Lesson 223 - Senior
Memory Verse
“Ma nka bu ndu ebigh-ebi ahụ, ka ha mara gi, nke nání gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist” (Jọn 17:3).Cross References
I Ekweghịekwe Nke Israel
1. Ọjụjụ ndị Ju jụrụ Jisọs Kraist na Ọ bụ Ọkpara Chineke na Onyenketa bụ mmezu amụma eburu na mgbe ochie, Jọn 12:37-41; Aisaia 6:9, 10;. 53:1; Jeremaia 5:2-22; Ezikiel 12:2; Matiu 13:10-17; Luk 8:10; Ọlu Ndi-ozi 28:24-27
2. Egwù mmadụ na egwù ahụhụ ọ ga-ewetara ha gbochirị ọtụtụ mmadụ ikwupụta okwukwe ha nime Kraist, Jọn 12:42; 7:13; 9:22
3. Ọtụtụ achọghị ịrapụ otuto nke mmadụ ka ha wee nweta otuto nke Chineke, Jọn 12:43; 5:44; I Samuel 2:30; Mak 8:38; Luk 12:8, 9
II Onyeozi Nke Chineke
1. Jisọs kwuru sị, “Onye kwere na Mu, ọ bugh na Mu ka o kwere, kama ọ bu n’Onye ziterem,” Jọn 12:44; Mak 9:37; I Pita 1:21
2. Jisọs kwukwara sị, “Onye nāhum nāhu kwa Onye ziterem,” Jọn 12:45; 14:9; Ndi Kọlọsi 1:15; Ndi Hibru 1:3
3. Jisọs bịara ịbụ ìhè nye ụwa, Jọn 12:46, 35, 36; 9:5, 39; Ndi Efesọs 5:14; Aisaia 9:2
III Ikpé Site N’Okwu Nke Chineke
1. Ọbịbịa nke Jisọs Kraist bụ ka O wee zọpụta ụwa, ọ bụghị ka Ọ maa ụwa ikpé, Jọn 12:47; 3:17; 5:45; 8:15, 16; 10:10; 18:37
2. A ga-eji Okwu Chineke kpee mmadụ niile ikpé dịka nrubeisi ha n’ihe niile e nyere n’iwu si dị, Jọn 12:48; Deuteronomi 18:18, 19; Mak 16:16; Luk 10:16; I Ndi Tesalọnaika 2:8
3. Jisọs ekwughị site n’Onwe-ya kama dịka ihe Nna Ya nyere Ya n’iwu, Jọn 12:48-50; 8:38-59; 14:10; 17:8, 14, 22-26
4. Iwu nke Chineke site na Kraist bụ ndụ ebighịebi, Jọn 12:50; 17:2
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEEkweghịekwe Nke Israel
Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere iheomimi nke mmebi iwu (2 Ndi Tesalọnaika 2:7) -- Ọ bụ kwa iheòmímí n’ezie. Ọ bụ ihe ijuanya mgbe anyị na-agụ banyere ọjụjụ na mkwugide nke Israel megide Jisọs Kraist na Ọ bụ onye ná-egosi na ya bụ ihe Ọ na-abụghị na Onye ná-ekwesịghị ntụkwasịobi.
Na Israel pụrụ ịjụ Kraist wee nọgide n’ekweghịekwe bụ ihe aná-apụghị ikwere, nkekanke mgbe échètara ihengosi niile Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na Ya bụ Onye ezitere site n’ebe Chineke nọ. Site n’ike O nwere ka O jiri kwue okwu banyere ihe nke Eluigwe; ma amamihe Kraist gosirị n’ebe ndịiro Ya nọ juru ha anya nke mere na ha apụghị kwa ịjụ Ya ajụjụ ọzọ (Lee Matiu 13:54; 22:46; Mak 1:22, 27; Ndi Hibru 1:2; 11:3). Jisọs ji ike dị ukwuu kwue okwu nke mere na ọbụná ndị ná-ebo Ya ebubo bụ ndị bịara ịkpụrụ Ya ka ha wee kpọgide Ya n’obe dara n’ala site náánị n’otù okwu O kwuru (Jọn 18:6).
