Abụ Ọma 107:43

Lesson 47 - Elementary

Memory Verse
“Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n’elu bia” (Jemes 1:17).
Notes

Chineke chọrọ ka anyị náekele Ya n’ihi ngọzị Ya niile dị icheiche. Ọ bụrụ na anyị nwee obi ekele, anyị gaenwe ịhụn’anya nime obi anyị. Chineke chọrọ ka anyị hụ Ya n’anya. Ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu na O nyere anyị Jisọs ka Ọ nwụọ ma wepụ kwa mmehie anyị niile. Obi anyị kwesịrị ijupụta na-ekele maka ahụhụ dị ukwuu nke Ọ hụrụ n’ihi anyị. Ọ hụrụ ahụhụ ka anyị wee ghara ịlan’iyi.

Anyị agaghị alaazụ n’inye ekele site n’obi anyị niile maka ịdịmma na ịhụn’anya nke Chineke nye anyị. Mgbe ọ bụla anyị naekele nnenanna anyị na ndị enyi anyị mgbe ha mere anyị iheọma, ma onwereike anyị amataghị na ezi ihe niile ọ bụla sitere n’ebe Chineke nọ. Anyị apụghị inweta ha maewezụga Ya. O nyere mmiriòzùzò na anwụ nke náeme ka mkpụrụ anyị kụrụ n’ubi nke náenye anyị iheoriri tolite. Ọ naenye anyị ikuku ọma. Ọ naenye anyị arụ ike ma náagwọ anyị mgbe anyị nwere nrịanrịa. O nyere anyị ezi ndị nnenanna na ezi ndị enyi náeme ka obi tọọ anyị ụtọ.

Nke kachasị O nyere anyị Jisọs Onye bupụrụ mmehie anyị niile dị icheiche, wee gosi anyị ụzọ ịjé Eluigwe. Eluigwe bụ ebe maramma. Ọ dịghị nrịanrịa, ihe mwute maọbụ ọnwụ n’ebe ahụ. Jisọs jere idoziri anyị ebe ahụ, Ọ gaalaghachi ịkpọrọ ndị hụrụ Ya n’anya jee ebe ahụ. Jisọs naelekọta anyị ebe a ma ọ bụrụ na anyị ahụ Ya n’anya ma náerubere Ya isi. Anyị kwesịrị ịnaenye Ya ekele.

Anyị naekele Chineke na Ọ hụrụ mmadụ niile nọ ebe niile n’ụwa n’anya. Ágwà akpụkpọ arụ anyị enweghị ihe ọ pụtara n’ebe Chinekek nọ, ma anyị dị oji maọbụ ọcha. Ihe Ọ chọrọ bụ ka ha niile rịọ maka mgbaghara nke mmehie ha niile ka ha wee ghọọ ụmụ Ya.

Mgbe ọ bụla anyị naahụ ebe esere Jisọs na ụmụntakịrị. O nwere otù ụdị ịhụn’anya n’ebe ha niile nọ. Jisọs chọrọ ịgbaghara ha mmehie ha niile ka ha wee soo Ya biri n’Ụlọ ọma ahụ n’Eluigwe. Chineke naeme ihe niile ka ha dị mma. Anyị agaghị alaazụ i ekele Ya, i hụ Ya n’anya, wee mee ihe niile nke O nyere anyị n’iwu ka anyị mee.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Jịsọs Ọ naenyere ndị mmadụ ndị nọ ná nsogbu aka? Abụ Ọma 50:15
  2. Jisọs Ọ chọrọ ka anyị náeto Ya n’ụlọ nzukọ? Abụ Ọma 107:32
  3. Chineke Ọ naecheta ndị ogbenye? Abụ Ọma 107:41
  4. Ọnụ ọgụgụ ngọzi òle ka anyị naenweta n’ụbọchị site n’aka Onyenweanyị?
  5. Jisọs Ọ chọrọ ka anyị náekele ekele n’ihe niile? Ndị Efesọs 5:20