Luk 7:36-50

Lesson 43 - Elementary

Memory Verse
“Agbagharaworo gi nmehie nile gi (Luk 7:48)
Notes

Enwere ụfọdụ mmadụ ndị hụrụ Jisọs n’anya. Ọ dị ha mma ịnụ ihe Ọ naagwa ha. Ha chọrọ ime ezi ihe. Ha achọghị inaeme ihe ọjọọ. Ha hụrụ ezi ihe niile dị icheiche nke Jisọs mere, ha wee hụ Ya n’anya nke ukwuu.

Ọ dị ọtụtụ mma ijé n’ụlọ Meri, Mata na nwanne ha nwoke bụ Lazarọs onye Jisọs mere ka o si n’ọnwụ bilie. Ha hụ kwara Jisọs n’anya nke ukwuu.

Ọ bụ ihe ziriezi inwe nnenanna ndị náekpeekpere ma náakụziri anyị Okwu Chineke. Ụfọdụ ụmụntakịrị enweghị nnenanna ndị nwereike ikụziri ha ka ha hụ Jisọs n’anya. Anyị kwesịrị ikpere ụdị ụmụntakịrị ndị dị otú a ekpere, ma anyị onweanyị ndị nwere nnenanna ndị bụ NdịKraist kwesịrị ịna enye Chineke ekele.

Otù nwoke kpọrọ Jisọs òkù n’ụlọ ya ka O soro ya rie ihe. Jisọs na-achọ iji ohere ọ bụla O nwere n’oge ọ bụla gwa ndịọzọ banyere Nna Ya nke bi n’Eluigwe. Ọ naadị Ya mma ịgwa ha banyere ụlọ ahụ maramma nke ha gaeje ma ọ bụrụ na ha ahụ Jisọs n’anya.

Jisọs nọ n’ụlọ nwoke a, otù nwanyị wetara ite mmanụ náesi ísìụtọ nke dị óké ọnụahịa. Ọ matara na Jisọs gaenyere ya aka. O ji anyammiri ya wee saa ụkwụ abụọ nke Jisọs, ma were agịrịisi ya hichaa ha. O weere mmanụ ahụ náesi ísìụtọ tee Ya n’ụkwụ Ya abụọ.

Nwoke ahụ onye kpọrọ Jisọs òkù nri chèrè na nwanyị ahụ bụ ajọ mmadụ, wee chọọ ka Jisọs chụpụ ya. Ma Jisọs chọrọ inyere nwanyị ahụ aka ka ome ezi ihe. Mgbe ọ rịọrịọ Jisọs ka Ọ gbaghara ya, O ji ọñụ gbaghara ya.

Jisọs chọrọ ịgbaghara mmadụ niile, ụmụnwoke, ụmụnwanyị na ụmụntakịrị ndị gaarịọ Ya ka Ọ gbaghara ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ihe anọ ndị ahụ nwanyị ahụ mere Jisọs? Luk 7:38
  2. Gịnị ka nwoke ahụ onye kpọrọ Jisọs òkù nri naeche banyere ihe ndị ahụ o mere? Luk 7:39
  3. Jisọs ọ gbaghara nwanyị ahụ mmehie ya niile? Luk 7:40
  4. Ọ bụ ịdịmma nke nwanyị a n’ebe Jisọs nọ zọpụtara ya kaọbụ okwukwe ya nime Jisọs? Luk 7:50
  5. Ànyị kwesịrị inwe okwukwe tupu enweike ịzọpụta anyị? Ndị Hibru 11:6