Matiu 25:1-13; Abù Ọma 45:1-17

Lesson 224 - Senior

Memory Verse
“Onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 24:13).
Cross References

I Ilu Kraist Ji Kọwaa Nzukọ Ya N’Eluụwa

1. Ndị nọ n’òtù ahụ na-eche nche nke ukwuu, n’ihi ọbịbịa nke Onyenwe anyị, Matiu 25:1; 2 Ndi Kọrint 11:2

2. Omume ha n’ezie ka egosiri site ná njikere ha, Matiu 25:2-4; Abù Ọma 119:105

II Ịmaọkwà banyere Ọbịbịa nke Onye Ná-alụ Nwunye Ọhụụ

1. Ndị jikeere na ndị ná-ejikereghị na-eche n’otù mgbe, Matiu 25:5; 13:30; Abù nke Abù 5:2; Luk 19:13

2. Olu nke ná-adịghị anwụanwụ wetara ozi ahụ, “Le, onye nālu nwunye ọhu!” Matiu 25:6, 7; I Ndi Tesalọnaika 4:16

3. Ọnọdụ ịtụ egwù nke ndị ná-ejikereghị, na ojuju-afọ n’obi nke ndị jikeere ka egosịrị nime arịrịọ na ọzịzá, Matiu 25:8, 9; Jọn 11:10

4. Mgbalị nke ikpeazụ inweta ihe furuefu agaghịabụ ihe ga-eweta mmeri, Matiu 25:9, 10; 24:27

III Mbànye nke Ụmụagbọghọ Ise Nwere uche n’Ọlụlụ Di na Nwunye Ahụ

1. “Ndi edoziworo wee so ya ba … ewe mechie uzọ,” Matiu 25:10; 24:44; Nkpughe 19:7-9; Ndi Hibru 2:1-3; Abù Ọma 45:1-17

2. Ndị ná-ejikereghị, bụ ụmụagbọghọ ndị nzuzu, ka ánaekweghị ka ha bànye, Matiu 25:11, 12; Luk 13:23-30

3. Ịdọakanántị nke ikpe-azụ bụ ihe kọwara ilu a, Matiu 25:13; Mak 13:32-37; Luk 12:35-40; Nkpughe 3:11.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ilu dị icheiche

Otù onye ekwuwo na ilu bụ “akụkọ nke ihe ụwa na-akọwa ihe nke elu-igwe.” Ọtụtụ mgbe, ana-enwe otù nnukwu eziokwu nke Akwụkwọnsọ nke ná-akụzi n’ilu, ma ọ dị kwa mkpà ka anyị ná-ekwuzi eziokwu nke Chineke, ka anyị wee nata ozi nke Chineke chọrọ ka anyị nata n’ilu ahụ (2 Timọti 2:15).

Anyị nwere ike ịhụ na ilu adịghị abànyecha n’ime nkọwa ya. Anyị na-ele anya na ụdị ilu nke Baịbụl ga-egosipụta maọbụ wepụta n’òzùzù ókè ya omimi niile nke ihe ọ na-atù aka ya n’ihe nke imemmụọ. Ma n’itinye ya n’ọlụ anyị aghaghị inwe mkwagide nke ihe edere n’Akwụkwọnsọ n’onwe ya, n’ihi na “ọ digh amuma ọ bula n’ihe edeworo n’akwukwọ nsọ nke madu puru ikọ isi-ya site na nání uche nke aka-ya” (2 Pita 1:20). Ma, dịka anyị kwuworo, anyị agaghị eleanya ịchọta karị náánị otù óké ihe mmụta n’otù ilu. Mgbe ụfọdụ, anyị ga-achọta ọtụtụ ihemmụta ma eleghịanya. Otù ihe aga-ebu n’uche mgbe ọ bụla ma anyị na-atụle isiokwu nọọrọ onwe ha, akụkụ nke Akwụkwọnsọ, ilu, maọbụ ụdị dị icheiche, bụ na nkọwa ọ bula anyị nyere ihe ọ bụla nke ana-atụle ga-adaba n’ihe-niile Akwụkwọnsọ kwuru, ya na ihe niile Akwụkwọnsọ na-akụzi ga-anọ kwa n’usoro. N’ụzọ dị otú a ọ ga-edo anyị anya mgbe dum ijigidesi ike ihe bụ eziokwu nke Akwụkwọnsọ.

