Joshua 6:1-27

Lesson 50 - Elementary

Memory Verse
“Okwukwe ka mgbidi nke Jeriko ji da”(Ndị Hibru 11:30)
Notes

Ndị Jeriko ahụ ndị Joshua naeje ịlụso agha gaanụworị na Chineke nyere ndịa iheoriri n’ọzara, O nyere ha mmiri ka ha ñụọ n’ebe mmiri náadịghị. O kweghị ka anụmanụ dị icheiche jọgburu onweha gbue ha, Ò mee kwa osimiri ka ọ ghọọ ala akọrọ ka ha wee gabiga.

Akụkọ ndịa niile mere ka ha tụọ Joshua na ndị ya egwù. O nwereike ha naatụ kwa Chineke nke náenyere Joshua aka egwù. Arụsị ahụ dị icheiche nke ha na akpọ isiala nye n’obodo ha enweghịike inyere ha aka mee ụdị ihe ndị ahụ.

Enwere mgbidi dị ogologo gburugburu obodo ahụ, atụchiwo kwa ọnụụzọ obodo ahụ. Ha ekweghị ka onye ọ bụla bata, onye ọ bụla agaghị apụ kwa. Ha chọrọ ilezianya ka ndị iro ha ghara inweike bata obodo ahụ. Ha tụkwasịrị mgbidi ha obi, ma Joshua na ndị ya tụkwasịrị Chineke obi Onye kwere ha mkwà inye obodo ahụ n’aka Joshua. Mgbidi dị ogologo enweghịike igbochi Chineke na ndị Ya, mgbe Chineke chọrọ ka ha baa obodo ahụ.

Ndị agha ahụ gara obodo ahụ gburugburu ụbọchị isii otù ugbò n’ụbọchị. Ndị nchụàjà asaa naafụ opi n’iru igbe ọgbụgbandụ ahụ. Ma n’ụbọchị nke asaa, ha jere obodo ahụ gburugburu ugbò asaa; mgbe Joshua gwara ha ka ha tie mkpu, ha rubeeisi. Mgbidi ahụ dara n’ala, ndị agha ahụ wee baa nime obodo ahụ wee nọchie.

Ha chetara mkwà ha kwere otù nwanyi obiọma ahụ onye lekọtara ndị nledo ahụ, ha ebibighị kwa ụlọ ya. O kegidere eriri uhie nime windo ya dịka ndị nledo ahụ gwara ya ka o mee, ya ndị èzínaụlọ ya niile wee nọọ ná nchekwa.

Anyị onweanyị kwa gaanọ ná nchekwa ma ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke gwara anyị ka anyị mee. Eriri uhie ahụ naeme ka anyị chee échìchè banyere Ọbara nke Jisọs. Mgbe eji Ọbara Jisọs sachaa obi anyị, anyị naanọ kwa ná nchekwa nke Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka ndị ahụ mere mgbe ndị nchụàjà fụrụ opi? Joshua 6:20
  2. Gịnị mere mgbidi ahụ niile? Joshua 6:20
  3. Mgbe egbusịrị ndị niile nọ n’obodo ahụ, òlee ndị anaegbughị? Joshua 6:23, 25
  4. Gịnị mere egbughị ha? Joshua 6:25
  5. Ugbò òle ka ndị ahụ jere obodo ahụ gburugburu n’ụbọchị nke asaa? Joshua 6:15