Matiu 1:18-25; Luk 2:1-23

Lesson 51 - Elementary

Memory Verse
“I gākpọ kwa aha-Ya Jisus” (Matiu 1:21)
Notes

Ụfọdụ ndị ọzụzụatụrụ nọ n’ọhịa ebe ha naelekọta atụrụ ha. Na mberede ìhè mụbara gburugburu ha nke mere ka ha tụọ óké egwù. Ma onye mmụọozi gwara ha atụla egwù n’ihi na o wetara ozi nke óké ọñụ nke gaeme ka mmadụ niile ñụrịa - amụwo onyenzọpụta.

Mgbe nke a gasịrị ọtụtụ ndị mmụọozi bịara wee náabụ abụ náeto Chineke, ha wee náekwu maka ịhụn’anya Ya. Abụ ha dị óké ebube n’ezie. Ndị hụrụ Chineke n’anya gaanụ abụ ha n’Eluigwe, ha nwekwara ike soro ha bụọ.

Mgbe ndị mmụọozi ahụ laghachiri ndị ọzụzụatụrụ ahụ sịrị, “Ka ayi je rue Betlehem ugbu a, hu ihe a ekwuru, nke Onye-nwe-ayi mere ka ayi mara” Ngwangwa ndị ọzụzụatụrụ ahụ ji ọsọ gbaba nime obodo ahụ ịhụ Nwatakịrị Onye ahụ ndị mmụọozi gwara ha ihe banyere ya.

Ha chetara naagwara ha na Nwata ahụ nọ n’ụlọ anụ - ebe anaetinye nri anụụlọ - ma ọ bụ n’ebe ahụ ka ha hụrụ Ya. Obi tọrọ ha ụtọ ịhụ Ya, ha wee gwa ọtụtụ ụmụmmadụ banyere ihe ha hụrụ na ihe ndị mmụọozi ahụ gwara ha. Ha laghachiri n’ọñụ na itò Chineke.

Chineke nwere obiọma izigara ndị ọzụzụatụrụ ahụ ndị mmụọozi ịgwa ha banyere Jisọs. Anyị onweanyị kwa kwesịrị inye Chineke ekele na anyị nụrụ ihe banyere Jisọs na ịhụn’anya Ya n’ebe anyị nọ. Anyị kwesị kwara ịgwa ndịọzọ dịka ndị ọzụzụatụrụ ahụ mere.

Mgbe onye mmụọozi kwuru naagaamụ Jisọs, o kwuru naagaakpọ aha Ya “Jisus,” n’ihi na Ọ gaazọpụta ndị nke Ya site ná mmehie niile ha. Jisọs bụ aha kachasị ụtọ n’eluụwa. Baịbụl Nsọ naekwu na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla n’aha Jisọs, Ọ gaeme ya. Anyị nwereike ịrịọ ezi ihe niile ọ bụla n’aha Jisọs n’ihi na Ọ nwụrụ n’ihi anyị.

Obi anyị kwesịrị ijupụta n’ekele nye Chineke n’ihi Nwata ahụ dị ebube Onye amụrụ na Betlehem, anyị kwesị kwara ịgbalị ịdị ka Jisọs.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye gwara Josef na ọ gaakpọ aha nwa ya nwoke JISỌS? Matiu 1:20, 21
  2. Gịnị mere eji kpọọ Ya JISỌS? Matiu 1:21
  3. Òlee otú ndị amamihe ahụ si chọta Nwata ahụ bụ Jisọs, Matiu 2:9
  4. Gịnị mere Josef na Meri ji duru Jisọs jee Ijipt, Matiu 2:13
  5. Ònye gbalịrị igbu Nwata ahụ bụ Jisọs? Matiu 2:16