Matiu 23:1-39

Lesson 222 - Senior

Memory Verse
: “Otù onye bu Onye-ozizí-unu, (ọbuná Kraist), ma unu onwe-unu nile bu umu-nna” (Matiu 23:8).
Cross References

I Okpukpé nke Ndị Farisii

1. Ndị Farisii kpọsara Iwu nke Moses, ma ha emeghị ihe ha kwusara, Matiu 23:1-4; 21:28, 30; Luk 6:46; Taitọs 1:16

2. Ndị Farisii lụrụ ọlụ ha ka mmadụ wee hụ ha, Matiu 23:5-7; 6:2, 5, 16; Jọn 5:44

II Otù Onyeòzízí

1. Kraist bụ náánị Onyeòzízí nọ n’Alaeze Eluigwe, Matiu 23:8, 10

2. Agaghị e were onye ọ bụla dịka nna nke nzukọ n’ihi na Chineke bụ Nna anyị n’Eluigwe, Matiu 23:9; I Ndi Kọrint 8:6; Ndi Efesọs 4:6; Ndi Hibru 12:9

3. Mmadụ nke ga-adị ukwuu n’Alaeze Eluigwe aghaghị ịbụ onye ná-ejere mmadụ niile ozi, Matiu 23:11, 12; 5:19; Luk 1:52

III Ọmụmáikpé nke Onyeiruabụọ ahụ

1. Aghụghọ ga-eweta ahụhụ dị ukwuu nye onye ikpé mara, Matiu 23:13-15; Mak 12:38-40; Ọlu Ndi-ozi 8:18-23

2. Onyenwe anyị Jisọs kwuru okwu megide òzízí ụgha, Matiu 23:16-22; 15:9; I Timọti 6:3-5; Taitọs 1:10, 11; 2 Pita 2:1

3. Ikpé, ebere, na okwukwe nwere ọnọdụ dị mkpà n’ebe àtùmààtù nsọ Chineke dị nye nzukọ Ya, Matiu 23:23; Deuteronomi 10:12; Hosea 6:6; Maika 6:8; Mak 12:33

4. Ezi okpukpé na Okwu Chineke aghaghị ịdakọrịta, Matiu 23:24-28; Ndi Rom 2:1; Jemes 3:10; I Jọn 2:4

5. Eziomume nke onwe onye bụ ihe ná-egosipụta ịrụarụ nke dị nime mmadụ nke aga-eme ka ọ pụta ìhè n’oge dị n’iru, Matiu 23:29-36; Luk 11:39; 2 Ndi Kọrint 10:12; Ilu 30:12

IV Òkù Ikpeazụ ahụ

1. Jisọs gosiri ịhụn’anya ná mmetụta nke O nwere banyere ndị ahụ obi ha siriike bi na Jerusalem, Matiu 23:37

2. Jisọs si n’etiti ndị ọjọọ ahụ wezuga onwe Ya, ma kwe kwa mkwà ịbịaghachirị ndị niile ga-anabata Ya dịka Onyendú, Matiu 23:38, 39; Luk 12:40; 21:27; Jọn 14:3; Ọlu Ndi-ozi 1:11

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ọbịbịa nke Jisọs bịara n’ụwa nke a bụ mmeghe nke ọnụụzọ nke Alaeze Eluigwe. Ozi Ọ na-ezi site ná mmalite nke ijéozi Ya rue ọgwụgwụ ndụ Ya n’ụwa bụ mkwupụta okwu banyere onyinye Chineke nyere ụwa na ụgwọ ahụ nke aná-aghaghị ịkwụ na Kalvari n’ihi mmehie. “Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbatagh Ya. Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka Ọ nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n’aha-Ya” (Jọn 1:11, 12). Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii so ná ndị ahụ ná-agaghị ekwenye ịnabata Ọkpara Chineke.

