Deuteronomi 27:11-14; 28:1-68

Lesson 45 - Elementary

Memory Verse
“Nēkwenyenu ndi-isi-unu” (Ndi Hibru 13:17).
Notes

Moses gwara ụmụ Israel na mgbe ha gafesịrị ofè Jọdan nke ọzọ, ha gaezukọ wee kwue ihe ndị ahụ Chineke chọrọ, ụfọdụ nime ha gaeguzo n’otù ugwu, ma ndịọzọ gaeguzo n’ugwu nke ọzọ wee gwa ụmummadụ na Chineke gaagọzi ha ma ọ bụrụ na ha eme ihe O nyere ha n’iwu. Mmadụ niile gaazaghachi site n’ikwu “AMIN.” Ihe nke a pụtara bụ Ka ọ dị otú ahụ.

Ndị nke nọ n’ugwu nke abụọ gaagwa ndị ahụ na Chineke gaata ha ahụhụ ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe O nyere ha iwu ka ha mee. Mmadụ niile gaazaghachi site n’ikwu “AMIN.” Mgbe Moses nwụsịrị, Joshua mere ihe Moses gwara ya, Chineke wee gọzie ya.

Chineke chọrọ ka ụmụmmadụ mara ihe Ọ chọrọ ka ndị nnenanna kụziere ụmụ ha. Chineke nyere iwu ka ndị nnenanna kuziere ụmụ ha iwu niile dị icheiche nke Chineke. Ụbọchị taa Chineke naagọzi ndị mmadụ na umuntakịrị ndị naerubeisi nye iwu Ya, ma náenye ndị náadịghị erubeisi ntaramaahụhụ.

Anyị gụrụ akụkọ banyere Eze Sọl onye Chineke gwara ka ọ jee bibie otù obodo. O mere otú ahụ, ma o gbughị eze ọjọọ ahụ nọ n’ebe ahụ na atụrụ ndị dị mma. Mgbe Samuel jụrụ ya ma o mewo ihe Chineke nyere iwu ka o mee, ọ zaghachi “É-é.”

Samuel gwara ya na ya nụrụ ákwá ụmụ atụrụ. Eze Sọl malitere inye ihe ngọpụ na ya chọrọ iji ha chụọrọ Chineke àjà. Ma ọ maara na nke a abụghị eziokwu. Ihe kachasị mma bụ irubere Chineke isi. Chineke enyeghị kwa ya oghere ịbụ eze ọzọ, Ọ zaghị kwa ya ekpere ọzọ.

Ọ dị otù nne onye náakụziri ụmụ ya Okwu Chineke ebe niile ọ bụla ha naejé. Nwa ya nwoke gaabịa rịo ya ka o kwe ka ya jee ebe ụfọdụ maọbụ mee otù ihe, ma ọ gaaza ya, “ka anyị jee lee ihe Okwu Chineke kwuru.” Ha gaeleba anya na Baịbụl inweta ọzịzá ahụ. Ihe ọ bụla Baịbụl kwuru bụ ihe ha gaesoro.

Chineke zọpụtara mkpụrụobi nwata nwoke a, ma gọzie ya n’ebe ọ dị ukwuu n’ihi na o rubereisi nye ihe nne ya gwara ya sitere na Baịbụl. Mgbe o tolitere, Chineke ji ya lụọọlụ n’ebe ọ dị ukwu.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kpọọ aha ụfọdụ ngọzi ndị ahụ dị icheiche nke Chineke gaenye ụmụmmadụ ndị gaerubere Ya isi? Deuteronomi 28:3-5
  2. Kpọọ aha ụfodụ ahụhụ ndị ahụ dị icheiche nke Chineke gaenye ụmụmmadụ ndị náagaghị erubere Ya isi? Deuteronomi 28:16, 17.
  3. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ụmụmmadụ ndị naerubere Chineke isi? Deuteronomi 28:1, 2
  4. Jisọs Ò rubeere ndị mụrụ Ya isi?
  5. N’ụzọ dị añaa ka Chineke si agọzi ụmụmmadụ n’ụbọchị taa?