Nlefuruanya

Ilu a na-ewepụta otù nnukwu eziokwu nke aná-agaghị eme ka ọ dị ala maọbụ lefuru ya anya: óké ihe egwù na ihe ndapụta dị ukwuu nke dị n’ilefuru nzọpụta zuruezu nke mmadụ anya. Enwere ihe ndị ọzọ apụrụ ikuzi site n’ilu a. Ọtụtụ eziokwu ka egosipụtara nime ya. Ma otù ihe anyị aghaghị ibu n’uche bụ óké ịdọakanántị na ịdụọdụ banyere mmehie zoroezo nke nlefuanya.

Mmehie ụfọdụ n’ụdị ha, bụ mmehie zoroezo ma n’ikpeazụ ha na-ebute mbibi dị ukwuu dịka mmehie ndị akpachapụrụ anya mee. Mmehie nke nlefuanya bụ otù nime ndịa. Anyị pụrụ ịhụ site n’ilu a na ihe ụdị mmehie a na-alụpụta bụ ihe dị egwù n’ịtụle ya. Oge ịta ahụhụ n’ọkụalammụọ agaghị-adị mkpirisi n’ihi na ha bụ mmehie zoroezo n’ụdị ya. Nchụpụ ebighịebi site n’iruọma nke Chineke ahụrụ n’anya, ana-akpọ isi ala nye ná-efé kwa òfùfè n’ịkwesị ntụkwasịobi agaghị enwe ihemgbu ntà maọbụ iruuju ntà n’ihi elezighị anya wee nupụisi megide iwu niile nke Chineke.

Ọtụtụ ụzọ dị nke nlefuanya pụrụ iji bata nime anyị. Anyị pụrụ ilefuanya ịnata ihe n’ihi na anyị adịghị-achọ ihe niile ahụ Chineke chọrọ inye anyị. Ma anyị pụrụ ịnata ngọzi na onyinye àmàrà niile O kwere anyị ná mkwà, ma lefueanya ijide ha. N’ụzọ ọ bụla n’ime ihe abụọ ndịa anyị bụ ndị ikpé mara n’iru Chineke. Ụmụagbọghọ ise ndị nzuzu ahụ ka ikpé mara n’ihi mmehie abụọ ndịa nke nlefuanya. Ha lefuuruanya ịbànye n’uju nke ngọzi nke Chineke nwere inye ha, ma lefuru kwa ihe ahụ ha nataworo anya; n’ihi nke a ha wee tụfue ihe niile nke Chineke nyeworo ha. Amamikpé ha ziriezi, ma bụrụ kwa nke ikpeazụ. Ha tụfuru ha niile, n’ihi na ha rapụrụ ijé ijè n’ìhè niile nke Oziọma nke emere ka ọ pụta ìhè nye ha.

Amamihe Nke Ụmụagbọghọ Nwere Uche Ná-amaghịnwoke

Anyị gụrụ na ọ bụghị náánị n’ọwa ha ka ụmụagbọghọ ndị nwereuche tinyere mmanụ, kama ha ji kwa mmanụ n’arịa ha. Site na nke a, anyị na-ahụ na ha weere ohere ọ bụla, na mnwapụta nke dapụtaara ha mee ihe. Ihe ahụ ha natara dịrị ha óké ọnụahịa, ha achọghị kwa ịnọ ná enweghị ya.

