’obi megide ha. Ọ bụrụ na anyị agbagharaghị ndị mejọrọ anyị Nna anyị nke bi n’Eluigwe agaghị agbaghara anyị.

Ọ bụrụ na anyị emejọọ ndịọzọ anyị aghaghị ịrịọ ha. Ihe a bụ ihe siriike ime ma Jisọs na-agwa anyị ka anyị mee ya. Anyị ga-enwe mwute maka ihe ọjọọ ahụ anyị mere ndịọzọ ma kpeere Chineke ka O nyere anyị aka ka anyị ghara ime ya ọzọ. Jisọs kuziiri anyị ka anyị gbaghara ugbò narị anọ na iteghete.

Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị mebie ihe anyị, anyị agaghị emebi nke ha. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ha mesoo anyị nkeọma anyị onweanyị kwa gaemeso ha nkeọma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ha hụ anyị n’anya ma nyere anyị aka, anyị onweanyị kwa ga ahụ ha n’anya ma nye kwara ha aka.

N’ihe niile anyị gana eme ndịọzọ ndị mbụ. Ọ bụrụ na inwere oroma abụọ, ịga ewere nke ka mma nye enyi gị ma were nkeọzọ.

Ọ bụrụ na onye ọ bụla edota òzízí niile nke Jisọs n’obi ya ma náeme ha, agaghị enwe ịlụọgụ na ịkpọasị.

“Ya mere ihe nile, ka ha ra, bu nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n’ihi na nka bu iwu na ndi amuma Chineke”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Èbe ka anyị kwesịrị ịnaakpadobe akụ anyị? Matiu 6:20
  2. Ònye naazụ anụ ufe nke eluigwe? Matiu 6:26
  3. Òlee otú Jisọs chọrọ ka anyị mee ndịọzọ? Matiu 7:12
  4. Ọtụtụ ndị mmadụ Ọ naeje n’ụzọ ahụ dị warara? Matiu 7:14
  5. Gịnị mere ụlọ ahụ nke ewuru n’elu ájá? Matui 7:27