Luk 12:1-34

Lesson 44 - Elementary

Memory Verse
“Ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a”(Ndị Hibru 13:5)
Notes

Otù ụbọchị ka Jisọs naekwusa okwu, ụmụmmadụ dị ọtụtụ nke na ha na azọgide onweha ụkwụ. Ọ kụziiri ha ihe dị icheiche nke ha kwesịrị ima ka ha wee jee Eluigwe n’ikpeazụ. Ọ ziri ha na ihe kachasaị mkpà bụ ka o doo ha anya na ha nwere Ụlọ n’Eluigwe. Ihe a kachasị mkpà karịa ego maọbụ ihe ọ bụla ọzọ. Ọ kụziiri ha maka anụufe niile nke eluigwe. Ha adịghị alụọlụ, ma Chineke naazụ ha. Okokoosisi nke ọhịa adịghị alụọlụ, ma Chineke naenye ha ịmamma. N’ihi nke a Jisọs gwara ndị mmadụ ahụ ka ha ghara ichegbu onweha banyere ihe oriri na uwe oyiyi. Chineke gaenye ha ma ọ bụrụ na ha erubeisi wee mee ihe Chineke kwuru.

Jisọs kọọrọ ha akụkọ banyere otù ọgaranya. Ihe ọ kụrụ n’ubi ya mịrị ọtụtụ mkpụrụ n’ebe ọ dị ukwuu nke na ọba ya enweghị kwa ike baa ha niile. Ọ kpadoro ego n’ebe ọ dị ukwuu na ọtụtụ ihe ndịọzọ maka oge ọ gaeme agadi. Otù ụbọchị o kpebie na ọ ga akwatu ọba ochie ya wee lụọ nke ka ukwuu ka o wee náeri ihe, náañụ ihe ọñụñụ, ma nwe obiụtọ. Ọ chọghị ịma ihe Chineke gaekwu banyere ihe a.

N’otù oge ahụ olu wee gwa ya okwu. Ọ bụ Olu nke Chineke. Ọ gwara ya na ọ gaanwụ ma rapụ ihe ndị ahụ niile onwere n’azụ ya. Chineke kpọrọ ya onye nzuzu n’ihi na ọ kpadoro akụ ya niile n’ụwa, wee ghara ichè échìchè banyere ụlọ ahụ maramma n’Eluigwe. N’ezie ọ naeche náánị ọdị mma nke onweya, ma o nwereike o chèghị maka ndị ogbenye na ụmụmmadụ ndị náachọ enyemaka. Ọgaranya ahụ nwụrụ n’abalị ahụ. Ọ dịghị ihe o ji bịa nime ụwa a, ọ dịghị ihe o ji pụọ.

Ihe ndị anyị kwesịrị ịkpado n’Eluigwe bụ ịhụn’anya anyị n’ebe Chineke nọ, Okwu Ya dị Nsọ, ọlụ Ya na mmasị iso Ya nọọ mgbe ọ bụla. Anyị naakpado akụ anyị n’Eluigwe mgbe anyị kpọtaara Jisọs ndịọzọ - maọbụ mgbe anyị kpọtara ha n’Ụlọakwụkwọ Ụbọchịụkọ ịmụta otú agaesi gbaghara anyị mmehie anyị niile.

Anyị nwekwara ike kpadoo akụ anyị n’Eluigwe site n’ịga leta ndị arụ náadịghịike maọbụ nye ha ihe oriri maọbụ ego ma ọ bụrụ na ha bụ ogbenye. Ọ bụrụ na anyị emee nke a anyị náemere ya Jisọs. Ọ bụrụ na anyị akpọtara Jisọs ndị mmadụ anyị gana “egbuke dịka kpakpando site n’ebighịebi rue ebighịebi.”

Ọ bụrụ na anyị kwere Jisọs ma rịọ Ya ka Ọ gbaghara anyị, Ọ gaelekọta anyị n’ụwa a, ma nke kachasị ihe niile, Ọ gaenye anyị ihe niile maramma nke O dozirị anyị n’Eluigwe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka ọgaranya ahụ tụrụ àtụmààtụ ime? Luk 12:18
  2. Gịnị ka Chineke gwara ya? Luk 12:20
  3. Jisọs Ọ chọrọ ka anyị chègbuo onweanyị maka ihe oriri na ihe oyiyi? Luk 12:22
  4. Gịnị ka Jisọs chọrọ ka anyị bu ụzọ chọọ? Luk 12:31
  5. Onye pụrụ inye anyị ihe niile náakpá anyị?