Deuteronomi 34:1-12; Joshua 1:1-18

Lesson 46 - Elementary

Memory Verse
“Mu onwem nọyere unu ubọchi nile”(Matiu 28:20)
Notes

Mgbe ogologo njèm na nsogbu nke ọtụtụ arọ nime ọzara gasịrị, ụmụ Israel wee bịarue nso osimiri Jọdan, náachọ ịgabiga rue ala ahụ nke Chineke kwere ha ná mkwà. Ndịa emela ka obi gbarụọ Moses ọtụtụ ugbò n’ihi nnupụisi ha na ntamù maka ihe oriri, mmiri na nsogbu dị icheiche nke ha zutere na njèm ha. Náagbanyeghị nke a ha hụrụ Moses n’anya, ma Moses hụkwara ha n’anya.

Moses, nwata nwoke ahụ onye ekutara site na nkata ahụ dị n’elu mmiri etolitewo ugbu a wee bụrụ nwoke gbara arọ narị na iriabụọ (120 yrs). Ọ bụ ezie na ọ bụ ezi mmadụ náerubeisi, ma mgbe ọ dahiere Chineke tara ya ahụhụ.

Chineke gwara Moses na Ọ ga edú ya jee n’elu ugwu wee gosi ya obodo ọma ahụ nke ha naejé, ma ọ bụghị Moses bụ onye gaedú Ụmụ Israel baa n’ala ahụ. Mgbe nke a gasịrị Moses wee nwụọ. Akwụkwọnsọ gwara anyị na ọ bụ Chineke liri ya. Ọ dịghị onye maara ebe eliri ya.

Moses gbara narị arọ na iriabụọ mgbe ọ nwụrụ. Chineke naagwa anyị na ọ dịbeghị onye amụma ọzọ dịka Moses onye hụrụ Chineke iru na iru. Chineke hụrụ Moses n’anya n’ihi na ọ naerubere Chineke isi, ewezuga otù oge a mgbe o mere ndahie a.

Joshua bụrị onye ya na Moses lụkọrọ ọlụ kwesịrị ntụkwasịobi, Chineke wee rọpụta ya ịbụ onye ndú nke ndị ahụ. Chineke kwere Joshua mkwà inọnyere ya otú O si nọnyere Moses. Nke a mere ka obi tọọ Joshua ụtọ n’ihi na ọ maara na nsogbu dị ukwuu dị n’iru. Ndị ahụ adịghị erubere Chineke isi mgbe ọ bụla. Chineke gwara Joshua ka o nwee obi ike na Ya gaanọnyere ya ebe ọ bụla ọ naeje. Chineke wee sị Joshua ka o duru ndị ahụ gafee osimiri Jọdan rue ala ọma ahụ nke Chineke doziiri ha.

Mgbe Joshua gwara ndị ahụ Okwu Chineke, ha kwee mkwà ime ihe niile Joshua gaagwa ha ka ha mee, ma kpee kwa ekpere ka Chineke gọzie Joshua otú O si gọzie Moses. Ma oge ụfọdụ ha naechefu mkwà ha niile dị icheiche.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Moses o jeruru ala ahụ ekwere ná mkwà? Deuteronomi 34:4
  2. Ònye liri Moses? Deuteronomi 34:6
  3. Ònye nọchiri anya Moses dịka onye ndú nke ụmụ Israel? Joshua 1:1, 2
  4. Gịnị bụ mkwà ahụ nke Chineke kwere Joshua? Joshua 1:5
  5. Ndị ahụ o rubeere Joshua isi? Joshua 1:16, 17