Ụmụagbọghọ ndịa mara ihe dị ka ndị ahụ ndị ná-achọghị ịkwụsị náánị n’otù onyinye àmàrà Chineke nwere inye ha, kama ndị, mgbe ha nátasịworo ojuju nke ngọzi, ha gakwara n’iru ịnata na ijide ike ahụ nke Chineke kwuru na aga-enye “mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Ndị ná-atụ egwù Chineke maara na ọbụná ma agụọ mmadụ n’onye eziomume, dozu kwa ya nsọ, wụkwasị kwa ya ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, ọ gaghị abụ onye ná emeribiga ókè ma ọ bụghị na o jigidesiri mnwapụta ndịa ike site n’ịnọgide n’okwukwe -- ná-aga ijè nime ìhè ahụ dịka ekpughere ya nye ya. Ọbụná ma asị na mmadụ nwezuru óké onyinye àmàrà atọ ndịa dị ebube nime onwe ya, ọ pụrụ ịbụ onye furu efu rue ebighịebi site n’ilefuru óké nzọpụta a zuru òkè anya. Mmehie zoroezo nke nlefu anya pụrụ izunarị mmadụ ndụ ebighịebi na otuto ebighịebi.

Ebe ilu a niile n’otù ụzọ metụtara ndịa bụ ndị ná-eche ọbịbịa nke Onyenwe anyị, anyị pụrụ ịsị na ụmụagbọghọ ndịa ndị nwere uche nọchiri anya ezi ndị òtù nzukọ nke Kraist. Ha adịghị ka ìgwè ahụ gwaraọgwa nke ndị Israel gara aga maọbụ dịka òtù ahụ ndị ná-enweghị ike ijeru ala ahụ ekwere ha ná mkwà. Ha na-ebi ndụ dịka ihe enyefere ha n’aka n’ime Kraist si dị, ná-achọ kwa iruọma nke Chineke mgbe dum na ndụ ha. Ha elefughị nzọpụta ha anya maọbu ohere ịnata karịa ihe nke enyere ha na mbụ. Ha na-ejé ijè n’ìhè niile nke Oziọma nke egosiworo ha.

N’ịmụ ihe banyere arụ a dị omimi, nke ana-akpọ Nwunye anaalụ Ọhụụ nke Kraist nime akụkụ ọzọ nke Akwụkwọnsọ, anyị na-ahụ na ha bụ ndị ná-emeri emeri, ha ejikerewo kwa onwe ha, (Nkpughe 12:11; 19:7). Onye dere Abù Ọma kọwara ebube nke Onye ná-alụ Nwunye, na Nwunye anaalụ Ọhụụ mgbe o dere sị “Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mgbe nile ebigh-ebi: Nkpa-n’aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n’aka-eze nke ala-eze-Gi bu. Ihuwo ezi omume n’anya, we kpọ nmebi-iwu asi: N’ihi nka Chineke, bu Chineke-gi, tere gi Manu obi-utọ n’isi kari ndi-ibe-gi. … Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n’aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.” Ọ gakwara n’iru ọzọ ịkpọ òkù nke ná-erute onye ọ bula, ka ha wezuga onwe ha n’ihe niile ga-egbochi ma merụ-kwa ha site n’ikwu sị, “Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n’ala; chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi; Eze gēsi otú a chosie ima-nma-gi ike: N’ihi na ya onwe-ya bu Onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya” (Abù Ọma 45:6, 7, 9-11).

Amaghịihe Nke Ụmụagbọghọ ndị Nzuzu Ná-amaghịnwoke

Ebe óké ihemmụta nke anyị nwere n’ilu a bụ ihe egwù nke dị n’ilefuru nzọpụta anyị anya -- mmehie nke ụmụagbọghọ ndị nzuzu a mere -- akụkụ a nke iheọmùmù anyị bụ nke ga-ewere oge anyị n’ịmụ ya.