Ihe niile a ezuworị ime ka Israel ghara inwe ngọpụ n’iru Chineke, ma Jisọs lụkwara ọtụtụ ọlụ nke ọ dịghị onye pụrụ ịlụ ya maọbụghị Chineke. Nke a mere ka Israel ghara inwe ngọpụ n’ihe niile ha hụrụ na nke ha nụrụ. Ọbụná n’etiti ihe-ebube ndịa niile emere, ha tachirị obi ibo Jisọs ebubo na Ọ bụ mmụọ ọjọọ maọbụ na Ya na ekwensu nwere mkwekọrịta (Matiu 12:22-30; Jọn 8:48-59).
Mkpughe Nke Mmehie
ké ịkpọas nke akpọrọ Jisọs na òzízí Ya niile na-egosi nkeọma ike ekwensu nwere n’obi mmadụ ndịa. Chineke lefuru anya n’oge ụfọdụ banyere amaghịihe nke mba ndị ná-amaghị Chineke, ma ugbu a bụ oge nke Chineke ime ka mmehie pụta ìhè otú o si dị, Israel ka ebukwara ụzọ jụọ ajụjụ (Lee Ọlu Ndi-ozi 17:30). Nke a bụ ihe ziriezi, n’ihi na enyewo Israel okwu niile nke Chineke, ebube ahụ, ọgbụgbandụ ahụ, inye Iwu ahụ, ijere Chineke ozi, na ịchụ àjà niile (Ndi Rom 9:4, 5; Ọlu Ndi-ozi 17:29-31).
Aisaia buru amụma na iheọmụmá banyere Kraist ga-abịa; “Ndi nējeghari n’ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n’ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha” (Aisaia 9:2). Ìhè ahụ malitere inwupụta n’usoro ọmụmụ Israel site n’Abraham onye kwesịrị ntụkwasịobi; ma ka ọtụtụ ọgbọ na-aga ka ìhè ahụ na-enwupụta ìhè karịa. Site n’ọtụtụ usoro nke ndịnchụàjà, ndịamụma, ndịikpé, ndịeze, na ndịkom na ndịnyom ná-atụ egwù Chineke, ka ekwusaara ozi nke mgbapụta na nke Eze ahụ ná-abịa nye ndị Hibru ndị kwesiri olu ike na ndị isiike. Emesịa n’ikpeazụ Ọ nọ n’etiti ha. Onye ahụ ekwusaworo na Ọ ga-abụ “Eze ndi Ju” bịakutere ndị nke aka Ya ma ndị nke aka Ya anaraghị Ya.
Jisọs kwuru banyere ndịa sị: “Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agagh-enwewori nmehie: ma ugbu a ha enwegh ihe-agugọ banyere nmehie-ha. Onye nākpọm asì nākpọ kwa Nnam asì. Ọ buru na alughm ọlu n’etiti ha nke onye ọzọ nālugh, ha agagh-enwewori nmehie: ma ugbu a ha ahuwo kpọ kwa mu na Nnam asi” (Jọn 15:22-24). Jisọs kwukwara sị: “Ma nka bu ikpe ahu, na Ìhè ahu abiawo n’uwa, ma madu huru ọchichiri n’anya kama Ìhè ahu; n’ihi na ọlu-ha jọrọ njọ” (Jọn 3:19).
Okwu Mmegide Eburu N’amụma
Aisaia, ná mkpali nke Mmụọ Chineke, lebara anya nime akụkọ ụwa n’ihe ga-eme ọtụtụ arọ tutu Mesaia ahụ abịa (Aisaia 6:9, 10). Onyeozi ahụ bụ Jọn kwupụtara ihe Aisaia kwuru: “O mewo ka anya-ha kpu ìsì, Ọ me-kwa-ra ka obi-ha me etili; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka M’ghara kwa ime ka aru di ha ike” (Jọn 12:40).
