Joshua 3:1-17; 4:1-24

Lesson 49 - Elementary

Memory Verse
“Apuru ime ihe nile n’ebe Chineke nọ” (Matiu 19:26)
Notes

Ndị nledo mmadụ abụọ a ejighị egwù na akụkọ ọjọọ laghachi dịka ndị ụfọdụ mere na mbụ. Ma ezi ndị nledo abụọ a sịrị na ọ bụ ezie na ndị bi n’obodo ahụ ririnne nke ukwuu, na mgbidi ha toro ogologo nke ukwuu, ma ha kwere na site n’inyeaka nke Chineke, ha ga-ewere obodo ahụ.

Mgbe ha nọsịrị ụbọchị atọ iji jikere maka ịgafe osimiri ahụ, Joshua gwara ndị ahụ ka ha kpeeekpere ma mee onweha ka ha dị ọcha ka Chineke wee nwee ike inyere ha aka. Ọ gwa ha na dịka ndị nchụàjà naaga, ndị ahụ ganaeso ha. Mgbe ha ruru n’ọnụ mmiri ahụ, ndị nchụàjà ahụ gaebu ụzọ zọba ụkwụ ha na mmiri.

Ha aghaghị inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ iji mee ihe a. Ha mere dịka Joshua si kwue. Chineke mere ka mmiri ahụ guzo dịka oké mgbidi ka ndị ahụ wee gafee n’ala akọrọ. Joshua kwuru na ha ga-ewere nkume irinaabụọ site n’alaala nke osimiri ahụ ebe ndị nchụàjà ahụ na-eguzo rue mgbe mmadụ niile gafesịrị n’ofe nke ọzọ. Ha buuru nkume irinaabụọ ahụ jee n’ọmụma ụlọikwuu ha, ha wee rapụ ha ebe ahụ ka ọ bụrụ iheàmà ichetaara ha ihe Chineke meere ha. Ọ bụrụ na ụmụ ha ajụọ ha ihe mere ha ji dota nkume ndị a n’ebe ahụ, ha ga-akọrọ ụmụ ha ihe Chineke meere ha site n’ime ka ha gafee osimiri Jọdan n’ala akọrọ. Chineke chọrọ ka ndị nnenanna ná-akụziri ụmụ ha ihe banyere Ya.

Chineke chọrọ ka mmadụ niile náecheta ịdịmma Ya n’ebe ha nọ, wee nye ekele. Chineke chọrọ ka anyị mara na ọ dị njikere inyere anyị aka ọbụná ma ọ dịka ihe Chineke chọrọ ka anyị mee ọ dị ike. Ọ dịghị ihe siiri Chineke ike ime.

Ọ bụrụ na anyị cheta ihe ndị ahụ dị icheiche nke Chineke mere wee kelee Ya, anyị ga-atụkwasị Ya obi ma nwee okwukwe na Ya, Ọ gana-enyere anyị aka.

Chineke bụ ịhụn’anya. Ọ bụ ihe Ọ na-achọ bụ inyere ndị ná-erubere Ya isi ná atụkwasị Ya obi aka. O nyewo anyị mkwà a nime Okwu nsọ Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ onye ná-edú n’ụzọ mgbe ndị ahụ gafere Jọdan? Joshua 3:14
  2. Gịnị mere mgbe ụkwụ ndị nchụàjà ahụ metụrụ mmiri? Joshua 3:16
  3. Alaala osimiri ahụ ebe ha jere ijè ọ kpọrọnkụ? Joshua 3:17
  4. Gịnị mere osimiri Jọdan ahụ mgbe ndị ahụ niile gafesịrị ofe nke ọzọ? Joshua 4:18