Ndịa bụ òtù ndị mmadụ ndị nwere ohere ahụ dịka ụmụagbọghọ ndị nwere uche. Dịka anyị kwuru ha natara ọtùtù nke ngọzi nke Chineke nwere inye ha. Ha niile natakwara ụfọdụ nime onyinye àmàrà ahụ dị ukwuu nke àtùmààtù nke nzọpụta. Ma Onyenwe anyị gbara àmà sị na ya amataghị ha! Ha abụghị kwa nke Ya ọzọ! Aha ha adịghị kwa ọzọ nime Akwụkwọ nke Ndụ Nwaatụrụ ahụ!

Eziokwu ahụ, na ha bụ ụmụagbọghọ ná-amaghịnwoke na-egosi na ha bụ ndị nataworo nzọpụta nke Chineke. Eziokwu ahụ, na ha nwere mmanụ n’ọtùtù nke ga-enye ha ìhè na nwa mgbe na-egosi na ha anataworị ụfọdụ nime ọtùtù nke Mmụọ Nsọ. Ma ha enweghị ike ịgan’iru rue òzùzùòkè, ka ha wee nata onyinye àmàrà niile enwere inye ha, ka ha wee jee ijè n’ìhè niile nke egosiworo ha. Eleghịanya ha chere na ha anatazuwo ihe niile, na Mmụọ Nsọ ahụ dị óké ọnụahịa. Ma nke kachasị njọ, site ná nlefuruanya ha etufuwo ihe ahụ nke ha natawororị site na Mmụọ nke Chineke.

Anyị matara na mmanụ ahụ nke ekwuru okwu ya n’ebe a na-anọchita anya Mmụọ nke Chineke. Mmanụ a na-enye anyị ìhè nke imemmụọ. Jisọs sịrị na ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii na-eje ijè n’ọchịchịrị n’ihi na ha enweghị ìhè, ya mere ha na-asụ ngọngọ ná-ada kwa. Okwu ahụ bụ oriọna nye ụkwụ anyị bụrụ kwa ìhè nye ụzọ anyị (Abù Ọma 119:105); ma ọ na-ewe karịa náánị ịgụ Baịbụl Nsọ inye anyị ìhè nke imemmụọ. Mmụọ nke Chineke aghaghị ịnọ ya inye anyị ìhè iduba anyị n’eziokwu niile; n’ihi nke a Mmụọ ahụ na Okwu ahụ na-agakọta ná-ekwekọrịta kwa (Jọn 16:13; I Jọn 5:7).

Mmụọ Nsọ na-amalite ọlụ nime anyị mgbe Ọ kpọrọ anyị ịbịaru ná nchègharị ma tụkwa anyị mmehie anyị n’iru (Jọn 6:44; 16:7-11). Ọ na-abịakute anyị ná-anọnyekwara anyị, mgbe ana-agụ anyị ná ndị eziomume; Ọ na-eme kwa nke a karịa mgbe edoro anyị nsọ. Ma Ọ na-abịakute anyị n’òzùzù ya mgbe awụrụ anyị mmiri nke Mmụọ Nsọ (Jọn 14:17, 18). Onye edoworo nsọ nwere ìhè ahụ karịa onye nwere náánị nzọpụta; ma onye emejuworo n’ike nke Mmụọ Nsọ maara ojuju nke ngọzi ahụ nke onye nwere náánị odudo nsọ ná-amaghị.

Nke a apụtaghị na enwere ịdịelu dị icheiche nke Mmụọ Nsọ. Enwere ọtùtù n’ụzọ O ji abata, n’ụzọ mmadụ ji anata Ya, ma enweghị ịdị-elu dị icheiche nime Mmụọ Nsọ ahụ n’Onwe-ya. Onye agụworo n’onye eziomume anatawo ọtùtù nke Mmụọ nke Chineke, ma o rughị ka nke onye ahụ nwere bụ onye banyeworo ná mmejupụta nke urù niile ana-enweta n’aka Chineke onye nataworo mnwapụta niile nke odudonsọ na ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ.

