Joshua 2:1-24

Lesson 48 - Elementary

Memory Verse
“Ihu-n’anya nke zuru okè nāchupu egwù n’ezi” (1 Jọn 4:18)
Notes

Chineke ekwewo Joshua mkwà na Ọ ga-anọnyere ya otú O si nọnyere Moses. Joshua matara na ọ bụghị ihe dị mfé idú ndị ahụ jee n’ala ọma ahụ, ma Chineke gwara ya ka o nwee obiike, tụkwasị Ya obi, na Ya ga-enyere ya aka.

Joshua gwara ha ka ha kwadobe iheoriri ha, ma dị njikere ịgafe osimiri Jọdan. Ha enweghị ụgbọmmiri nke ha ga-eji gafee osimiri ahụ dị omimi nke ná-eji ọsọ ná-asụfe. Ma Chineke maara ihe ọ ga-eme iji nyere ha aka.

Site n’ofe nke osimiri ahụ, ndị ahụ hụrụ mgbidi nke gbara obodo ahụ ebe ha na-eje gburugburu. Joshua gwara ndịnyom na ụmụntakịrị ka ha chèrè rue mgbe ọ gaadịrị ha mfé ịgafe. Chineke na-elekọta ndị ná atụkwasị Ya obi.

Joshua wee zipụ ndị nledo abụọ ka ha jee hụ otú obodo ahụ dị na otú enwereike ísì nweta ya. Ma eze obodo ahụ anụworị akụkọ banyere ndịa mgbe ha nọ n’ọzara, egwù wee tụọ ya. Mgbe ọ nụrụ na ndị ọbịa ụfọdụ batara obodo ya, o chọọ inwude ha, gbue ha ma eleghịanya.

Ndị nledo ahụ batara n’ụlọ otù nwanyị onye nyeere ha aka. O zobe ha n’eluụlọ ya. Mgbe ndịozi eze ahụ bịara inwude ha, ha ahụghị ha. Nwanyị ahụ wee gwa ndị nledo ahụ na ya kwere na Chineke enyewo ha ala ahụ. Ọ nụwo enyemaka niile nke Chineke nyeere ha mgbe O mere ka Osimiri Uhie takọrọ ka ha wee nweike gafee n’ala akọrọ. N’ezie o kweere n’ezi Chineke.

Mgbe nke a gasịrị ọ rịọrọ ka nyere nna ya, nne ya, ụmụnne ya ndị nwanyị na ụmụnne ya ndịnwoke aka, ndị nledo ahụ wee kwee ya mkwa inyere èzínaụlọ ya aka. Ha wee gwa ya ihe ọ ná-aghaghị ime.

Mgbe nke a gasịrị o mee ka ha gbadaa n’azụ mgbidi ahụ, o wee kegide eriri uhie na windo ya dịka ha gwara ya. Mgbe ndị agha ahụ bịara, ha egbughị onye ọ bụla n’èzínaụlọ ya. Ọ bụ ihe dị mma inwe obiọma na ịrubeisi.

N’ezie Chineke gwara ndị nledo ahụ ihe ha gwara ya. Mgbe o mere ihe ha gwara ya, o mere ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ụmụmmadụ ga-anọ ná nchekwa ma ọ bụrụ na ha ga-atụkwasị Chineke obi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ndị Jeriko ọ nụrụ akụkọ banyere Ụmụ Israel? Joshua 2:10
  2. Egwù ọ tụrụ ndị Jeriko? Joshua 2:11
  3. Òlee otú Rehab si zọpụta mmadụ abụọ ndị nledo ahụ? Joshua 2:15
  4. Òlee ebe ndị èzínaụlọ Rehab niile gaanọ ka ewee ghara igbu ha? Joshua 2:18
  5. Gịnị bụ ihe àmà ha tinyere na windo ha? Joshua 2:21.