Ezughịezu nke Aghụghọ

Ọtụtụ mgbe Jisọs dọrọ òtù ndị okpukpé ndịa akanántị na omume na òzízí ndịokenye apụghị ịchọtara ha ụzọ ịbà n’Eluigwe. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nwere ike n’ebe ndị ahụ nọ, ndị ahụ na-asọpụkwara ha. Ha ji akaike wee chịa ihe banyere okpukpé nke Jerusalem. Otú ọ dị, Jisọs maara na ọ ga-ewe karịa otuto nke mmadụ na ịdịnsọ nke aghụghọ iji ritara ha iruọma nke Nna nke Eluigwe n’urù. Ndị ndú nke okpukpé ndịa na-echè na ha pụrụ iduhie Chineke nke ná-enweghị ọgwụgwụ, Onye maara obi niile nke mmadụ, dịka ha duhiere mmadụ nke nwere ọgwụgwụ. Ma Okwu ahụ na-ekwupụta sị, “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abugh onye anēlelì: n’ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7). Jisọs ka hùkwara mkpụrụ obi mmadụ ndịa n’anya, ma ihe mere na o kwusirị okwu ike ọtụtụ mgbe megide mmehie niile ha bụ ka ha wee hụ njehie nke ụzọ ha ma bịarue ná mmazu nke eziokwu.

Ihe ọzọ mere ka Jisọs were obi Ya niile kwusie okwu ike megide ndị-odeakwụkwọ na ndị-Farisii bụ ka ndị ọzọ wee nwee ike ịhụ njehie ha, ma wezuga onwe ha n’ịdaba nime otù ndahie ahụ. Jisọs gwara ìgwè mmadụ ahụ sị, “N’ihi na asim unu, na ọ buru na ezi omume-unu adigh-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agagh-abà n’ala-eze elu-igwe ma-ọli” (Matiu 5:20). Ebe Ọ maara ike na ireụtọ nke ndị odeakwụkwọ na ndi Farisii nwere, Jisọs mere ka ịdịarọ nke erughịeru nke òzízí ha pụta ìhè, iji gosi nkeọma na nghọta nke ha abụghị ezi ụzọ ná-eduba n’Alaeze Eluigwe. Ọkpara Chineke maara na Ya gaje ịhụ ahụhụ nke ọnwụ n’aka ndị Ju, ma Ọ tụghị egwù ikwupụta eziokwu ahụ ná-agụghị ihe ọ ga-apụta. Oziọma nke Kraist ga-abụ ihe ekwupụtara sieike n’ụbọchị taa ọ bụrụ na ndị náeso ụzọ Ya nwere obiike dịka nke Onye ndú ha. Pọl na-agwa anyị sị, “Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus: Onye, … weda-kwa-ra Onwe-ya, we buru Onye nāña nti rue ọnwu” (Ndi Filipai 2:5-8).

Enweghị Okwukwe

Ọ bụghị na mmadụ ndịa amaghị nke bụ ezi ụzọ ahụ, n’ihi na Jisọs gwara ìgwè mmadụ ahụ na ndị náesoụzọ Ya na ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na anọdụ n’oche Moses. N’ụzọ ọzọ, ha bụ ndị mụrụ Iwu nke Moses ná ekwusa kwa ya nye ọtụtụ ọgbakọ nke ndị okpukpé ahụ. Ọ ga-adịwororị ndịa mma ma asị na ha kweere n’eziokwu ná-eme kwa ihe niile ahụ ha kuziri. “Ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n’ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n’akwukwọ. Ma ọ buru na unu ekwegh ihe onye ahu dere n’akwukwọ, ùnu gēsi aña kwere okwu nkem?” (Jọn 5:46, 47). Ebe ezi nsogbu dị bụ na ndịa ejighị obi ha niile kwere n’Okwu niile nke Chineke, maọbụ mee kwa omume dịka mkwupụta ha si dị. Ha chọrọ ka ndị ọzọ bie obi dịka ụkpụrụ niile nke Iwu si dị, ebe ha ji òzízí niile nke ndịokenye na nchepụta nke obi ha dochie ya, ná échè na site n’ụzọ dị otú a ha ga-ewepụ ihe dị arọ nke Iwu ahụ. Jisọs sịrị, “Ma ọ di nkpà ka unu me ihe ndia, ka unu ghara kwa irapu ihe ahu.”