Ụmụagbọghọ ndị nzuzu ahụ anataworị ọtùtù nke Mmụọ Nsọ ma ha lefuuru ya anya wee kwee ka mmanụ ahụ hifusịa. Ọkụ ha anyụwo, maọbụ na ọ na anyụanyụ, nke ná-egosi na ha nwere-rị mmanụ n’ebe ahụ na mbụ. A na-adọ anyị akanántị na “ayi aghagh iñabiga nti ókè kari n’ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n’ebe ha di ma elegh anya, dika miri nēbupu ugbọ” (Ndi-Hibru 2:1). Ụmụ akwụkwọ nke asụsụ dị icheiche eji dee Baịbụl na mbụ na-agwa anyị na ezi ihe ngosi nke amaokwu a bụ ka anyị “ñabiga ntị ókè karịa n’ihe anyị nụrụ ghara kwa ikwe mgbe ọ bụla ka ha gbapụ dịka arịa na-ehi ehi.” Onyeozi ahụ na-ekwu kwa n’ebe ọzọ na “ọ buru na onye ọ bula enwegh Mọ nke Kraist, onye ahu abugh nke ya” (Ndi Rom 8:9). Ụmụagbọghọ ndị nzuzu ahụ, site ná nlefuru anya ha n’ikwere ka ihe ha natara hifusịa, etufuwo iruọma nke Onyenwe ha. Ha abụkwaghị nke Ya, n’ihi na Mmụọ Ya apụwo n’ebe ha nọ. N’ezie, nlefuruanya nke a ka ewetara site n’elezighịanya nke ha n’ịchọ na ịnata mmanụ ahụ n’arịa ha iji wee tinye n’ọwa ha. Ha rapụrụ ijé ijè n’ìhè ahụ nke egosirị ha, ma rapụ kwa ijigide ìhè ahụ nke ha nataworo. N’ebe ha nọ ọ dịghị ihe ọzọ dị ma ọ bụghị ọchịchịrị.

Itimkpu Abalị ahụ

Ndị nzuzu ahụ ka agwara ka ha gaa zụrụ mmanụ. Nke a na-egosi na ọ dị ụgwọ aga-akwụ n’ihe ndị ahụ Chineke na-enye anyị n’efu. Anyị apụghị ịzụta iruọma Chineke maọbụ ịnata ngọzi Ya niile site ná mkwesi ọ bụla nke anyị onwe-anyị. Ma ọ dị ụgwọ aga-akwụ: nnyefecha nke uche anyị, onwe anyị, na àtùmààtù anyị niile n’aka Chineke -- ijiobichụaàjà nke zuruòkè nye Ya -- ọ bụrụ na anyị ejé ijè n’ìhè niile nke Oziọma nke egosiworo anyị.

Ụmụagbọghọ iri ahụ rarụrụ ụra, ma ụra ha abụghị nke ejighị ihe nke imemmụọ kpọrọ ihe. Ọ bụ náánị na ha nọgidere n’ịlụ ọlụ dị icheiche na nime mkpà niile nke ndụ a. Ise nime ha eruwo òzùzù niile nke iruọma Chineke ma ise ndị ọzọ erughị ọnọdụ ahụ. N’ezie ha niile nọ ná-eleanya ná-echere kwa ọbịbịa nke Onyenwe ha. Ma ọ bụ ihe pụtara ìhè na ndị nzuzu ahụ ejighị obi ha niile ná-echere ihe ukwuu ahụ gaje ime. Eleghịanya ha ekwuworị okwu nke ukwuu banyere ọbịbịa nke Onyenwe anyị ma, n’ile ihe anya na-ahụ ha ejikerewo n’ihi ya, n’ihi na ọkụ na-enwu n’ọwa ha ná mmalite. Ma ha elefuworo nzọpụta ha anya site ná ejerughị ịnata ihe niile Chineke nwere inye ha, ihe nke funarịrị ha n’ihi nke a bụ ihe dị ukwuu n’ezie.