Ọ bụghị nzube Chineke ikpuchi nghọta Ụmụ Israel ka ha ghara ikwere eziokwu nke nzọpụta. Nnupuisi ha n’ọtụtụ arọ megide iwu niile nke Chineke mere ka nghọta ha banyere ihe niile nke mmụọ bụrụ ihe gbagọrọagbagọ nke mere ka ha wee ghara ịmara ezi ìhè nke Chineke nke pụtara ìhè site na Jisọs Kraist; n’ọnọdụ ya, ha rọọrọ ụgha niile nke setan, nke pụtara ìhè site ná ndị Farisii na ndị amụma ụgha. Site n’oge dị anya ka Israel geworo ntị n’ụgha niile nke ndị amụma ụgha ndị ná-agwa ha “okwu ire-utọ”; ma ugbu a ha na agọnarị Onyenwe ha na Onyenzọpụta ha. (Lee Aisaia 30:8-14). Dịka Isọ, ha na-ere ọnọdụọkpara ha n’ihi iheoriri, na dịka Judas, ha rere Onyenwe ha n’ihi urù nke ụwa.
Mkwupụta Nke Chineke
Jisọs kwupụtara na Ya bụ Ọkpara Chineke wee mee ka ndị Ju ghara inwe ike ịrụ Ya ụkà ọzọ na Ọ bụ nwa onyeọkà. “Onye kwere na Mu, ọ bugh na Mu ka o kwere, kama ọ bu n’onye ziterem.” Ikwere na Kraist bụ ikwere n’eziokwu ahụ nke Chineke Nna zitere Jisọs ka O kwupụta. Ịgọnarị Jisọs bụ ịgọnarị Chineke bụ Nna. Ndị Ju na-eme ngwa ná eji olu dị elu ná ekwupụta na Chineke bụ Nna ha, ma otù aka ahụ ka ha si ná-eme ngwa n’ịgọnarị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Otú ọ dị, Jisọs gwara ha na Ya si n’ebe Chineke nọ bịa na Ya na-ewetara ha ozi Chineke. Ọtụtụ ebe ọzọ nime Akwụkwọnsọ na-agba kwa àmà eziokwu ahụ na, “Onye huworom anya ahuwo Nnam anya” (Jọn 14:9). (Gụọ Ndị Hibru 1:3; Ndi Kọlọsi 1:15).
Okwu Ịdọakanántị
Ebe Ọ maara na ndị Ju ga-ajụ Ya, Jisọs wee dọọ ha akanántị banyere ozi O wetaara ha. N’olileanya na Ọ ga-emeri ikpuìsì na ịkpọas ha n’ebe Ọ nọ, O wee chọọ ka ha ghọta óké iheọjọọ ọ ga-abụrụ ha ma ha jụ ozi Ya, n’ihi na ozi ahụ sitere na Chineke bịara mmadụ: “Onye nājum, nke nādigh-anara kwa okwum, O nwere onye nēkpe ya ikpe: okwu nke m’kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpe n’ubọchi ikpe-azu.”
Ọ bụ unu agaghị anara Kraist, unu ndị ụwa? N’ihi nke a ọ dịghị ihe Chineke ọ bụla, maọbụ nzọpụtaYa unu ga-anata n’ihi na Jisọs sịrị, “Ọ digh onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbugh site na Mu” (Jọn 14:6). Ịjụ ozi nke Kraist, ị lelịwo kwa náánị otù ihe ahụ nke pụrụ ịzọpụta gị n’ụbọchị ikpé. Jisọs sịrị na Ya abịaghị ịma ụwa ikpé, kama ịzọpụta ya. Ọnụnọ Ya n’ụwa mere ka ụmụmmadụ mara mmehie ha, nwee kwa amamikpe n’iru Chineke, ma ọ bụụrụ Jisọs ọlụ obiụtọ ịgwá ha na site na Ya mgbaghara mmehie dị. Ọ dịghị kwa aha ọzọ nke enyeworo, maọbụ nke agaje inye, nke aga-esi na ya zọpụta mmadụ (Ọlu Ndi-ozi 4:11, 12).