Mmadụ ahụ nke ná-enweghị ngọpụ maọlị n’iru Chineke, bụ onye ná-ama mmehie nke dị ná ndụ ndị ọzọ ikpé, ma ná-anagide mmehie ná ndụ ya onwe ya. “Ì nāgu nka, gi madu, nke nēkpe ndi nēme ihe di otú a, ma i nēme kwa ha, na gi onwe-gi gāgbanari ikpé Chineke?” (Ndi Rom 2:3). Ihe ịtaụta mbụ nke Jisọs chọpụtara n’ebe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ ná mkparịta ụka nke Ya na ndị náesoụzọYa, mgbe ahụ, bụ na ha na-agwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme, ma ha onwe ha adịghị-eme ya. Ọbụná taa e nwere nime ụwa ọtụtụ ụdị okpukpé a nke ndị Farisii.

Ezi Nghọta

Ajọomume nke abụọ Jisọs mere ka ọ pụta ìhè bụ eziokwu ahụ na ọlụ niile nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na alụ bụ ka mmadụ wee hụ ha. Ezi nghọta banyere Oziọma ahụ bụ ime ihe niile nye Chineke. “Ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bugh kwa madu; ebe unu matara na ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist” (Ndi Kọlọsi 3:23, 24). Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ hụrụ otuto nke mmadụ n’anya ma ha ejighị otuto nke Chineke kpọrọ ihe. Ọchịchọ ha megidere ihe o kwesịrị ka ọ bụrụ. Ọ bụrụ rị na ha leziri anya inweta mkwagide nke Chineke ná ndụ ha, ha agaghị achọworị mkwagide nke mmadụ. Ụbọchị ndụ mmadụ n’eluụwa dị mkpụmkpu. Ihe ka mma iji ya mee bụ ito Chineke na ikwupụta ịhụn’anya Ya nye ụmụmmadụ, wee site na ya dọta ndị chigharịrị échigharị nye Alaeze nke Eluigwe.

Mmehie Nke Nganga

ọrọgwụ nke mmehie a ná-achị ná ndụ nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, bụ nganga. Ha hụrụ ịnọ n’isi ọnọdụ niile n’oriri niile ha n’anya, na isioche niile n’ụlọnzukọ; ha hụrụ ekele n’ọmaahịa n’anya na ọjíjá nke mmadụ. Ọ dịghị mmehie dị n’ịnọ n’isioche maọbụ n’inwe ọtụtụ aha dị mkpà, ma mmehie dị n’ịhụ ụdị ihe ndịa n’anya, ịchọ ha, na nganga dị mgbe e nwetara ha. O wutere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’ịchọpụta na Okwu Chineke bụ eziokwu. “JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchị nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala” (Aisaia 2:12). Nganga, nke bụ isi ihe ná-akpali mmụọ dị elu nime ndụ ndịa nwere eziomume nke aka ha, wetaara ha mbibi anaahụ anya na nkewapụ ebighịebi site n’ebe Chineke nọ. Nganga na-ebute kwa mbibi n’ụbọchị anyị dịka ọ dị mgbe Jisọs biri n’eluụwa. E nwere ike ịhụ ya nime ndụ mmadụ n’akụkụ ọ bụla, nwee kwa ike ịhụ ya mgbe ụfọdụ nime nzukọ Kraist. Mgbe mmadụ gara ná nzukọ Kraist igosi onwe ya, ihe ịgba-àmà ya, maọbụ ọnọdụ ya, iwe nke Chineke aghaghị ịdakwasị ya.

Ụfọdụ dị, dịka ndị Farisii, ndị itú aha dị elu na-atọ ụtọ; ma Jisọs kọwara ụzọ ná-ezighịezi esi etú aha ụfọdụ. Chineke bụ Nna anyị, ma Kraist bụ Onyenwe anyị. Jisọs egosighị na aga-ewezuga ùgwù, ịhụn’anya na nsọpụrụ n’ebe ndị edebere ịbụ ndịisi anyị nime Oziọma nọ, ma Ọ chọrọ ka mmadụ cheta na Chineke bụ Onye ndú na Onye ná-akwagide nzọpụta anyị. Náánị ọlụ dịrị mmadụ nime nzọpụta bụ ikwere, ịnara, na ikwupụta nye ndị ọzọ urù ná-enweghị ọgwụgwụ dị nime ya. Ndị náeso ụzọ Kraist bụ ndị ná ejéozi, ma onye ga-abụ onyeisi n’etiti ndị náeso ụzọ Ya aghaghị ịbụ onye ná ejéozi karịa. Ndị dịkarịsịrị ukwuu nime Oziọma taa bụ ndị ná ejéozi karịsịa. Onye weere obi ya ná ejé ozi emeriwo nganga.