Ichá nché n’ihi ọbịbịa nke Onyenwe anyị, n’oge ụfọdụ, na-etinye egwù nime obi anyị. Anyị agaghị atù ọbịbịa Ya egwù, n’onwe ya, kama anyị ga-atù egwù ka anyị wee ghara ịbụ ndị ná-erughịeru ná ntozuòkè niile na ọnọdụ niile dị mkpà ga-eme ka anyị bụrụ ndị dị ezi njikere maka ọbịbịa Ya. Anyị ga-atụ egwù ka anyị ghara ilefuru nzọpụta anyị anya wee bụrụ ndị lara n’iyi ebighịebi n’ihi mmehie nke aghụghọ na ịda mba ahụ. N’ezie anyị aghaghị ịhụ ọbịbịa Ya n’anya, wee ná-eme kwa ihe ọ bụla dị mkpà anyị pụrụ ime iji jikere maka ya.

Ọ bụ Mmụọ nke Chineke bụ onye ná-akpọsa maka ọbịbịa nke Kraist. Ọ bụ olu nke Mmụọ Nsọ bu ụzọ kpọọ ụmụagbọghọ iri ahụ ka ha jikere ma, n’ikpeazụ, ka ha bilie jee izute Onyenwe ha. Jisọs ga-abịa dịka àmùmà, aga-enwe kwa itimkpu na óké ụda nke opi Chineke n’oge ahụ; ma nke a na mpụta ìhè Ya ga-abụ n’otù oge, ọzọ bụ ihe siriike ikwu na nke a bụ ọkpụkpọ òkù ịdọakanántị nke Mmụọ Nsọ dịka agwara ụmụagbọghọ ahụ ná-ararụụra.

Anyị ga-anụ na mgbe ná-adịghị anya olu nke onyeisi mmụọozi na óké ụda nke opi Chineke. Anyi ga-ahụ n’oge na-adịghị anya Onyenzọpụta anyị ka Ọ na-abịa ikuru Nwunye Ọhụụ Ya nke ná-echere Ya -- Nzukọ nke Kraist. Ugbu a bụ oge njikere Ya anyị anụwo kwa mkpu ịdọakanántị nke Mmụọ nke Chineke. Mmụọ Nsọ ahụ nke kwesịrị ntụkwasịobi mgbe niile na-alụọlụ Ya n’ụwa, ná-ejikere Nzukọ Kraist n’ihi ihe ahụ dị óké ebube nke gaje ime. Ka anyị “nēche nche nwe kwa anya udo … yikwasisia ihe-agha igbochi obi, bú okwukwe na ihu-n’anya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa” (I Ndi Tesalọnaika 5:6, 8). Ka anyị lezie anya ịhụ na anyị nwere mmanụ n’ọwa anyị, na n’arịa anyị, na anyị ekweghị kwa ka o hifue, site ná nlefu anya, nke ga-akpatara anyị ịla n’iyi ebighịebi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ilu?
  2. Òlee otú anyị ga-esi kọwapụta ihe edere n’Akwụkwọnsọ?
  3. Ònye bụ onye ga-eduba anyị n’eziokwu niile?
  4. Gịnị bụ okwu dị mkpà e kwuru banyere omume ụmụagbọghọ ahụ ndị maara ihe na ndịnzuzu?
  5. N’ụzọ dị añaa ka ụmụagbọghọ ndịnzuzu ahụ si wee da?
  6. Gịnị bụ ihe nlereanya enyere anyị n’omume ụmụagbọghọ ahụ nwereuche?
  7. Gụpụta ọlụ dị icheiche nke Mmụọ Nsọ na-alụ n’ụbọchị taa?
  8. Gịnị ka ọ pụtara bụ “ugwọ nke Oziọma”, ebe anyị matara na anyị apụghị ịzụta nzọpụta anyị maọbụ akụkụ ọ bụla nke iruọma Chineke?
  9. Òlee otú anyị si mara na ụmụagbọghọ ndị nzuzu ahụ enweghị ike ịzụta mmanụ ahụ ha gara ịzụta?
  10. Kwue amaokwu ikpeazụ dị n’ebe ọgụgụ nke iheọmùmù a.