Ka mmadụ dum n’ebe niile sọpụrụ Okwu Chineke; n’ihi na Akwụkwọnsọ nke ọtụtụ ji eme iheọchị, ná-ahụghị kwa urù na ya, ga-abụ ihe aga-eji kpebie ikpe n’óké ụbọchị ikpeazụ ahụ iji wee mara ma ha ga-enwe maọbụ na ha agaghị enwe òkè ná ndụ ebighịebi. Ndị nwere nrubeisi nye ihe enyere n’iwu, ka ọ ga-ewetara ndụ ebighịebi. Ma ndị ahụ lezirị anya wee lelịa eziokwu Ya ka Ọ ga-ama ikpé ịbà n’ọchịchịrị ebighịebi.
Mmehie Nke ekweghịekwe
Ahụhụ ikpeazụ nke ọjụjụ Israel jụrụ Kraist ga-ama ha ikpé, n’otù n’otù, ịbà n’ọdọ ọkụ ahụ ná-eré ebighịebi. Akụkọ mgbeochie na-agba kwa àmà banyere ahụhụ dịrị ndị Ju dịka mba nime mkpebi dị njọ ha kpebiri mgbe ha jụrụ Kraist wee tie mkpu sị “Ọbara-ya di ayi n’isi, di kwa n’isi umu-ayi” (Matiu 27:25). Akụkọ ha jupụtara ná nwụsị ọbara na óké iruuju nke obi, ha nọ kwa ná enweta ọtụtụ nsogbu n’ụdị dị icheiche ha ná-achọghị wee rue taa.
Ndị Kwereekwe Ná-átụ ụjọ
Ọ dị ụfọdụ ndị kwere n’ozi nzọpụta ahụ ma egwù banyere ihe ụmụmmadụ ga-ekwu na átụ ha, n’ihi nke a ha tụrụ egwù ikwupụta okwukwe ha nime Kraist n’ìhè. Ha hụrụ otuto nke mmadụ n’anya karịa otuto nke Chineke. Otú ọ dị, Okwu Chineke aghaghị ịdị-irè, n’ihi na anyị gụrụ banyere ụfọdụ ndị wepụtara onwe ha wee kwupụta okwukwe ha nime Kraist (Ọlu Ndi-ozi 6:7; Jọn 19:38, 39).
Ewezuga ndịa ná átụ egwù, ọ dị ndị ọzọ ndị bụ ndị mgbe ha nụrụ ozi Kraist ha adịghị etufu oge n’ikwupụta okwukwe ha na Jisọs kwuru eziokwu banyere onwe Ya. Ụfọdụ nime ndịa bụ mmadụ irinaabụọ ahụ náesoụzọ Ya, Meri, nne Jisọs, Meri Magdalini, Meri na nwanne ya nwanyị bụ Mata, Lazarọs, na ọtụtụ ndị ọzọ. Anyị maara na ọ dị narị mmadụ na iri abụọ ndị gbakọrọ nime ụlọ elu ahụ n’ụbọchị Pentikost, ndịa niile bụ ndị ji otù obi na otù olu nọkọọ. Ọ bụ ndị dị otú a ka Onyenwe anyị gwara sị, “Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru” (Jọn 12:26); ọzọ kwa, “Ya mere, onye ọ bula nke gēkwuputam n’iru madu, ya ka Mu onwem gēkwuputa kwa n’iru Nnam Nke bi n’elu-igwe. Ma onye ọ bula nke gāgọnarim n’iru madu, ya ka Mu onwem gāgọnari kwa n’iru Nnam Nke bi n’elu-igwe” (Matiu 10:32, 33).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị bụ iheọmụma mbụ ndị Ju nwere banyere Eze nke ná-abịa?
- Ònye buru amụma banyere ekweghịekwe nke ndị Ju?
- Òlee otú ndịamụma ji mara na ndị Ju ga-ajụ Jisọs mgbe Ọ bịara n’ụwa?
- Chineke Ò mere ka ụmụmmadụ kpue ìsì ka ha wee ghara ịghọta eziokwu?
- Gịnị ka aga-eji kpee mmadụ ikpé n’ụbọchị ikpe?
- Jisọs, Ọ mara ụwa ikpé site n’ọbịbịa Ya n’eluụwa? Kwue mkwagide i nwere nime Akwụkwọnsọ banyere ọzịzá gị.