Mkwupụta Megide Iruabụọ

Ahụhụ asatọ ka eji megide ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nime isi ebeọgụgụ a n’ihi na ha ejégharịghị n’ìhè nke Jisọs wetaara n’ụwa, n’ihi na ha bụ kwa ndị iruabụọ. Nke a abụghị mbụ Jisọs kwuwara okwu megide mmehie a, ma n’ebe a O kwusirị ya ike, n’ihi na ndịa n’oge mbụ egeghị ịdọakanántị Ya niile. Ọbụná Chineke Nna, maọbụ Ọkpara adịghị esite na mbụ gwa mmadụ okwu n’olu mmegide. Ha na-ekwu okwu n’ịhụn’anya na ebere -- “Biko bianu, ka ayi rurita uka.”

Jisọs na ndịa arụrịtawo ụka ọtụtụ mgbe, ma ugbu a Onyenwe anyị na-achọ ịrapụ ha, ma Ọ chọrọ ka ha mara nkeọma ọnọdụ ha n’ebe Chineke nọ. Eziokwu ahụ ga-eme ka mmadụ niile pụọ n’orù, ọ bụrụ na ha anara ya. Mgbe ekwupụtara Eziokwu n’izuòkè na n’ịdị mfé ya niile, mmadụ niile ga-aza ajụjụ nye Chineke banyere ihe ha ji Eziokwu ahụ lụpụta. Ná mgbalị nke ikpeazụ, apụrụ ikwu na Jisọs jiri mmaagha nke Eziokwu n’olileanya na nke a ga-agba mmehie ọtọ nime ndụ ndịa nwere ụdị ụzọ okpukpé nke aka-ha, ma weta ndozi nime ndụ ha. Ọtụtụ mgbe, ndịozi Kraist na-enwe kwa ibuarọ ahụ banyere ndị na-abata n’okpuru ijéozi ha, ná-eji kwa ike niile ha nwere ná-eti mkpu megide mmehie. Ụfọdụ mmadụ na-ewezuga onwe-ha n’ụdị ijéozi a, ma mkwupụta Eziokwu dị mkpà ọ bụrụ na aga-anapụta ụmụmmadụ ná mmehie ha.

Ngọzi Gabigara Mmadụ

Jisọs bịara n’ụwa ịgọzi mmadụ, ma ọ bụrụ na Ọ chọpụta na ọ dị mkpà ịkpọkwasị ahụhụ n’isi mmadụ, o nwere ezi ihe kpatara nke a. Ọ bụrụ na Onye ukwuu na-arịọrọ anyị arịrịọ ebilie megide mkpụrụobi ọ bụla, ònye, maọbụ gịnị pụrụ ikpepụta mkpuruobi ahụ? Jisọs gwara ndịa na site n’iruabụọ na odudu ụgha ha, ha na-emechibido ụmụmmadụ ụzọ nke Alaeze Eluigwe -- nke a bụ ebubo siriike. Ha bụ ndịiro kpebiri imegide Oziọma Jisọs Kraist, nke bụ náánị ọnụụzọ ịbà n’Alaeze ahụ.

Mmegide siri ike nke ndị ọzọ abụghị náánị ihe ná eme ka mmadụ ghara ịbà n’Alaeze Eluigwe. Iruabụọ bụ otù ihe-mgbochi dị ukwuu. Ụmụmmadụ na-ele ndị ahụ kwupụtara na ha bụ ndị nke Kraist anya, ọ bụrụ kwa na ha achọpụta onye iruabụọ, ụfọdụ ga-ada mbà n’okwukwe. Ha na-edebe ndị òtù okpukpé niile n’otù ọnọdụ, ma kwere kwa na n’ihi na ụfọdụ apụghị idebe ndụ ha n’usoro nke Okwu Chineke, na ọ dịghị mfé ime otú a. N’ụzọ nke a, onye iruabụọ na-emechi ụzọ Alaeze Eluigwe nye ndị ná-ele ndụ ya anya.

N’ụzọ ọzọ, anyị na-ahụ ìhè nke Oziọma nke ná-enwu site n’onye ná-ebi ndụ ya niile nye Chineke. Ọñụ na obiụtọ nke ná-enwupụta site n’ezi onye nke Kraist bụ ihe ná-egosi na ụzọ nke ịbà n’Alaeze Eluigwe ghere oghe nye “onye nāchọ.”

Okwu Ikpeazụ Nke Onyenwe anyị

Jisọs matara na okwu Ya na-ada ná ntị ekweghịekwe nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. Na mgbe ná-adịghị anya, aga-akpọgide Ọkpara Chineke n’obe, ma Ọ chọrọ ka ndị Jerusalem mata na Ya bu ibuarọ banyere ọdịmma ha rue ikpeazụ. Ọ ga-achịkọtaworị obi ndị Ju ọbụná n’oge áwà ikpeazụ a ma ha egeghị ntị n’ọkpụkpọòkù nke ikpeazụ Ya. Ebere Chineke bụ ogologontachịobi, ma ọ bụrụ na ajụ Ya mgbe niile, n’ikpeazụ a ga-ewezuga ya. Jisọs gwara ndị ahụ na n’ihi na ha amataghị mgbe nleta ha; arapụwo ka ụlọ ha bụrụ ihe tọgbọrọ n’efu. Ụlọ Nsọ ahụ ebe ha gosipụtaworo nganga na omenala ha dị icheiche, Ụlọ Nsọ nke emere ka ọ bụrụ ụlọahịa na ọgba ndịori wee ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu.

Mgbe Ọkpara Chineke wezugara Onwe ya site n’Ụlọ Nsọ na n’obodo Jerusalem, ebube Chineke sokwara Ya pụọ. Nime arọ olenaole, ma obodo a, ma Ụlọ Nsọ a ga-abụ ihe lara n’iyì. Mmadụ ndịa wetaara onwe ha ahụhụ niile a n’ihi na ha jụrụ Jisọs, bụ Onyenzọpụta. Ijụ Ọkpara Chineke taa ga-eweta amamikpé nime obi na ndụ nke mmadụ. Otú ọ dị site n’ọchịchịrị gbachịrị otù ìhè nke olileanya nwuwapụtara. Jisọs kwere mkwà ịlaghachịkute ndị niile ga-anọ ná-echere ma nabata kwa Ya. Mmadụ olenaole, ọbụná ụfodụ ndị sitere na Jerusalem, anabatawo Onyenwe anyị Jisọs. Onye ndú a agaghị-arapụ ha ná-akasịghị ha obi. Ọ ga-alaghachị ịkpọrọ ha. Nke a bụ olileanya dị ndụ nke ezi nzukọ Kraist taa, ọ bụrụworị olileanya nke ndị nke Kraist site na mgbe ochie gara-aga. Jisọs na-abịa! Lee olileanya dị ebube nke a bụ!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kwue otù isi-ihe Kraist nwere megide ụzọ okpukpé nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii.
  2. Òlee urù ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bu n’uche mgbe ha na-alụ ọlụ nke okpukpé ha?
  3. Gịnị ga-abụ ọnọdụ nke obi, ka o wee lụọ ọlụ nke Chineke ga-anabata?
  4. Òlee otú mmadụ ga-esi dị ukwuu n’Alaeze Eluigwe dịka Jisọs kuziri?
  5. Kwue ihe mbụ iruabụọ nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii lụpụtara.
  6. Ọ bụ ugbò òle n’ebe ọgụgụ a ka Jisọs tiri mkpu megide iruabụọ?
  7. Òlee otú Chineke si ele iruabụọ anya taa?
  8. Òlee ihe imesi obiike ndị Ju lụpụtara nye mba ahụ?
  9. Òlee olileanya ukwuu Jisọs rapụụrụ ndị náesoụzọ Ya? Olileanya ahụ, ọ dị ihe ọ pụtara nye ụwa taa?